A A A A A

Chọọchị: [Ndi ozuzu aturu]


2 TIMỌTI 4:2
kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ.

ỌLU OZI 20:28
“Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha.

HIBRU 13:17
Ruberenụ ndị isi unu isi. Gbalịanụ ime ihe ha gwara unu. Nꞌihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụ obi unu. Chineke ga-ekpekwa ha ikpe dị ka ọrụ ha si dị. Ruberenụ ha isi ka ha nwee obi aṅụrị ịrụ ọrụ ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha ejiri ihu mgbarụ rụọ ọrụ ha, ọrụ ha agaghị abara unu uru.

JEMES 3:1
Ụmụnna m, ka ọtụtụ nꞌime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, ndị ọrụ ha bụ igosi ndị ọzọ ebe ha siri mehie. Nꞌihi na ebe ndị nkuzi bụ ndị a na-ele anya na ha ma ihe karịa ibe ha, ha gaanata ikpe ọmụma karịrị ukwuu ma ọ bụrụ na ha emehie.

EFESỌS 4:11-12
[11] Ọ bụkwa ya nyere ndị mmadụ onyinye. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ ndị ozi, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị amụma, ndị ọzọ onyinye ikwusa ozi ọma, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ụkọchukwu, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ozizi.[12] Gịnị mere o jiri nye ha onyinye ndị a? O nyere onyinye ndị a ime ka ụmụ Chineke bụrụ ndị zuru oke ịrụrụ Chineke ọrụ iwuli nzukọ ya bụ ahụ Kraịst elu. Ka onye ọ bụla nꞌime ụmụ Chineke bụrụ ndị dị ike na ndị tozuru oke nꞌihe ọmụma,

1 PITA 5:1-4
[1] Mụ onwe m, onye bụkwa okenye chọọchị, na-agwa ndị okenye chọọchị nile nọ nꞌetiti unu okwu a. Eji m anya m abụọ hụ Kraịst mgbe ọ nwụrụ nꞌelu obe. Aga m esokwa keta oke nꞌebube ya na otuto ga-abụ nke ya mgbe ọ lọghachiri.[2] Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.[3] Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha.[4] Nke a ga-eme ka unu nata ụgwọ ọrụ iketa oke nꞌebube ahụ na-agaghị agwụ agwụ, mgbe onye ọzụzụ atụrụ dị ukwuu ahụ bịara.

TAITỌS 1:5-9
[5] Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ọ bụla dị mkpa nꞌusoro nke ga-enyere ụlọ nzụkọ dị nꞌebe ahụ aka. Ahapụkwara m gị ka ị họpụta ndị isi chọọchị nꞌobodo ahụ nile, ndị ga-eme ihe m nyere gị nꞌiwu.[6] Ndị isi chọọchị ọ bụla ị ga-ahọpụta ga-abụ ndị a maara nke ọma dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị ụmụ ha kwa bụ ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya, nke ndị mmadụ na-agbara akaebe dị mma na ha abụghị ụmụ naebi ndụ ọjọọ, na ndị na-adịghị erube isi.[7] Ebe ndị isi chọọchị a ga-abụ ndị na-elekọta ọrụ Chineke, ha ga-abụ ndị mmadụ na-apụghị ibo ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Ha agaghị abụ ndị nganga, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị isi ike, ndị na-alụ ọgụ nꞌihi ịṅụbiga mmanya oke, ndị hụrụ ego nꞌanya.[8] Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.[9] Ha ga-abụkwa ndị guzosiri ike nꞌeziokwu nke ozi ọma ahụ anyị ziri ha. Nke a ga-eme ka ha nwee ike izi ndị ọzọ eziokwu ahụ, na iji ya zi ndị ahụ na-arụ ụka ebe ha si jehie.

1 TIMỌTI 3:1-13
[1] Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ.[2] Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.[3] ***[4] Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinụlọ nke aka ya nke ọma. Onye nwere ụmụ ndị dị nwayọọ na ndị na-asọpụrụ ya.[5] Nꞌihi na ọ bụrụ na nwoke enweghị ike chịkọtazie ezinụlọ ya ọ̀ ga-esi aṅaa chịzie ụlọ chọọchị Chineke.[6] Onye a ga-enye ụdị ọrụ a agaghị abụ onye nabatara Kraịst ọhụrụ, nꞌihi na ọnọdụ dị elu a pụrụ ime ka o bido ịnya isi. Unu maara na ịnya isi nwere ike ibutere ya ịla nꞌiyi. Dị ka ekwensu si welie onwe ya elu, ma Chineke chụpụrụ ya.[7] Onye a ga-enye ọnọdụ a aghaghị ịbụ onye ndị na-abụghị ndị Kraịst na-agba ezi ama banyere, ka ekwensu hapụ isiste nꞌọnụ ndị a boo ya ebubo ga-eme ka ọ ghara inwe nkwuwa okwu ịchịzi ndị nọ nꞌokpuru ya.[8] Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị omume ha dị mma na ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị hụrụ ego nꞌanya.[9] Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.[10] Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.[11] Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.[12] Ndị nile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinụlọ nke aka ha nke ọma.[13] Nꞌihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkuwa okwu ha nwere banyere okwukwe ha nꞌime Kraịst Jisọs.

Igbo Bible 1988
No Data