A A A A A

Chineke: [Nje Virus / Ọrịa]


NKPUGHE 6:3-8
[3] Emesịa, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke abụọ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Ngwangwa, anụrụ m ka ihe e kere eke nke abụọ tiri mkpu sị m, “Bịa”.[4] Nꞌoge a, inyinya ahụ na-acha ọbara ọbara gbapụtara. E nyere onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya mma agha dị ogologo nyekwa ya ike ime ka udo hapụ ịdịkwa nꞌụwa. E nyekwara ya ike iwebata ọchịchị nke ndị na-emegide emegie nꞌime ụwa. Mgbe ahụ ibu agha dị iche iche na igbu mmadụ jupụtara nꞌebe nile.[5] Ma mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke atọ ahụ, anụrụ m olu nke ihe e kere eke nke atọ ka ọ na-akpọ m sị, “Bịa”. Ahụrụ m inyinya dị ojii. Onye na-anọkwasị nꞌelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nꞌaka ya.[6] Mgbe ahụ otu olu dara site nꞌetiti ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ sị, “Otu ogbe achịcha ka a na-ere naịra abụọ. Ma ka onye ọ bụla hapụ imebi mmanya na mmanụ”.[7] Mgbe a nyakapụrụ akara nke anọ ahụ, anụrụ m ka ihe e kere eke nke anọ ahụ gwara m okwu sị, “Bịa”.[8] Ahụrụ m inyinya na-adịghị ezi ọcha. Aha onye na-anọkwasị ya nꞌelu bụ ọnwụ, Inyinya ọzọ nke onye ọzọ a na-akpọ ọkụ ala mmụọ nọkwasịrị na-esokwa ya nꞌazụ. E kere ụwa ụzọ anọ, nyefee ha otu ụzọ nꞌaka, ka ha jiri ọnwụ na ọrịa na anụ ọhia gbuchapụ ndị nile bi nꞌime ha.

2 KỌRINT 4:7
Ma oke akụ dị otu a, ya bụ ìhè ahụ na ike ahụ si nꞌime anyị na-achapụta ugbu a, na-acha nꞌime anụ ahụ anyị e jiri aja kpụọ, ka e mee ka ọ pụta ìhè, na ike dị ukwuu a, nke na-arụ ọrụ nꞌime anyị, abụghị nke anyị, kama ọ bụ Chineke.

JEMES 4:10
Wedanụ onwe unu ala nꞌihu Chineke ka o nwee ike ibuli unu elu.

MATIU 6:24
“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ.

FILIPAI 4:6
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.

JEMES 1:2-6
[2] Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.[3] Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.[4] Ya mere, agbalịla ịgbara nsogbu ọsọ, ma ọ bụ ịchọ ụzọ dị mfe ị ga-esi wepụ onwe gị na nsogbu ahụ. Kama nye ntachi obi gị ohere ka o too. Nꞌihi na mgbe o toro tozuo oke, ị ga-abụkwa onye pụrụ iguzo chịm, onye zuru ezu nꞌime onwe ya, nke ihe ọ bụla naagaghị akọ.[5] Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta.[6] Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị.

NKPUGHE 9:15-19
[15] A kwadebere ha ka ha jikere onwe ha nye afọ ahụ na ọnwa ahụ na ụbọchị ahụ, na oge ahụ a kara aka. A tọpụrụ ha ka ha gaa gbuo otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke mmadụ nile bi nꞌụwa.[16] Mmụọ ọjọọ ndị ahụ du ndị agha ha ọnụ ọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.[17] Nꞌime ọhụ m, ahụrụ m inyinya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nꞌelu. Ndị nọ nꞌelu inyinya ndị a yi uwe igwe e ji ekpuchi obi, nke ụfọdụ nꞌime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dị ka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dị ka anwụrụ ọkụ. Isi inyinya ha dị ka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ si ha nꞌọnụ na-apụta.[18] Ọ bụ ihe ndị a na-apụta ha nꞌọnụ ka ha ji gbuo otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke mmadụ nile bi nꞌụwa.[19] Ike e nyere ha iji gbuo ndị mmadụ adịghị nanị nꞌọnụ ha, kama ọ dịkwa nꞌọdụdụ ha. Nꞌihi na ọdụdụ ha dị ka agwọ. O nwere isi nke ha ji ata ndị mmadụ, wetara ha ọnwụ.

