A A A A A

Chineke: [Nnwere onwe ime nhọrọ]


1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

2 PITA 3:9
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.

GALETIA 5:13
Nꞌihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu enweghị onwe unu ime ihe ọjọọ, kama Kraịst mere ka unu nwere onwe unu ime ka unu hụ ibe unu nꞌanya, na ijere ibe unu ozi.

JỌN 7:17
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie ime uche Chineke, ọ gaamata ma ozizi a ọ bụ nke m ma ọ bụkwanụ nke si nꞌebe Chineke nọ pụta.

MAK 8:34
Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ ka ha bịa nso. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ ya buru obe ya so m nꞌazụ.

NKPUGHE 3:20
“Lee, ana m eguzo ugbu a nꞌọnụ ụzọ obi gị na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m mgbe m na-akpọ oku meghepụrụ m ụzọ, aga m abata bịakwute ya, sorokwa ya nwekọọ ihe. Ya onwe ya ga-esorokwa m nwekọọ ihe.

ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

ROM 13:2
Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma.

ROM 10:9-10
[9] Ọ na-ekwu sị, ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ọ bụrụkwa na ị ga-ekwere nꞌobi gị na Chineke mere ka Jisọs Kraịst si nꞌọnwụ bile, a ga-azọpụta gị.[10] Nꞌihi na ọ bụ nanị mgbe i kweere nꞌobi gị, na mgbe i ji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ka a ga-azọpụta gị.”

GALETIA 5:16-17
[16] Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee.[17] Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.

JỌN 1:12-13
[12] Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke.[13] A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya.

Igbo Bible 1988
No Data