A A A A A

Chineke: [Amara Chineke]


EFESỌS 2:8-9
[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke![9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.

TAITỌS 2:11
Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla chọrọ ịnara ya onyinye amara nzọpụta ebighị ebi ahụ nꞌefu.

ROM 11:6
Ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌobi ebere Chineke mgbe ahụ nzọpụta abụghị site nꞌọrụ ọma ha rụrụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌọrụ ọma ha amara Chineke agaghị abụkwa onyinye a na-anata nꞌefu.

ỌLU OZI 15:11
Ọ bụ na unu amataghị na e sitere nanị nꞌotu ụzọ ahụ zọpụta anyị nile? Ụzọ onyinye amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst!”

HIBRU 4:16
Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.

ỌLU OZI 20:32
“Ugbu a ana m etife unu nꞌaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nꞌaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu eme na inyekwa unu akụ na ụba o kwadobeere ndị ahụ ọ họpụtara ka ha dị iche nye onwe ya.

JEMES 4:6
Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.”

EFESỌS 1:7
Lee otu obi ọma Chineke siri dị ukwuu nꞌebe anyị nọ! Nꞌihi na site nꞌọnwụ Kraịst, o mere ka anyị nwere onwe anyị. Ọ bụkwa site nꞌọnwụ Kraịst ka ọ gbaghaara anyị mmehie anyị.

ROM 5:1-2
[1] Ugbu a ebe e sitere nꞌokwukwe anyị mee ka anyị na Chineke dịrị na mma, udo dị ugbu a nꞌetiti anyị na Chineke nꞌihi ihe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst meere anyị.[2] Nꞌihi na site nꞌokwukwe anyị, Kraịst akpọbatala anyị nꞌime amara nke Chineke, ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nọ nꞌọṅụ nweekwa olileanya na Chineke ga-eme ka anyị keta oke nꞌebube ya.

TAITỌS 3:7
O sitekwara nꞌobi ebere ya dị ukwuu gụọ anyị na ndị ga-eketa oke na ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye. Anyị naelekwa anya ọbịbịa oge ahụ anyị gaanata ya.

ROM 3:20-24
[20] Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a pụrụ ịgụ nꞌonye ezi omume nꞌihu Chineke maka na o debere iwu. Kama ihe iwu na-eme bụ igosi anyị na anyị bụ ndị mmehie.[21] Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a.[22] Chineke ekwuola na ya ga-anabata anyị, gụọ anyị na ndị na-emeghị mmehie, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jisọs Kraịst. Chineke na-anabatakwa ndị nile kweere na Kraịst na-ajụghị ajụjụ ma ha bụ ndị Juu ma ọ bụkwanụ ndị mba ọzọ.[23] Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.[24] Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị.

JỌN 1:17
Nꞌihi na iwu sitere nꞌaka Mosisi bịa, ma ugbu a, Jisọs Kraịst ewetarala anyị amara na eziokwu.

2 TIMỌTI 2:1
Timoti, nwa m, bụrụ onye dị ike site nꞌike na amara ahụ Kraịst Jisọs na-enye gị.

2 TIMỌTI 1:9
Ọ bụ Chineke zọpụtara anyị, kpọbata anyị nꞌọrụ ya dị nsọ. Ọ bụghị nꞌihi na anyị kwesịrị ka a kpọọ anyị, kama ọ bụ rịị nzube ya ịkpọ anyị tupuu a tọọ ntọ ala ụwa a, nꞌihi na ọ chọrọ isite nꞌihe ọ ga-emere anyị gosi anyị ịhụnanya ya na obi ọma ya, na amara ya site na Jisọs Kraịst.

2 KỌRINT 12:9
Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.

ROM 3:24
Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị.

ỌLU OZI 20:24
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọ bụla karịa na m ji ya arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọrụ izisa ozi ọma nye ndị ọzọ banyere oke ebere na ịhụnanya Chineke.

1 PITA 5:10
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.

EFESỌS 2:4-9
[4] Ma ebere Chineke bara ụba nke ukwuu! Ịhụnanya ya nꞌebe anyị nọ dịkwa ukwuu![5] Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị.[6] Dị ka o siri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, otu a ka Chineke siri kpọlitekwa anyị site na ndụ ochie anyị, mee ka anyị soro Kraịst nọkọọ nꞌeluigwe.[7] Chineke mere nke a igosi ịdị ukwuu nke amara ya nꞌọgbọ nile, na igosi obi ọma ya nꞌebe anyị nọ nꞌime Kraịst.[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke![9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.

ROM 2:8-10
[8] Ma ndị nile na-akpa iche, ndị jụkwara iso eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka Chineke ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma ya.[9] Ee, nsogbu na iru uju gaabịakwasị ha nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, bụ ndị nọgidere na mmehie.[10] Ma otuto na nsọpụrụ na udo nke si nꞌebe Chineke nọ, ga-abụ nke onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, ee, onye Juu ọ bụla na ndị mba ọzọ.

1 KỌRINT 15:10
Ma site nꞌamara Chineke, abụ m ihe m bụ taa. Chineke meere m ebere dị ukwuu, wụkwasị m amara ya. Ana m egosikwa na obi ebere Chineke nꞌebe m nọ abụghị ihe efu, nꞌihi na arụọla m ọrụ karịa ndị ozi nile. Ma nꞌezie ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ ya nꞌime m, ịgọzi m.

