A A A A A

Chineke: [Atụmatụ]


LUK 14:28
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ iwu ụlọ, ọ̀ gaghị eburu ụzọ nọdụ ala gukọọ ihe ọ ga-efu ya iwu ụlọ ahụ? Ọ̀ gaghị agụkọkwa ego o nwere nꞌaka ya mata ma ọ ga-ezuru ya iwu ụlọ ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị ezuru ya?

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

FILIPAI 1:6
Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.

JỌN 6:44
***

JỌN 1:12-13
[12] Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke.[13] A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya.

NKPUGHE 17:8
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ nwere mgbe o ji dị ndụ ma ugbu a ọ dịkwaghị ndụ. Ma ọ ga-emesịa site nꞌolulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta. Ma ọbịbịa ya ga-ewetara ya nanị ịla nꞌiyi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌime akwụkwọ ndụ ahụ na-adị tupuu e kee ụwa anya.

JEMES 4:1-17
[1] Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nꞌetiti unu? Ọ̀ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nꞌime onwe unu?[2] Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a.[3] Ọ bụladị mgbe unu rịọrọ Chineke, ọ dịghị enye unu ihe unu rịọrọ ya nꞌihi na ihe unu chọrọ iji ihe ndị ahụ mee abụghị ezi ihe. Ọ bụ iji ha mee nanị ihe ga-atọ obi unu ụtọ.[4] Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi! Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Ọ bụrụ na uche unu bụ inwe aṅụrị nꞌihe nke ụwa, unu apụghị ịbụ enyi Chineke.[5] Gịnị ka unu na-eche na akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe e dere nꞌime ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime anyị na-eche anyị nche ka anyị hapụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nꞌebe Chineke nọ?”[6] Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.”[7] Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ.[8] Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ.[9] Ruonụ uju, tienụ aka nꞌobi nꞌọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru uju werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ ọ bụla dị nꞌime unu.[10] Wedanụ onwe unu ala nꞌihu Chineke ka o nwee ike ibuli unu elu.[11] Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nꞌihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, ma ọ bụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu Chineke. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe.[12] Ọ bụ nanị otu onye dị nke na-enye ndị mmadụ iwu. Ọ bụkwa nanị otu onye ikpe dị, Chineke nꞌonwe ya. Ọ bụ nanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọ bụla nꞌiyi. Ma gị, nwanna m, ònye ka ị na-eche na ị bụ i ji na-ekpe nwanna gị ikpe?[13] Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, ma ọ bụ obodo dị otu a, ịzụ ahia na ire ahia, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.”[14] Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.[15] Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị gaadị ndụ. Anyị ga-emekwa ihe dị otu a.”[16] Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi banyere ihe unu chọrọ ime. Ụdị ịnya isi a adịghị atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na ha dị njọ.[17] Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke.

2 PITA 3:9
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.

1 TIMỌTI 2:4
Nꞌihi na Chineke chọrọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha matakwa eziokwu ahụ.

MATIU 28:18-20
[18] Jisọs bịara ha nso, gwa ha okwu sị, “E werela ike nile dị nꞌeluigwe na nꞌelu ụwa nye m.[19] Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.[20] Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ ụwa.”

EFESỌS 1:4
Nꞌihi na leenụ ihe Chineke meere anyị! Tupu o kee ụwa, ọ họpụtara anyị ịbụ ndị nke ya nꞌihi na ọ maara ihe Kraịst ga-emere anyị. Ọ họpụtara anyị ka o nwee ike mee anyị ndị dị nsọ na ndị na-agaghị enwe ịta ụta nꞌihu ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya.

HIBRU 4:3
Ma ọ bụ nanị anyị onwe anyị ndị kwere ga-aba nꞌebe izuike Chineke. Ma banyere ndị na-ekweghị ekwe ka Chineke sịrị “Dị ka m ṅụrụ iyi nꞌiwe m, ha agaghị aba nꞌebe izuike m ma ọlị.” Ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke kwuru okwu a, ma malite na mgbe ụwa bidoro, Chineke ejikerelarị na-eche ha.

ROM 3:10-18
[10] Akwụkwọ nsọ ekwuola ya sị, “Ọ dịghị onye ọ bụla dị mma nꞌụwa. Ọ dịghị onye ọ bụla, ọ bụladị otu onye nꞌụwa bụ onye ezi omume.[11] “Ọ dịghị onye ọ bụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ agụụ igbaso Chineke.[12] “Mmadụ nile esila nꞌebe Chineke nọ kpafuo. Ha nile emehiela. Ọ dịghị onye na-eme ihe dị mma, ọ bụladị otu onye.[13] “Okwu na-esi ha nꞌọnụ apụta bụ okwu rere ure, nke na-esi isi dị ka isi na-esite nꞌili ghe oghe na-apụta. Ire ha jupụtakwara nꞌokwu ụgha. Okwu ọjọọ ha na-ekwu nwere ike igbu mmadụ. Ọ dị ka elo si nꞌọnụ ajụala apụta.[14] “Nanị okwu ilu jupụtara ha nꞌọnụ.[15] “Ihe ha na-eme ọsịịsọ bụ igbu ọchụ na imerụ mmadụ ahụ.[16] Ebe ọ bụla ha gara, ha na-eweta mbibi na nsogbu nye ndị ahụ.[17] Ha amaghị ihe a na-akpọ udo.[18] “Ha amụtabeghị ihe ịtụ Chineke egwu bụ.”

ROM 9:22-24
[22] Nꞌụzọ dị otu a, Chineke emeghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na o kpebiri igosi ike ya na iwe ya site nꞌịla ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ nꞌiyi, ebe ha na-adịghị eche uche banyere ndidi na ntachi obi Chineke ji anagide ajọ omume ha.[23] Chineke na-emekwa ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na o kpebie iji ndị dị ka anyị, o mere ka anyị jupụta nꞌebube ya, mee ihe nlere anya nye ndị ọzọ, ma anyị bụ ndị Juu, ma ọ bụ ndị mba ọzọ, igosi ha otu o si emere anyị ebere.[24] ***

1 PITA 2:9-10
[9] Ma unu abụghị ndị ahụ ga-ada ada. Kama unu bụ agbụrụ Chineke ji aka ya họpụta. Unu bụ ndị nchụaja onye eze ahụ. Unu bụ ndị dị nsọ, ndị nke Chineke nꞌonwe ya. Unu bụ ndị a họpụtara ka ha kwusaa ọrụ ebube Chineke, onye ahụ si nꞌọchịchịrị kpọbata unu nꞌime ìhè ya.[10] Nꞌoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mgbe ochie, unu amaghị ihe ọ bụla banyere obi ebere Chineke, ma ugbu a obi ebere ya erutela unu aka.

ROM 8:18-25
[18] Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị.[19] Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya.[20] Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na,[21] otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha.[22] Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ.[23] Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.[24] A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a.[25] Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data