A A A A A

Chineke: [Agaghị m ahapụ gị]


1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

1 PITA 5:7
Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.

2 TIMỌTI 1:7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.

HIBRU 4:16
Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.

HIBRU 13:4-6
[4] Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha.[5] Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”[6] Ya mere anyị pụrụ iji nganga na-atụghị egwu kwuo sị, “Chineke bụ onye inye aka m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”

MATIU 28:20
Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ ụwa.”

NKPUGHE 3:10
“Nꞌime nsogbu ndị a ha na-enye gị nꞌihi aha m, i sitela na ntachi obi sọpụrụ okwu m nile. Nꞌihi nke a, aga m ekpuchi gị site nꞌoke mkpagbu ahụ, ya na oke ọnwụnwa ahụ ga-abịakwasị ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ga-anwapụta okwukwe ndị ga-adị ndụ.

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

FILIPAI 4:6-7
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.

Igbo Bible 1988
No Data