MAK 13:32-37
[32] “O nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ihe ndị a ga-eme, ma ọ bụ oge ha ga-emezu. Ndị mmụọ ozi amaghị, Nwa nke mmadụ amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna m maara.[33] Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọọnụ na nche ụbọchị nile. Unu arahụkwala ụra.[34] “Ọbịbịa m ka a ga-eji tụnyere otu nwoke hapụrụ ụlọ ya gaa mba ọzọ. Tupu ọ pụọ, ọ kpọrọ ndị ọrụ ya nye ha ọrụ ha ga-arụ tupuu ọ lọta. Emesịa, ọ gwara onye na-eche ụlọ ya nche ka ọ na-ele anya nlọghachi ya.[35] Ya mere, unu onwe unu kwesịrị iche nche, nꞌihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nꞌanyasị, ma ọ bụ nꞌetiti abalị, ma ọ bụ mgbe ọkụkọ kwara akwa, ma ọ bụ nꞌụtụtụ.[36] Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nꞌụra.[37] Ya mere, ihe m na-agwa unu ugbu a kọsaaranụ ya mmadụ nile nꞌebe nile. Na-elenụ anya maka nlọghachi m.”

LUK 21:5-38
[5] Ụfọdụ nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ bidoro ikwu okwu banyere ụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ. Ha nọ na-ekwu okwu banyere otu ụlọ ahụ si maa mma, na nkume ọma e ji wuo ya. Ha kwukwara okwu banyere ụdị onyinye ndị mmadụ na-eche nꞌihu Chineke nꞌime ya.[6] Ma Jisọs zara ha sị, “Oge na-abịa mgbe ihe ndị a nile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. O nweghị otu nkume dị nꞌebe a nke ga-adịkwa nꞌelu ibe ya. A ga-akwatụ ihe nile.”[7] Ndị mmadụ ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụ ihe ga-eme tupuu anyị amata na ihe ndị a na-aga ime?”[8] Jisọs zara ha sị, “Kpacharanụ anya unu, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu, ndị ga-asị na ha bụ Kraịst, onye nzọpụta ahụ. Ha ga-asịkwa na oge ahụ eruola. Ma unu esokwala ha.[9] Unu ga-anụ akụkọ agha na ọgba aghara nꞌebe nile, ma ka ụjọ ghara ịtụ unu. Nꞌihi na ihe ndị a nile ga-ebu ụzọ mezuo, ma nke a egosighị na ọgwụgwụ ihe nile abịala.[10] Otu mba ga-ebili ịlụ ọgụ megide mba ọzọ, otu alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ.[11] A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nꞌebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe ga-eweta egwu na mbara eluigwe na ihe ngosi dị egwu.[12] “Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m.[13] Ma oge a bụ oge unu ga-eji gbaa ama banyere m.[14] Kpebienụ nꞌobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.[15] Nꞌihi na aga m enye unu okwu amamihe unu ga-ekwu, ụdị amamihe na okwu nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike imegide ma ọ bụ imeri.[16] Ọ bụladị ndị mụrụ unu na ndị ikwu unu na ndị enyi unu ga-enyefe unu nꞌaka ndị ga-ekpe unu ikpe. A ga-egbukwa ụfọdụ nꞌime unu.[17] Mmadụ nile ga-akpọ unu asị nꞌihi m.[18] Ma chetanụ na otu agịrị isi dị nꞌisi unu agaghị efu.[19] Kama tachienụ obi, nwee ndidi, nꞌihi na ọ bụ otu a ka unu ga-esi zọpụta ndụ unu.