A A A A A

Chineke: [Ọrụ ebube]


ỌLU OZI 3:16
Ọ bụ okwukwe nwoke a nwere nꞌaha Jisọs ka e ji mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Unu nile na-ahụ ya. Unu makwaara ya. Ee! Okwukwe ya mere ka ahụ dị ya mma, dị ka unu ji anya unu na-ahụ!

JỌN 2:11
Nke a bụ ọrụ ịtụnanya mbụ Jisọs rụrụ nꞌobodo Kena dị nꞌime Galili. Site nꞌihe ịtụnanya a, Jisọs zipụtara ike ya. Ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.

LUK 18:27
Ma Jisọs zara ha sị, “Chineke nwere ike ike ihe nile. O nwere ike ime ihe ndị ahụ mmadụ efu na-enweghị ike ime.”

MAK 9:23
Jisọs jụrụ nna nwanta ahụ sị, “Gịnị mere i ji na-asị Ọ̀ bụrụ na i nwere ike? Ọ dịghị ihe onye ọ bụla nwere okwukwe na-agaghị enweta.”

MATIU 17:20
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nꞌihi na okwukwe unu nwere ehighị nne. Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke dịkarịsịrị nta, nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike nye ugwu a iwu sị ya, ‘Site nꞌebe a wezụga onwe gị,’ ọ ga-apụkwa.

MATIU 19:26
Jisọs legidere ha anya sị ha, “E jiri anya mmadụ lee ya ọ bụ ihe siri ike. Ma nꞌebe Chineke nọ ọ dịghị ihe rara ya ahụ ime.”

MATIU 21:21
Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ka m na-ekwu, mgbe m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, unu ga-eme ihe karịrị nke a. Unu pụrụ inye ugwu olivu a iwu sị ya, ‘Si nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa danye nꞌoke osimiri,’ ọ ga-emezukwa.

ROM 15:18-19
[18] Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu otu Kraịst si jiri ndị ọzọ rụọ ọrụ ya. Ma nꞌihe banyere mụ onwe m, amaara m na Kraịst esitela nꞌokwu ọnụ m, na ihe ndị ọzọ m mere mee ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke, ka ha bụrụ ndị na-erubere ya isi.[19] Emeela m ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke site na nkwusa m, site nꞌụdị ndụ m biri nꞌetiti ha, na sitekwa nꞌọrụ ịrịba ama nile m rụrụ nke ha hụrụ, bụ ọrụ m rụrụ site nꞌike Mmụọ Nsọ Chineke. Nꞌụzọ dị otu a emezuola m ihe Chineke chọrọ ka m mee, site nꞌikwusa ozi ọma Kraịst site na Jerusalem ruo nꞌobodo Ilirikum.

ỌLU OZI 19:11-12
[11] Onyenwe anyị tụkwasịrị Pọl ike, ime ihe ịrịba ama dị iche iche.[12] Ihe ịrịba ama o mere dị ukwuu. Nke ka nke, a na-ewere ụfọdụ nꞌime akịsị ma ọ bụ ịchafo ọ na-eji ehicha ihu na-atụkwasị nꞌahụ ndị ọrịa, ka ahụ dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.

EFESỌS 3:20-21
[20] Ugbu a, ka otuto dịrị Chineke onye nwere ike imere anyị karịa ka anyị pụrụ ịrịọ ya, ma ọ bụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nꞌuche anyị, site nꞌike ya na-arụ ọrụ nꞌime anyị. Ka otuto dịrị ya nꞌime nzukọ ya bụ chọọchị na nꞌime Kraịst mgbe nile, na site mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi! Amin.[21] Ya mere, mụ onwe m bụ Pọl onye nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi na m na-ejere Onyenwe anyị ozi, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesịrị ọkpụkpọ Chineke kpọrọ unu ịnata ngọzi ndị a nile dị ebube.

ỌLU OZI 4:29-31
[29] Ugbu a Onyenwe anyị, lee ịba mba ha nile. Nyere ndị ozi gị aka ikwusa okwu gị na-atụghị ụjọ.[30] Nyere anyị aka site nꞌisetipụ aka gị ịgwọ ndị ọrịa, na ime ihe ịrịba ama na ịrụ ọrụ ebube site nꞌike Jisọs, Ohu gị dị nso.”[31] Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nꞌime ya mara jijiji. Ha nile jupụtakwara na Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu ikwusa ozi ọma Chineke na-atụghị ụjọ.

MAK 16:17-20
[17] “Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche.[18] Aka ha ka ha ga-eji tụtụlie agwọ, ma ọ gaghị ata ha. Ọ bụrụ na ha aṅụọ nsi, ọ gaghị egbu ha. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka nꞌahụ, mee ka ahụ dị ha mma.”[19] Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nꞌeluigwe, ebe ọ nọdụrụ nꞌakụkụ aka nri Chineke.[20] Mgbe ihe ndị a gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ kwusaa ozi ọma nꞌebe nile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha. O gosiri na okwu ha bụ eziokwu site nꞌinye ha ike ịrụ ọrụ ebube nke ya na nkwusa ozi ọma ahụ so.

