A A A A A

Chineke: [Onye Chineke Bụ]


KỌLỌSI 1:16
Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.

HIBRU 1:3
Jisọs Ọkpara Chineke na-enwụpụta ebube Chineke. Ihe Jisọs bụ na ihe nile o mere gosiri na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. Jisọs na-esite nꞌike aka ya na-achị eluigwe na ụwa nile. Jisọs bụkwa onye ahụ nwụrụ ka ọ sachapụ ma hichapụkwa mmehie anyị nile. Mgbe o mechara nke a, ọ nọdụrụ nꞌebe nsọpụrụ dị elu, nꞌakụkụ Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.

HIBRU 4:12
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

JỌN 1:1
Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke.

JỌN 1:14
Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

JỌN 4:24
***

1 JỌN 1:5
Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nꞌaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọ bụla adịkwaghị nꞌime ya.

1 JỌN 4:8
Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya.

1 JỌN 4:16
Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.

JỌN 17:3
Nke a bụkwa ụzọ ndụ ebighị ebi ahụ. Ka mmadụ mata na ọ bụ nanị gị bụ Chineke nꞌezie, ka ha matakwa na Jisọs Kraịst bụkwa onye ahụ i zitere nꞌụwa.

NKPUGHE 1:1
Ihe dị nꞌakwụkwọ a bụ mkpughe banyere ihe na-aga ime nꞌoge dị nꞌihu na ndụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nyere ya ike ka o site nꞌọhụ kpughee ya nye Jọn ohu ya. E sitere nꞌeluigwe zite mmụọ ozi bịara kọwaara Jọn ihe ọhụ ndị a ọ hụrụ pụtara.

NKPUGHE 22:13
Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ, Onye buru ụzọ dịrị na onye na-adịgidekwa.

ROM 5:8
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị.

NKPUGHE 1:17-18
[17] Mgbe m hụrụ ya, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya dị ka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nꞌahụ gwa m okwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile.[18] Abụ m onye ahụ nwụrụ anwụ, ma na-adị ndụ. Ugbu a ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụ m ji igodo ọkụ ala mmụọ na ọnwụ. Atụla egwu!

2 TIMỌTI 3:16-17
[16] Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma.[17] Ọ bụ ụzọ Chineke họpụtara ime ka anyị bụrụ ndị a kwadobere nke ọma nꞌụzọ nile, na ndị e mere ka ha bụrụ ndị jikeere ịrụ ọrụ ọma nye onye ọ bụla.

JỌN 10:30-33
[30] Mụ na Nna bụ otu.”[31] Mgbe ahụ ndị Juu tụtụlitere nkume ọzọ ịtụ ya.[32] Ma Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Arụrụ m ọrụ ebube dị iche iche site nꞌaka Nna m inyere ọtụtụ mmadụ aka. Ọ̀ bụ nꞌihi ọrụ ebube nke ole ka unu ji chọọ ịtụ m nkume?”[33] Ndị Juu zara ya sị, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nꞌihi ọrụ ọma ị rụrụ. Kama anyị chọrọ ịtụ gị nkume nꞌihi na gị, bụ mmadụ efu, na-eme onwe gị dị ka Chineke.”

Igbo Bible 1988
No Data