[20] “Mgbe unu hụrụ ka ndị iro gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nꞌiyi eruola.[21] Nꞌoge ahụ ọ bụrụ na unu nọ na Judia, gbalaganụ gaa nꞌelu ugwu. Ọ bụrụ na unu nọ nꞌime obodo, sinụ nꞌime ya gbapụta. Onye na-anọghị nꞌime obodo, ya gbalaga ghara ịbanye nꞌime ya.[22] Nꞌihi na oge ahụ bụ oge ntaramahụhụ imezu ihe nile akwụkwọ nsọ kwuru mezuo.[23] Ebere na-emere m ụmụ nwanyị ji nwa nꞌaka nꞌụbọchị ahụ. Ebere na-emekwara m ụmụ nwanyị na-enye ụmụntakịrị ara nꞌụbọchị ndị ahụ. Ahụhụ dị ukwuu ga-adị nꞌala a, nꞌihi na Chineke ga-egosi iwe ya megide ndị Izirel.[24] A ga-eji mma agha gbuo ha, kpụrụ ụfọdụ dị ka ndị a dọtara nꞌagha gaa nꞌobodo dị iche iche nke ụwa. Ndị mba ọzọ ga-achị Jerusalem, mesoo ya mmeso dị ka ha si chọọ, tutuu ruo oge Chineke kara aka na ọchịchị ha ga-agwụ.[25] “Ihe ịrịba ama na ìhè ngosi ga-apụta ìhè nꞌanwụ na nꞌọnwa ya na kpakpando. Oke ịta ahụhụ ga-adakwasịkwa mba nile dị nꞌụwa. Ndị mmadụ ga-anọ nꞌoke mgbagwoju anya. Ụjọ ga-ejupụtakwa obi ha mgbe ọ bụla ebili mmiri nke oke osimiri mere mkpọtụ.[26] Ndị mmadụ ga-ada mba nꞌihi ụjọ nke ga-atụ ha maka ihe na-abịakwasị ụwa. Nꞌihi na a ga-eme ka ike nile jikọtara eluigwe maa jijiji.[27] Nꞌoge ahụ ndị mmadụ ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka m ji ike na ebube dị egwu na-abịa nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.[28] Mgbe ihe ndị a nile bidoro ime, guzonụ lelie anya elu nꞌihi na oge ahụ adịla nso mgbe Chineke ga-azọpụta unu.”[29] Mgbe ahụ Jisọs tụụrụ ha ilu iji kọwaa okwu ndị a ọ gwara ha. Ọ sịrị, “Leenụ anya nꞌosisi fiigi.[30] Mgbe ọ bụla osisi fiigi wepụtara ahịhịa ndụ ọhụrụ, unu onwe unu na-ahụ, matakwa na oge ọkọchị adịla nso.[31] Nꞌụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a nile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke dị nso.[32] “Nꞌezie, ọgbọ a agaghị agabiga tutuu ihe ndị a nile emezuo.[33] Eluigwe na ụwa pụrụ ịgabiga, bụrụ ihe na-agaghị adịkwa, ma okwu m ndị a agaghị agabiga.[34] “Kpacharanụ anya ka unu hapụ ibi ndụ iri oke nri na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Kpachakwaranụ anya ka ibi ndụ unu hapụ ijubiga nꞌoke echiche banyere ihe nke ụwa, nke ga-eme ka unu hapụ ịnọ na njikere mgbe m ga-abịa.[35] Nꞌihi na ọbịbịa m ga-abụ nnọọ na mberede, ọtụtụ mmadụ agakwaghị anọ na njikere mgbe m ga-abịa.[36] Ma nọọnụ na nche oge nile. Kpeerenụ Chineke ekpere ka o nye unu ike ịgbanarị ihe ndị a nile nke na-aga ime. Ka o nyekwa unu ike iguzo nꞌihu m mgbe m ga-alọghachi.”[37] Ụbọchị nile Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ na-ezi ihe, ma nꞌoge anyasị, ọ na-ahapụ Jerusalem pụọ gaa hie ụra nꞌelu ugwu olivu.[38] Nꞌisi ụtụtụ nile kwa, ndị mmadụ nile ahụ na-abịakwute ya nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, ịnụrụ okwu ya.