LUK 9:13-17
[13] Ma Jisọs zara sị ha, “Chọọrọnụ ha nri ha ga-eri.” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ ka anyị nwere. Ị̀ chọrọ ka anyị gaa zụọra mmadụ ndị a nile nri?”[14] Ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ ruru puku mmadụ ise. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gwanụ ha ka ha nọdụ ala. Keenụ ha ka ha nọdụ nꞌigwe nꞌigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”[15] Ndị na-eso ụzọ Jisọs nyeere ndị mmadụ ahu aka ịnnọdụ dị ka Jisọs si kwuo.[16] Emesia, Jisọs weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị ahụ lelie anya nꞌeluigwe. O kelere Chineke ekele nꞌihi ha, nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahu.[17] Ndị ahụ nile riri tutuu efọ eju ha. Nꞌikpeazụ ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara ibiribe beredi fọdụrụ tụtụjuo ya nkata iri na abụọ.

LUK 8:43-48
[43] Nꞌime igwe mmadụ a, o nwere otu nwanyị nọrọla nꞌọrịa afọ iri na abụọ. Ọrịa ọ na-arịa bụ ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị. O mefuola ego dị ukwuu nꞌaka ndị dibia dị iche iche, ma o nwebeghị onye nwere ike gwọọ ya.[44] O jisiri ike site nꞌetiti ndị mmadụ bịa nꞌazụ Jisọs metụ ọnụ uwe Jisọs aka. Otu mgbe ahụ o metụrụ uwe Jisọs aka, ọbara ahụ kwụsịkwara ịgba ọzọ.[45] Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị jụọ ajụjụ sị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya, Pita na ndị ọzọ so Jisọs gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, lee igwe mmadụ gbara gị gburugburu, ndị na-achọsi ike ịbịaru gị nso, ị sikwanụ aṅaa na-ajụ ajụjụ banyere onye metụrụ gị aka?”[46] Ma Jisọs zara sị ya, “O nwere otu onye metụrụ m aka, nꞌihi o metụrụ m nꞌahụ na ike esitela m nꞌahụ pụọ.”[47] Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime izo onwe ya, o jiri egwu na ahụ ịma jijiji bịa daa nꞌala nꞌihu Jisọs, kọọrọ ya ihe nile mere nꞌihu mmadụ nile. Ọ gwakwara Jisọs ihe mere o ji metụ ya aka.[48] Jisọs gwara ya sị, “Ada m nwanyị, atụla egwu, okwukwe i nwere nꞌime m agwọọla gị.”

JỌN 4:46-54
[46] Ma mgbe Jisọs na-agagharị na Galili ọ bịaruru Kena. Nke a bụ obodo ahụ ebe o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. Mgbe ọ nọ nꞌebe ahụ, otu onye na-arụ ọrụ eze, nke bi nꞌobodo Kapanọm, nke nwere nwa nwoke ahụ na-esighị ike,[47] nụrụ na Jisọs esila Judia laghachi Galili. Nwoke a mere ngwangwa gaa Kena. Nꞌebe ahụ ka ọ hụrụ Jisọs rịọ ya ka ọ bịaruo Kapanọm gwọọ nwa ya nwoke nke nọ nꞌọnụ ọnwụ.[48] Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ bụ nanị mgbe unu hụrụ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama ka unu ga-ekwere?”[49] Nwoke ahụ rịọsịrị ya ike sị, “Onyenwe anyị biko soro m ugbu a tupuu nwa m anwụọ.”[50] Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Laa nꞌụlọ gị. A gwọọla nwa gị!” Nwoke ahụ kweere nꞌihe Jisọs kwuru. Ọ hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ya.[51] Mgbe ọ nọ nꞌụzọ ndị ohu ya jiri ozi ọma bịakwute ya sị, “Ahụ adịla nwa gị nwoke mma.”[52] Ọ jụrụ ha sị, “Olee oge ahụ ji dị ya mma?” Ha gwara ya sị, “Ụnyaahụ, nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere nke mbụ, oyi ahụ kwụsịrị ya.”[53] Otu mgbe ahụ nwoke a ghọtara ihe mere ahụ jiri dị nwa ya mma. Oge ahụ bụ mgbe Jisọs gwara ya sị, “Ahụ nwa gị nwoke adịla ya mma.” Nwoke ahụ na ezinụlọ ya nile kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.[54] Nke a bụ ihe ịrịba ama nke abụọ Jisọs mere na Galili mgbe ọ hapụrụ Judia.

Igbo Bible 1988
No Data