A A A A A

Chineke: [Aha Chineke]


JỌN 1:1
Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke.

JỌN 14:6
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

MATIU 6:9
“Sinụ otu a kpee ekpere: Nna anyị nke bi nꞌeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.

MATIU 28:19
Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.

ỌLU OZI 4:12
O nweghị onye ọzọ pụrụ ịzọpụta anyị. Chineke ahọpụtakwaghị aha ọzọ nꞌụwa nile nye ụmụ mmadụ, nke a ga-esite na ya zọpụta anyị.”

NKPUGHE 1:8
Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Ihe ndị a ka Chineke kwuru, onye bụ Onyenwe anyị, na onye nwezuru ike nile. Onye dị ugbu a, na onye dịrị site na mmalite, na onye gaje ịbịa ọzọ.

ROM 8:15
Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị.

FILIPAI 2:10-11
[10] Ka e site nꞌịkwanyere ya ugwu, mee ka ndị nile bi nꞌụwa, na ndị bi nꞌeluigwe, na ndị bi nꞌokpuru ụwa, gbuo ikpere ha nꞌala, ịsọpụrụ Jisọs mgbe ọ bụla a kpọrọ aha ya.[11] Ọzọ kwa, ka ire nile kwupụta na Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e si otu a nye Chineke bụ Nna otuto.

Igbo Bible 1988
No Data