A A A A A

Chineke: [Na-azọpụta]


ỌLU OZI 16:31
Ha sịrị ya, “Kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinụlọ gị nile.”

EFESỌS 2:8-9
[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke![9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.

ROM 10:9-10
[9] Ọ na-ekwu sị, ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ọ bụrụkwa na ị ga-ekwere nꞌobi gị na Chineke mere ka Jisọs Kraịst si nꞌọnwụ bile, a ga-azọpụta gị.[10] Nꞌihi na ọ bụ nanị mgbe i kweere nꞌobi gị, na mgbe i ji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ka a ga-azọpụta gị.”

MAK 16:16
Ndị kweere na ndị e mere baptizim ka a ga-azọpụta. Ma ndị jụrụ ikwere ka ọmụma ikpe dịrị.

EFESỌS 2:8-10
[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke![9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.[10] Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile.

ROM 10:13
Ya mere, onye ọ bụla na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta.

MATIU 10:22
Ụmụ mmadụ ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ma ndị nile ga-anọgide nꞌokwukwe ha ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.

ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

MATIU 25:31-46
[31] “Mgbe mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube m, mụ na ndị mmụọ ozi nile dị nsọ, mgbe ahụ ka m ga-anọ nꞌelu ocheeze ebube m.[32] Mba nile nke ụwa ga-ezukọtakwa nꞌihu m. M ga-ekewapụta ha, otu obodo site nꞌibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta ụmụ atụrụ site nꞌụmụ ewu.[33] M ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nꞌakụkụ aka nri m, ma ụmụ ewu ga-anọ nꞌaka ekpe m.[34] “Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.[35] Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.[36] ***[37] “Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?[38] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe?[39] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’[40] “Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.[41] “Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.[42] Nꞌihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọ bụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.[43] Mgbe m nọ dị ka ọbịa unu akpọbataghi m nꞌulo unu, mgbe m na-agba ọtọ unu enyeghị m uwe ka m kpuchie ọtọ m. Mgbe ahụ na-esighị m ike unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.[44] “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ oge ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ oge ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ oge ị nọ nꞌọrịa, ma ọ bụ ị nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’[45] “M ga-aza ha sị, eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nꞌime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ inyere aka.[46] “Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

MATIU 7:21-23
[21] “Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.[22] Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’[23] Ma aga m asị ha, sitenụ nꞌihu m pụọ, amaghị m unu, nꞌihi na ọrụ unu dị njọ.

JỌN 3:3
Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”

ROM 3:23
Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.

JEMES 2:24
O weela anya ugbu a na ọ bụghị nanị na mmadụ kweere na Chineke ka e ji agụ ya nꞌonye ezi omume, kama ọ bụkwa nꞌihi na ndụ onye ahụ na omume ya, na-egosi na ọ na-erubere Chineke isi.

ỌLU OZI 22:16
Site ugbu a, atụfukwala mgbe. Gaa ka e mee gị baptizim ka a sachaakwa gị site na mmehie ka ị kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.’

ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

2 KỌRINT 5:17
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.

GALETIA 3:27
Anyị nile kwa, ndị e sitere na baptizim e mere anyị, mee ka e jikọta anyị na Kraịst nꞌotu, abụrụla ndị e ji ọdịdị Kraịst kpuchie.

LUK 10:25-28
[25] Otu ụbọchị otu onye ozizi iwu bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị ya: “Onye ozizi, gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ iketa eluigwe?”[26] Jisọs zara ya sị, “Gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru banyere ajụjụ a? Gịnị ka ị gụtara?”[27] Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.”[28] Jisọs zara ya sị, “Ị zara nke ọma. Ugbu a, laa, gaa mee nke a: ị ga-enwekwa ogologo ndụ.”

JỌN 3:16-18
[16] Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.[17] Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.[18] “Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke.

EFESỌS 2:10
Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile.

1 KỌRINT 12:13
Onye ọ bụla nꞌime anyị bụ otu akụkụ anụ ahụ Jisọs Kraịst. Ụfọdụ nꞌime anyị bụ ndị Juu, ụfọdụ abụghị ndị Juu, ụfọdụ bụ ndị nwe onwe ha, ndị ọzọ bụ ndị ohu. Ma ọ bụ otu Mmụọ ahụ mere anyị nile baptizim baa nꞌime otu ahụ Kraịst ahụ. Chineke enyekwala anyị nile nꞌotu nꞌotu Mmụọ Nsọ ahụ.