EFESỌS 2:5
Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị.

TAITỌS 2:11-12
[11] Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla chọrọ ịnara ya onyinye amara nzọpụta ebighị ebi ahụ nꞌefu.[12] Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile.

2 KỌRINT 12:8-9
[8] Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọọ Chineke ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.[9] Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.

JỌN 1:14
Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe.

EFESỌS 4:7
Ma Chineke enyela anyị nile nꞌotu nꞌotu onyinye dị iche iche site nꞌụlọ akụ onyinye Kraịst.

2 PITA 1:2
Ka mara na udo Chineke dịnyere unu na mmaji na mmaji, ụdị udo na amara ya na-esite na mmazu unu maara ya na-abịa.

ROM 1:7
Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya.

ROM 5:17
Ọ bụ ezie na ọnwụ malitere ịchị ụwa nꞌihi mmehie otu nwoke, ma ndị nile ga-anabatara onwe ha onyinye mgbaghara Chineke, na onyinye nke ịbụ ndị ezi omume nke ọ na-enyekwa, ga-esite nꞌihe Kraịst meere ha bụrụ ndị nwere ndụ nke ọnwụ na-agaghị eemri.

JỌN 1:16
Anyị sitere nꞌaka ya nata amara pụrụ iche, nꞌokpukpu nꞌokpukpu, amara sitere nꞌeluigwe bịa.

TAITỌS 2:11-14
[11] Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla chọrọ ịnara ya onyinye amara nzọpụta ebighị ebi ahụ nꞌefu.[12] Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile.[13] Ndụ ile anya ọbịbịa ụbọchị ahụ a gọziri agọzi, mgbe a ga-eme ka ebube Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst pụta ìhè.[14] Kraịst bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nꞌihi anyị, ịgbapụta anyị site nꞌajọ omume anyị nile. Ọ bụkwa ya sachara anyị, ime ka anyị bụrụ ndị nke aka ya, ndị dị ọcha, na ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe nile.

ROM 5:2
Nꞌihi na site nꞌokwukwe anyị, Kraịst akpọbatala anyị nꞌime amara nke Chineke, ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nọ nꞌọṅụ nweekwa olileanya na Chineke ga-eme ka anyị keta oke nꞌebube ya.

2 KỌRINT 6:1
Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ nꞌotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nꞌefu, nꞌihi na Chineke egosila unu oke obi ebere o nwere nꞌebe unu nọ.

2 TESALỌNAIKA 1:12
Mgbe ahụ, mmadụ nile ga-eto aha Onyenwe anyị mgbe ha ga-ahụ ọrụ ọ rụpụtara nꞌime unu. Nsọpụrụ dị oke elu nke unu ga-enwe ga-abụ na unu bụ ndị Chineke. Ọ bụ obi ebere Chineke anyị na obi ebere Onyenwe anyị Jisọs mere ka ihe dị otu a rute unu aka.

1 TIMỌTI 1:13-16
[13] Ọ bụ ezie na nꞌoge gara aga ekwuru m okwu ọjọọ megide Kraịst, meekwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ihere. Ma Chineke meere m ebere nꞌihi na amataghị m ihe m na-eme mgbe m na-eme ihe ndị a. Nꞌihi na amaghị Kraịst nꞌoge ahụ.[14] Ma lee ka obi ọma Onyenwe anyị si dị ukwuu, nꞌihi na o gosiri m ụzọ m ga-esi tụkwasị ya obi, na otu ịhụnanya Kraịst ga-esi jupụta m obi.[15] Okwu a bụ okwu e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-agụkwa m ka onye ọ bụla mata ya nke ọma, ma kwerekwa ya, na Kraịst Jisọs bịara nꞌụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.[16] Ma Chineke meere m ebere ime ka Kraịst Jisọs were m gosi ndị ọzọ otu o si bụrụ onye ogologo ntachi obi nꞌebe ndị ajọ omume nọ, ka m bụrụ ihe àma nye ndị ọzọ na ha onwe ha nwekwara ike inweta ndụ ebighị ebi.

ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

ROM 3:23
Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.

2 KỌRINT 9:8
Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma.

JEMES 2:8
Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu ahụ dị mkpa dị nꞌakwụkwọ nsọ nke na-asị “Hụnụ ndị agbata obi unu nꞌanya dị ka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.

1 JỌN 5:3
Gịnị bụ ịhụ Chineke nꞌanya? Ọ bụ ime ihe ahụ Chineke chọrọ ka anyị mee. Idebuzukwa iwu Chineke nile adịghị enye nsogbu.

2 PITA 3:9
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.

ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.

ROM 3:27
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst.

JEMES 2:12
Ya mere, na-ekwunụ okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nꞌiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha.

ROM 7:12
Ma nꞌezie, iwu ahụ bụ ihe dị nsọ, bụrụkwa ihe dị mma.

ROM 1:16
Nꞌihi na ihere ikwusa ozi ọma Kraịst adịghị eme m. Nꞌihi na amaara m na ọ bụ ụzọ dị ike nke Chineke kwadooro isite ịzọpụta onye ọ bụla kweere na ya. E buru ụzọ kwusaara ndị Juu ozi ọma a, ugbu a a na-akwusara ya ndị mba ọzọ.

Igbo Bible 1988
No Data