A A A A A

Chineke: [Oge]


2 KỌRINT 6:2
Ma geenụ ntị nꞌihe Chineke na-ekwu, “Nꞌoge a na-anara mmadụ nke ọma ka akwa unu rutere m ntị. Ọ bụkwa nꞌụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Ya mere, ugbu a bụ oge Chineke chọrọ inyere gị aka. Taa ka Chineke jikeere ịzọpụta gị.

1 JỌN 2:17
Anyị makwaara na ụwa ga-emesịa gabiga. Ihe ọjọọ ndị a nile kwa ga-eso ya laa nꞌiyi. Ma onye ọ bụla na-edebe ihe Chineke nyere nꞌiwu ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

JỌN 9:4
Chineke enyela anyị ọrụ ọ chọrọ ka anyị rụọ. O kwesịrị ka m rụọ ya ngwangwa. Nꞌihi na ọ bụ nanị nwa oge fọdụrụ tupuu o ruo anyasị. A naghị ejikwa anyasị arụ ọrụ.

ROM 13:11
Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya na-abịa nso. Ya mere, sitenụ nꞌụra bilie! Ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Nꞌezie ọ dị nso karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.

MAK 13:32-33
[32] “O nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ihe ndị a ga-eme, ma ọ bụ oge ha ga-emezu. Ndị mmụọ ozi amaghị, Nwa nke mmadụ amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna m maara.[33] Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọọnụ na nche ụbọchị nile. Unu arahụkwala ụra.

2 PITA 3:8-9
[8] Ndị m hụrụ nꞌanya, unu echefula otu okwu a, nꞌanya Chineke, ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti otu ụbọchị na puku ụbọchị. Ha bụ otu ihe nꞌanya ya.[9] Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.

KỌLỌSI 4:5-6
[5] Kpacharanụ anya otu unu si akpasị ndị na-ekweghị ekwe agwa. Ohere ọ bụla unu nwere jirinụ ya mee ka ndị ọzọ nụrụ ozi ọma a.[6] Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke na-atọ ụtọ na ntị. Mụtakwanụ otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.

EFESỌS 5:15-17
[15] Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.[16] Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.[17] Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Chineke chọrọ ka unu mee, meekwa ya.

1 TESALỌNAIKA 5:1-3
[1] Ugbu a, ụmụnna anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Echeghị m na m nwere ihe ọ bụla ikwu banyere oge ha ga-emezu.[2] Nꞌihi na dị ka unu nile maara nke ọma, ọ dịghị onye maara mgbe ha ga-emezu. Onyenwe anyị ga-abịa mgbe a na-eleghị anya ya, dị ka onye na-ezu ohi si abịa mgbe a na-eleghị anya ya.[3] Mgbe ọtụtụ mmadụ ga-asị, “Udo dị, ihe nile na-aga nke ọma,” mgbe ahụ, na mberede, ka oke ịla nꞌiyi dị egwu ga-adakwasị ha, ọ dịkwaghị otu onye ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ. Ihe mgbu ahụ ga-adị ka ihe mgbu na-adakwasị nwanyị ime na-eme.

JEMES 4:13-17
[13] Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, ma ọ bụ obodo dị otu a, ịzụ ahia na ire ahia, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”[14] Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.[15] Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị gaadị ndụ. Anyị ga-emekwa ihe dị otu a.”[16] Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi banyere ihe unu chọrọ ime. Ụdị ịnya isi a adịghị atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na ha dị njọ.[17] Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke.

Igbo Bible 1988
No Data