2 PITA 3:9
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.

ỌLU OZI 17:30
Ma Chineke lefuru enweghị ngbọta mmadụ anya banyere ihe ndị a nile nꞌoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka onye ọ bụla site nꞌikpere arụsị wezuga onwe ya. Ọ chọkwara ka mmadụ nile fee ya ofufe.

JEMES 2:18
Mmadụ pụrụ ịgwa m sị, “I nwere okwukwe ma e nwere m ọrụ ọma.” Ma ihe m ga-asa onye ahụ bụ nke a, “Zi m otu i siri nwee okwukwe nꞌime Chineke mgbe ị na-arụghị ọrụ ọma ọ bụla iji gosi ya, ma mụ onwe m ga-egosikwa gị na m bụ onye nwere okwukwe nꞌime Chineke site nꞌọrụ ọma m naarụ.”

JỌN 8:24
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji gwa unu na unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na abụ m Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke, unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu.”

LUK 13:3
Ka m gwa unu eziokwu, ọ bụrụ na unu onwe unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke, unu ga-esikwa otu a laa nꞌiyi.

JEMES 2:14-17
[14] Olee utu ọ bara ụmụnna m, na mmadụ kpọrọ onwe ya onye nwere okwukwe nꞌime Chineke, ma ọ bụrụ na ndụ ya na omume ya adakọtaghị nꞌihe ọ na-akpọ onwe ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ̀ pụrụ ime ka Chineke nabata ya?[15] Ọ bụrụ na i nwere enyi nke bịakwutere gị, nke mkpa nri na uwe ọ ga-eyi na-akpa,[16] ma ị sị enyi gị ahụ, “Laa nꞌudo nwanna m, Chineke gọzie gị. Ya nyekwa gị uwe ị ga-eji chụọ oyi, na nri ị ga-eji zụọ afọ gị,” ma ọ dịghị ihe ọ bụla i mere iji nyere ya aka igbo mkpa agụụ na-agụ ya na oyi na-atụ ya, ọ̀ dị ụzọ okwu ọma nile i kwuru siri nyere ya aka?[17] Nꞌụzọ dị otu a, okwukwe gị nꞌime Chineke abaghị uru, ma ọ bụrụ na ndụ gị na omume gị egosighị ihe ndị a nile.

JỌN 6:47
“Nꞌezie asị m unu, onye ọ bụla kweere na m nwere ndụ ebighị ebi.

JỌN 11:25-26
[25] Ma Jisọs gwara ya sị, “Mụ onwe m bụ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa m na-enye ha ndụ ọzọ. Onye ọ bụla kweere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.[26] Ọ dịkwaghị onye dị ndụ nke nwere okwukwe nꞌime m, ga-anwụ anwụ. Mata, ị kweere nke a?”

HIBRU 6:4-6
[4] Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ.[5] Ma ọ bụrụ na ha anụrụla ụtọ nke okwu Chineke, na ebube ọ dị bụ ike nke ụwa gaje ịbịa.[6] Ọ bụrụ na ndị dị otu a ajụ Chineke, ọ rara ahụ imekwa ka ha chegharịa. Ọ pụghị ime! Ihe ha mere mgbe ha jụrụ Chineke, bụ ịkpọgide Ọkpara Chineke nꞌobe ọzọ, na imekwa ya ihe ihere nꞌihu ọha.

1 JỌN 5:13
Ana m edere unu akwụkwọ a unu ndị kweere nꞌỌkpara Chineke ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi.

JỌN 3:17
Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.

JỌN 14:6
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

2 TIMỌTI 2:10
Ma ejikeere m ịnọ na-ahụ ahụhụ ma ọ bụrụ na nke a pụrụ ime ka ndị nile Chineke họpụtara bụrụ ndị a ga-azọpụta, na ndị gaenwe ebube ebighị ebi ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs.

ROM 8:29-30
[29] Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna.[30] Ọ bụkwa ndị ahụ nile Chineke họpụtara, ka ọ kpọrọ ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, Chineke mere ka ha bụrụ ndị ya na ha dị na mma. Ọ gụrụ ha dị ka ndị na-emeghị mmehie ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ ndị gaeketa oke nꞌebube ahụ o kwere na nkwa.

MATIU 3:11
Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.

Igbo Bible 1988
No Data