A A A A A

Chineke: [Chụnanya na-enweghị atụ]


1 JỌN 4:16-18
[16] Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.[17] Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya.[18] Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie.

1 PITA 4:8
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.

KỌLỌSI 3:14
Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nꞌihi na ọ bụ nke a ga-ejikọta unu nile nꞌotu.

EFESỌS 2:8
Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke!

EFESỌS 5:25
Unu bụ ndị nwoke na-alụ nwụnye, hụnụ nwụnye unu nꞌanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nꞌanya nwụọ nꞌihi ya.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

1 KỌRINT 13:7
Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.

1 KỌRINT 13:13
Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya.

1 JỌN 3:1
Lee ka Nna anyị bi nꞌeluigwe si hụ anyị nꞌanya, nꞌihi na o sitere nꞌamara ya mee ka a kpọọ anyị ụmụ ya. Nꞌezie, anyị bụkwa ụmụ Chineke. Ma ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị Chineke ha adịghị aghọta na anyị bụ ụmụ Chineke.

1 JỌN 3:16
Jisọs egosila anyị ihe bụ ịhụ mmadụ nꞌanya, nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ. Ya mere anyị kwesịkwara ịtọgbọ ndụ anyị nꞌihi ụmụnna anyị nꞌime Kraịst.

1 JỌN 4:8
Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya.

JỌN 14:21
Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.”

JỌN 15:12-13
[12] Nke a bụkwa iwu m na-enye unu: hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.[13] Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya.

LUK 6:27
“Geenụ ntị nꞌihe m chọrọ ikwu, unu nile nọ nꞌebe a ugbu a. Hụnụ ndị iro unu nꞌanya, meekwaranụ ndị na-akpọ unu asị ihe ọma.

ROM 3:23
Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.

ROM 5:5-8
[5] Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.[6] Leenụ nụ ka obi ebere Chineke siri dị ukwuu. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọ bụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Jisọs bịara nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị ndị mmehie.[7] A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nꞌihi ezi mmadụ.[8] Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị.

ROM 8:35
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!

ROM 12:9-10
[9] Egosila ndị mmadụ na ị hụrụ ha nꞌanya mgbe ị maara nꞌobi gị na ị hụghị ha nꞌanya. Ka ịhụnanya bụrụ ihe si gị nꞌobi pụta. Kpọọ ihe ọjọọ nile asị, guzosie ike ime ihe nile dị mma.[10] Hụrịtanụ onwe unu nꞌanya dị ka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụrụkwanụ ibe unu.

TAITỌS 3:4-5
[4] Ma mgbe ịhụnanya na obi ọma Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ìhè,[5] ọ zọpụtara anyị. Ma ọ zọpụtaghị anyị nꞌihi ọrụ ọma anyị rụrụ, kama ọ zọpụtara anyị nanị site nꞌobi ebere ya na ọmiko ya. Ọ sachapụrụ mmehie anyị, nyekwa anyị ọṅụ ọhụrụ nke ya na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị so.

1 JỌN 4:9-10
[9] Nꞌihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site nꞌizite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site nꞌọnwụ ọ nwụrụ.[10] Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị.

JỌN 13:34-35
[34] “Nꞌihi na m na-ahapụ unu, ana m enye unu iwu ọhụrụ. Hụritaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya.[35] Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”

1 KỌRINT 13:4-7
[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.[5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.[6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.[7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.

MATIU 5:43-48
[43] “A gwara unu sị, ‘Hụnụ ndị enyi unu nꞌanya, ma kpọọkwanụ ndị iro unu asị.’[44] Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.[45] Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke nna unu bi nꞌeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọra ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.[46] Ọ bụrụ nanị ndị hụrụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-eme otu a.[47] Ọ bụrụkwa na unu na-ekele nanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọ bụla dị iche nꞌebe unu na ndị ọzọ nọ. Nꞌihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.[48] Unu kwesịrị izu oke nꞌịrụ ọrụ ọma, dị ka Nna unu bi nꞌeluigwe si zuokwa oke.

1 KỌRINT 1:1-13
[1] Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e sitere nꞌọchịchọ Chineke kpọọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Nwanne m nwoke Sostenis sokwa m na-ede akwụkwọ a.[2] Ọ bụ unu ka m na-edetara akwụkwọ a, unu nzukọ Chineke dị na Kọrint, ndị Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke ya, ndị e mekwara ka unu site na Jisọs bụrụ ndị Chineke na-anabata. Anyị na-edekwara unu ndị Kraịst nile nọ nꞌebe nile akwụkwọ a, unu nile bụ ndị na-akpọku aha Jisọs Kraịst, dị ka Onyenwe anyị na Onyenwe unu.[3] Ka Chineke nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara na udo nke na-esi nꞌaka ya na-abịa.[4] Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m ekele Chineke ekele nꞌihi onyinye amara nile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.[5] Nꞌihi na Chineke emeela ka unu baa ụba nꞌụzọ nile, ebe ọ bụ na unu na Kraịst bụ otu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu nile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwuwapụta okwu banyere ozi ọma ya.[6] Ihe ahụ m gwara unu na mbụ emezuola! Ozi ọma Kraịst Jisọs agbaala mgbọrọgwụ nꞌime unu.[7] Nꞌihi na ugbu a, Chineke enyela unu amara ya na ngọzi ya nile. O nyekwala unu onyinye Mmụọ Nsọ nile na ike dum unu chọrọ iji mee ihe na-atọ ya ụtọ. Chineke nyere unu ihe ndị a nile ugbu a unu nọ na-ele anya ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.[8] Ọ bụkwa Chineke ga-echebe unu ruo ọgwụgwụ, meekwa ka unu bụrụ ndị a ga-agụ dị ka ndị ezi omume nꞌụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-ekpe ụwa nile ikpe.[9] Chineke nꞌonwe ya ga-emere unu nke a. Nꞌihi na ọ bụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ bụkwa Chineke kpọbatara unu nꞌọnọdụ ahụ nke unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ ugbu a na-enwe mmekọrịta.[10] Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.[11] Nꞌihi na ụmụnna m, esi m nꞌọnụ ndị si nꞌezinụlọ Kloyi bịara nꞌebe a nụrụ na esemokwu dị nꞌetiti unu.[12] Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nꞌetiti unu. Na ụfọdụ nꞌime unu na-anya isi na-agwa ibe ha sị, “Abụ m onye na-eso Pọl.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”, ndị ọzọ kwa na-asị, “Ana m eso Pita”, ma ndị ọzọ na-asị kwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso”.[13] Mgbe unu na-eme ihe ndị a, ihe pụtara ìhè bụ na unu ekewasịala Kraịst, mee ka ọ dị ọtụtụ. Ma ka m jụọ unu, Kraịst, ọ̀ dị abụọ? Ọ̀ bụ mụ onwe m bụ Pọl ka a kpọgidere nꞌobe nꞌihi unu? Ọ̀ dị onye e mere baptizim nꞌetiti unu baa nꞌaha Pọl?

Igbo Bible 1988
No Data