A A A A A

Chineke: [Onyinye]


2 KỌRINT 9:7
Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya.

ỌLU OZI 20:35
Nꞌoge ọ bụla, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka. Nꞌihi na echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị, ‘Ọ̀ dị mma inye enye karịa ịnara anara.’ ”

HIBRU 13:15-16
[15] Site nꞌinye aka Jisọs, anyị ga-anọgide na-achụrụ Chineke aja otuto. Anyị ga-eto ya site nꞌịgwa ndị ọzọ ihe banyere ebube aha ya.[16] Unu echefula iyikwasị onwe unu ịma mma dị ka uwe. Meekwanụ ka ndị nile chọrọ inye aka unu soro unu nwekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.

LUK 6:38
Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.”

LUK 16:10
Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu.

MATIU 23:23
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa.

ROM 12:1
Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.

LUK 12:33-34
[33] Reenụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Nke a ga-eme ka akpa unu, nke dị nꞌelu, ju eju. Akpa ahụ dị nꞌelu epughị epu. Akụ unu dị nꞌeluigwe enwekwaghị ike ifu efu. Onye ohi ọ bụla enwekwaghị ike ịga nꞌebe ahụ zuo ha, nla apụkwaghị iricha ha[34] nꞌihi na ọ bụ ebe ọ bụla ego unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

MATIU 6:19-21
[19] “Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha.[20] Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.[21] ***

MATIU 6:31-33
[31] “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?[32] Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.[33] Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.

MAK 12:41-44
[41] Emesịa, Jisọs gara nọdụ ala nꞌebe ọ ga-anọ na-ahụ ndị mmadụ mgbe ha na-etinye onyinye ha nꞌime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara tụnye ego buru ibu.[42] Ma otu nwanyị batara. Ọ bụ ogbenye, bụrụkwa onye di ya nwụrụ. Ọ tụnyere mkpụrụ ego ọla abụọ ntakịrị nke ruru otu kobo.[43] Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nwanyị ahụ atụnyela ego dị ukwuu karịa ndị nile tụnyere ego nꞌime igbe onyinye a.[44] Nꞌihi na ndị ọzọ sitere nꞌịba ụba nke ego ha nwere tụnye, ma nwanyị a tụnyere ego nile o nwere nꞌụlọ ya.”

LUK 21:1-4
[1] Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ dị na Jerusalem, o lere anya hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nꞌigbe onyinye.[2] Ọ hụkwara otu nwanyị onye ogbenye di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara nꞌebe ahụ tụnye nanị afụ abụọ.[3] Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nꞌezie, ego nwanyị ogbenye a tinyere karịrị nke ndị ọzọ nile tinyere.[4] Nꞌihi na ọtụtụ ndị ọzọ sitere nꞌego mapụtaara ha nye onyinye ha, ma nwanyị ogbenye a sitere nꞌọnọdụ ogbenye ya tinye ego nile o nwere.”

Igbo Bible 1988
No Data