MATIU 24:1-35
[1] Mgbe Jisọs si nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ na-apụta, ndị na-eso ụzọ ya duruu ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ukwu ahụ.[2] Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu hụrụ ụlọ ukwu a? Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nꞌelu ibe ya.”[3] Mgbe ọ nọdụrụ ala nꞌelu ugwu olivu, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị kwa ga-abụ ihe ga-egosi anyị na oge i ji alọghachi na ọgwụgwụ ụwa eruola?”[4] Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu.[5] Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa ndị ga-asịkwa, ‘Abụ m Onye nzọpụta ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ọzọ.[6] Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nꞌihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha egosighị na oge nlọghachi m eruola.[7] Obodo ga-alụso obodo ibe ya ọgụ, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; ọke ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa nꞌọtụtụ ebe dị iche iche.[8] Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalịte ịta ahụhụ nke ga-abịa.[9] “Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m.[10] Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị.[11] Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ nꞌokwukwe ha.[12] Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu.[13] Ma ndị nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.[14] “A ga-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke nꞌebe nile ụwa sọtụrụ, nꞌụzọ onye ọ bụla ga-anụ ya. Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ oge ga-abịa nꞌikpeazụ.[15] “Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe unu na-ahụbeghị mbụ, nke e kwuru okwu ya site nꞌọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nꞌebe nsọ, (onye na-agụ tụgharịa uche ghọta ihe ọ pụtara),[16] mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia were ọsọ gbalaga nꞌelu ugwu.[17] Ka ndị nọ nꞌelu ụlọ hapụ ịrịdata ịbanye nꞌime ụlọ ha ịkwapụta ngwongwo ha, tupuu ha amalite ịgbalaga nꞌelu ugwu.[18] Ka ndị nọ nꞌubi hapụ ịlọghachi nꞌụlọ ha ịchịrị uwe ha.[19] “Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụ ara nꞌụbọchị ahụ.[20] Kpeerenụ Chineke ekpere ka unu ghara ịgba ọsọ a nꞌoge oke oyi, ma ọ bụ nꞌụbọchị izuike.[21] Nꞌihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ.[22] “Nꞌezie, ọ bụ nanị ma e mere ka ụbọchị ahụ dị mkpụmkpụ, ma ọ bụghị otu a, mmadụ nile ga-ala nꞌiyi. Ma Chineke ga-eme ka ha dịrị mkpụmkpụ nꞌihi ndị ya ọ họpụtara.[23] “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Ahụrụ m Onye nzọpụta ahụ, ọ nọ nꞌebe a, ma ọ bụ nꞌebe ọzọ’ unu ekwela.[24] Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara.[25] Chetakwanụ na agwala m unu ihe ndị a nile, tupuu ha emezuo.[26] “Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu na Onye nzọpụta abịala, na ọ nọ nꞌime ọzara, ma ọ bụ na ọ dị ebe o zoro onwe ya, unu ekwela.[27] Nꞌihi na mụ, bụ Nwa nke mmadụ, ga-abịa dị ka amụma eluigwe, nke a na-ahụ anya site nꞌọwụwa anyanwụ ruo nꞌọdịda anyanwụ.[28] Chetakwanụ na ebe ọ ụla ozu dị ebe ahụ ka udele na-ezukọta.[29] “Ngwangwa, mgbe mkpagbu nke ụbọchị ahụ nile gabigasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè na mbara eluigwe. Ndị nile nọ nꞌụwa ga-eru uju nꞌụbọchị ahụ, mgbe mba dị iche iche ga-ahụ m, ka m na-abịa nꞌike na ebube, site nꞌime igwe ojii nke eluigwe.[30] ***[31] Aga m ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke eluigwe na ụwa.[32] “Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya jupụtara nꞌahịhịa ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.[33] Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile ka ha na-eme marakwanụ na anọ m nso, na ọbịbịa m dị nnọọ nso.[34] Ihe ndị a nile aghaghị imezu tupuu ọgbọ a agabiga.[35] “Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m nile ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo Bible 1988
No Data