A A A A A

Chineke: [Trindade]


1 KỌRINT 8:6
Todavia para nós há um só Deus, o Pai, de quem é tudo e para quem nós vivemos; e um só Senhor, Jesus Cristo, pelo qual são todas as coisas, e nós por ele.

2 KỌRINT 3:17
Nꞌihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ ahụ anyị na-ekwu ihe banyere ya. Ebe ọ bụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nꞌebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.

2 KỌRINT 13:14
Ka mara naesite nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ naeweta, dịnyere unu nile. Amin.

KỌLỌSI 2:9
Nꞌihi na nꞌime Kraịst ka e nwere ụdị izu oke Chineke nke pụrụ ịpụta ìhè nꞌahụ mmadụ.

JỌN 1:14
Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe.

JỌN 10:30
Mụ na Nna bụ otu.”

LUK 1:35
Mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke ga-abịakwasị gị, ike Chineke ga-ekpuchikwa gị. Mgbe ahụ nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.

MATIU 1:23
‘Lee, nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. A ga-akpọ aha ya Ịmanụelụ, nke bụ ma asụgharịa ya, Chineke nọnyeere anyị.’ ”

MATIU 28:19
Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.

MATIU 3:16-17
[16] Mgbe Jisọs sitere na mmiri ahụ pụta, lee, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ Chineke ka o si nꞌelu fedata dị ka nduru bekwasị Jisọs nꞌisi.[17] Nꞌotu oge ahụ kwa, olu sitere nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, nke m hụrụ nꞌanya. Ihe ya dị m ezi mma.”

ROM 14:17-18
[17] Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.[18] Nꞌihi na ọ bụrụ na i nye Kraịst ohere ka ọ bụrụ onye ga-ekpebi ụdị omume ị ga-eme, obi ga-atọ Chineke ụtọ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ya nꞌime gị.

LUK 3:21-22
[21] Otu ụbọchị Jisọs sooro igwe mmadụ bịa ka Jọn mee ya baptizim. Mgbe Jọn mesịrị ndị mmadụ baptizim, o mekwara Jisọs baptizim. Ma mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, oge e mesịrị ya baptizim, eluigwe meghere.[22] Mmụọ Nsọ sikwa nꞌelu rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ olu sitere nꞌelu daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-atọ m ụtọ.”

JỌN 5:7-8
[7] Onye ọrịa ahụ zara sị, “Ahụ enweghị ike ịdị m mma, nꞌihi na mgbe ọ bụla mmiri a mere mkpatọ enweghị m onye ọ bụla ga-ekuba m nꞌime ya. Ọ bụrụ na m achọọ ịbanye, onye ọzọ ga-esi nꞌazụ m kwatuo m, buru m ụzọ banye.”[8] Jisọs gwara ya okwu sị, “Nwoke, bilie, chilie ute gị laa!”

1 PITA 1:1-2
[1] Ọ bụ mụ onwe m Pita, onyeozi Jisọs Kraịst na-edegara ndị nile Chineke họpụtara akwụkwọ a, ndị ahụ nile si Jerusalem gbara ọsọ ndụ gaa biri nꞌobodo nile nke Pọntus, Galetia, Kapadosia, Esia na Bitinia.[2] Ndị enyi m, nꞌoge gara aga, Chineke onye bụ Nna họpụtara unu dị ka nzube ya si dị. Ọ makwaara na unu ga-emesị bụrụ ụmụ ya. Mmụọ Nsọ ya emeekwala ka unu bụrụ ndị dị nsọ, ndị a sachara nꞌọbara Jisọs Kraịst, na ndị na-erubere ya isi. Ka amara na udo dịrị unu.

2 KỌRINT 1:21-22
[21] Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nꞌime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e doro iche nye ya.[22] Chineke akakwasịla anyị akara ya igosi na anyị bụ ndị nke ya. O nyekwala anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌime obi anyị dị ka ihe akaebe na anyị ga-anata ihe nile o zubere inye anyị.

1 KỌRINT 12:4-6
[4] Ọ bụ ezie na onyinye Mmụọ Nsọ Chineke dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha.[5] Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe.[6] E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile.

EFESỌS 4:4-6
[4] Ọ bụ nanị otu anụ ahụ Kraịst dị, otu Mmụọ Nsọ dịkwa. Anyị nwekwara nanị otu olileanya nke Chineke debere nꞌihu anyị.[5] Ọ bụ nanị otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.[6] Ọ bụkwa nanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe nile na onye na-achị ihe nile, na onye na-arụ ọrụ ya nꞌime ihe nile, na-ebikwa nꞌime ihe nile.

KỌLỌSI 1:15-17
[15] Kraịst bụ nnọọ oyiyi Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ nọ na-adị ndụ tupuu Chineke ekee ihe ọ bụla e kere eke.[16] Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.[17] Kraịst nọ anọ tupuu e kee ihe nile, ọ bụkwa ike aka ya ka o ji ejikọta ihe nile, mee ka ha dịrị ebe ha dị.

JỌN 14:9-11
[9] Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’[10] Ọ bụ na i kweghị na m nọ nꞌime Nna m, na Nna m nọkwa nꞌime m? Okwu nile m na-ekwu esitekwaghị nꞌebe m nọ pụta. Ha bụ okwu nke Nna m. Nna m bi nꞌime m na-arụkwa ọrụ ya nꞌọnwe ya.[11] Kwere ihe m gwara gị. Ebi m nꞌime Nna m, Nna m bikwa nꞌime m. Ọ bụrụ na i kwereghị okwu ọnụ m, kwere nꞌihi ọrụ ndị a nile m na-arụ.

FILIPAI 2:5-8
[5] Ka omume unu nile dịrị ka nke Jisọs Kraịst.[6] Onye, ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke, ma ọ gụghị ike ya na ọdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike.[7] Kama, o wedara onwe ya ala bịa nꞌụwa dị ka ohu, na onye na-adịghị ike. O kwenyere ka a mụọ ya dị ka e si mụọ mmadụ nile bi nꞌụwa.[8] Ebe ọ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, o wedakwara onwe ya ala, rube isi họrọ ịnwụ ọnwụ jọkarịsịrị njọ, ọnwụ ihere, nke ịbụ onye a kpọgidere nꞌelu obe.

JỌN 10:30-36
[30] Mụ na Nna bụ otu.”[31] Mgbe ahụ ndị Juu tụtụlitere nkume ọzọ ịtụ ya.[32] Ma Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Arụrụ m ọrụ ebube dị iche iche site nꞌaka Nna m inyere ọtụtụ mmadụ aka. Ọ̀ bụ nꞌihi ọrụ ebube nke ole ka unu ji chọọ ịtụ m nkume?”[33] Ndị Juu zara ya sị, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nꞌihi ọrụ ọma ị rụrụ. Kama anyị chọrọ ịtụ gị nkume nꞌihi na gị, bụ mmadụ efu, na-eme onwe gị dị ka Chineke.”[34] Jisọs sịrị ha, “Ọ̀ bụ na edeghị ya nꞌakwụkwọ iwu unu na a kpọrọ ndị mmadụ chi?[35] Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị natara ozi Chineke chi, ma apụkwaghị iwezuga akwụkwọ nsọ,[36] unu si aṅaa agwa m, mụ, onye Chineke doro nsọ zite nꞌụwa, na m adịghị asọpụrụ Chineke nꞌokwu m nꞌihi na m kwuru na abụ m Ọkpwara Chineke?

Igbo Bible 1988
No Data