Instagram
English
A A A A A

Chọọchị: [Mmụọ Nsọ]


MATIU 12:31-33
[31] “Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara.[32] Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa.[33] “Osisi ọma na-amị mkpụrụ ọma. Osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọjọọ. A na-amata osisi ọ bụla site na mkpụrụ ọ na-amịpụta.

LUK ๒๔:๔๕-๔๙
[๔๕] Mgbe ahụ o meghere akọnuche ha, ime ka ha ghọta ihe nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere ya.[๔๖] Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ.[๔๗] E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem.[๔๘] Unu bụkwa ndị akaebe na ihe nile ndị amụma kwuru emezuola.[๔๙] “Ma nọdụnụ nꞌobodo Jerusalem a tutuu Mmụọ Nsọ abịa mejupụta unu nꞌike. Nꞌihi na aga m ezite ya ka ọ bịakwasị unu dị ka Nna m kwere nkwa ime.”

JỌN 3:6-8
[6] Dị ka mmadụ nwere ike mụọ mmadụ ibe ya, otu a kwa, ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ pụrụ ịmụ mmadụ nꞌime Mmụọ Nsọ.[7] Ya ejule gị anya na m sịrị, ‘A ghaghị ịmụ gị ọzọ.’[8] Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.”

ROM 8:2-6
[2] Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị.[3] A zọpụtaghị anyị nꞌihi na anyị debere iwu, nꞌihi na ọ dịghị mgbe anyị na-edebe ya, anyị enwekwaghị ike idebe ya. Ma Chineke sitere nꞌụzọ dị iche zọpụta anyị. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nꞌụdị anyị bụ mmadụ ka ọ laa ike nke mmehie nꞌiyi, site nꞌiji onwe ya chụọ aja nꞌihi mmehie anyị.[4] Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ.[5] Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ.[6] Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo.

2 KỌRINT 5:16-18
[16] Anyị onwe anyị adịghị elekwa onye ọ bụla anya site nꞌihe ndị mmadụ na-eche banyere ha. Nꞌihi na anyị sitere nꞌụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a anyị amakwaghị ya nꞌụzọ dị otu a.[17] Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.[18] Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nꞌaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo. Ma ugbu a o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nꞌudo.

ỌLU OZI 2:1-5
[1] Nꞌụbọchị mmemme owuwe ihe ubu, nke bụ Pentikọọsụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst nile zukọrọ nꞌotu ebe.[2] Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ.[3] Ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ ihe yiri ire ọkụ. Ire ọkụ ndị a nọkwasịrị nꞌisi ha nile nꞌotu nꞌotu.[4] E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.[5] Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem.

LUK 24:45-47
[45] Mgbe ahụ o meghere akọnuche ha, ime ka ha ghọta ihe nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere ya.[46] Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ.[47] E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem.

1 JỌN 2:19-27
[19] Ndị a na-emegide Kraịst ugbu a si nꞌọgbakọ anyị pụọ. A sị na ha bụ ndị na-eso Kraịst nꞌezie ha agaraghị esite nꞌọgbakọ anyị pụọ. Ma ha hapụrụ anyị pụọ igosi na o nweghị oge ha ji bụrụ ndị na-eso Kraịst.[20] Ma unu adịghị ka ndị ahụ si nꞌọgbakọ anyị pụọ, nꞌihi na Mmụọ Nsọ Chineke nọ nꞌime unu. Unu amụtakwala eziokwu Chineke.[21] Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dị ka ndị ịmụta ihe bụ ezi ozizi dị mkpa, kama ọ bụ ka m dọọ unu aka na ntị ka unu bụrụ ndị na-asa anya unu mmiri ịchọpụta ihe bụ eziokwu nꞌoge a ajọ ozizi dị.[22] Ònye bụ onye okwu ụgha ahụ kachasị ndị okwu ụgha nile? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye iro Kraịst, onye na-emegide Kraịst. Nꞌihi na o kwereghị na Chineke ma ọ bụ na Jisọs Ọkpara ya.[23] Ya mere, onye ọ bụla naekweghị na Kraịst enwekwaghị Chineke ma ọlị. Ma onye ahụ nwere Kraịst nwere Chineke bụ Nna.[24] Ya mere, nọgidenụ nꞌokwukwe unu, dị ka e ziri unu site na mbụ. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu na Chineke Nna na Kraịst Ọkpara ya gaenwe ezi nnwekọ na-adịgide.[25] Kraịst nꞌonwe ya ekwela anyị nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi.[26] Ana m edere unu ihe ndị a ime ka unu mara ihe banyere ndị iro ahụ na-emegide Kraịst. Nꞌihi na ha na-agbalịsi ike iduhie ndị mmadụ.[27] Ma unu anatala Mmụọ Nsọ, onye bụ otite mmanụ ahụ Chineke tere unu. Mmụọ Nsọ ahụ na-ebigidekwa nꞌime unu mgbe nile izi unu ihe bụ eziokwu. Onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Nanị ya bụ onye ozizi na-ezi ihe bụ eziokwu oge nile. Mmụọ Nsọ na-agwakwa unu sị unu nọgide nꞌime Kraịst. Ya mere, unu esitekwala nꞌime ya pụta.

Igbo Bible 1988
No Data