1 TIMỌTI 2:3-4 |
[3] Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.[4] Nꞌihi na Chineke chọrọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha matakwa eziokwu ahụ. |
|
1 TESALỌNAIKA 5:18 |
Na-enyenụ Chineke ekele mgbe nile banyere nile, nꞌihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. |
|
1 TESALỌNAIKA 4:3 |
Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ. |
|
HIBRU 13:20-21 |
[20] Ugbu a ka Chineke ahụ na-enye udo, Chineke ahụ sitere nꞌọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ ndụ site nꞌọnwụ[21] nye unu ihe ọma nile unu chọrọ, nke ga-enyere unu aka ime uche ya. Ka Chineke mejupụta nꞌime unu ihe ndị ahụ nile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst. Ka otuto dịrị Kraịst ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. |
|
LUK 9:23 |
Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụrụ na unu achọọ isoro m, unu kwesịrị ịgụ ndụ unu dị ka ihe furu efu, buru obe unu ụbọchị nile na-eso m. |
|
JEMES 1:5 |
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta. |
|
1 PITA 2:15 |
Ọ bụ uche Chineke ka unu site nꞌihe ọma unu na-eme na ndụ unu kpuchie ọnụ ndị nzuzu, na okwu na-abaghị nꞌihe ha na-ekwu megide ozi ọma ahụ ha na-amaghị ihe ọ pụrụ imere ha, na ike dị nꞌime ya. |
|
MATIU 6:10 |
Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nꞌụwa, dị ka e si eme ya nꞌeluigwe. |
|
EFESỌS 5:15-20 |
[15] Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.[16] Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.[17] Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Chineke chọrọ ka unu mee, meekwa ya.[18] Unu aṅụbigala mmanya oke nke ga-emerụ unu. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ.[19] Gosinụ ọṅụ unu site nꞌisoro ndị enyi unu ịbụ abụ ọma, na abụ nile dị iche iche e ji eto Onyenwe anyị. Bụọnụ abụ mgbe nile na-eto Onyenwe anyị nꞌobi unu.[20] Na-enyenụ Chineke Nna ekele ụbọchị nile nꞌihi ihe nile nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. |
|
2 PITA 3:9 |
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa. |
|
1 JỌN 1:9 |
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere. |
|
1 TIMỌTI 2:4 |
Nꞌihi na Chineke chọrọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha matakwa eziokwu ahụ. |
|
HIBRU 10:36 |
Kama nweenụ ndidi ka unu meekwa uche Chineke. Nꞌụzọ dị otu a unu ga-anata ihe Chineke kwere unu nkwa. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |