A A A A A

Chọọchị: [Toga Eluigwe]


JỌN 14:2-3
[2] Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.[3] Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ.

FILIPAI 3:20-21
[20] Ma anyị onwe anyị ụmụnna m, eluigwe bụ ụlọ anyị, ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. Anyị na-elekwa anya mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe lọghachi.[21] Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-eji anụ ahụ dị ebube, nke yiri nke ya, gbanwee anụ ahụ anyị ndị a nke na-anwụ ọnwụ. Ọ bụkwa ike ya ahụ dị ukwuu, nke ọ ga-eji lụgbuo ihe nile dị nꞌụwa, ka ọ ga-eji nye anyị ahụ ọhụrụ ahụ.

ỌLU OZI 1:11
Mmadụ abụọ ndị a jụrụ ha sị, “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzo nꞌebe a na-ele anya nꞌeluigwe? Jisọs alaala nꞌeluigwe. Otu ụbọchị unu ga-ahụkwa ya anya ọzọ, ka ọ na-alọta dị ka unu hụrụ ya taa, ka ọ na-ala nꞌeluigwe!”

HIBRU 11:16
Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ibi nꞌụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a Chineke naara ha dị ka ụmụ ya. Ihere ha emeghị ya. Nꞌihi na o dozielara ha ebe obibi nꞌeluigwe.

JỌN 14:1-3
[1] “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.[2] Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.[3] Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ.

MATIU 18:15-18
[15] “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.[16] Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.[17] Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.[18] Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe.

JỌN 14:28
Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m.

ỌLU OZI 4:12
O nweghị onye ọzọ pụrụ ịzọpụta anyị. Chineke ahọpụtakwaghị aha ọzọ nꞌụwa nile nye ụmụ mmadụ, nke a ga-esite na ya zọpụta anyị.”

JỌN 3:13
Ọ gwụchaala Onye nzọpụta ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Ọ bụkwa mụ onwe m bụ ya. Ọ bụkwa m ga-alaghachi azụ nꞌeluigwe.

NKPUGHE 21:1-4
[1] Mgbe ahụ elere m anya hụ elu ụwa ọhụrụ nke osimiri na-adịghị nꞌime ya, na mbara eluigwe ọhụrụ, nꞌihi na elu ụwa mbụ na mbara eluigwe mbụ ahụ, bụ ndị dị ugbu a, adịkwaghị.[2] Mụ onwe m bụ Jọn hụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nꞌeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ bụ ihe dị ebube ma e lee ya anya. Ọ mara mma dị ka nwagbọghọ e jikwara nke ọma maka ịgba akwụkwọ ya.[3] Anụkwara m oke olu si nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nꞌetiti ụmụ mmadụ. Ya na ha ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị ya. Ee, nꞌezie, Chineke nꞌonwe ya ga-anọkwa nꞌetiti ha bụrụkwa Chineke ha.[4] Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”

1 TIMỌTI 3:15
nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke.

JỌN 14:6
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

MAK 6:3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.

FILIPAI 3:21
Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-eji anụ ahụ dị ebube, nke yiri nke ya, gbanwee anụ ahụ anyị ndị a nke na-anwụ ọnwụ. Ọ bụkwa ike ya ahụ dị ukwuu, nke ọ ga-eji lụgbuo ihe nile dị nꞌụwa, ka ọ ga-eji nye anyị ahụ ọhụrụ ahụ.

JỌN 1:12
Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke.

1 KỌRINT 13:12
Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a.

JỌN 3:3-5
[3] Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”[4] Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”[5] Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.

HIBRU 12:14
Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.

NKPUGHE 21:1-2
[1] Mgbe ahụ elere m anya hụ elu ụwa ọhụrụ nke osimiri na-adịghị nꞌime ya, na mbara eluigwe ọhụrụ, nꞌihi na elu ụwa mbụ na mbara eluigwe mbụ ahụ, bụ ndị dị ugbu a, adịkwaghị.[2] Mụ onwe m bụ Jọn hụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nꞌeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ bụ ihe dị ebube ma e lee ya anya. Ọ mara mma dị ka nwagbọghọ e jikwara nke ọma maka ịgba akwụkwọ ya.

1 KỌRINT 15:40-49
[40] Ndị nọ nꞌeluigwe nwekwara anụ ahụ nke ha, nke dịkwa iche site na nke anyị ndị bi nꞌụwa. Ịma mma ha na ebube nke ndị nọ nꞌeluigwe dịkwa iche na nke ndị bi nꞌụwa.[41] Ịma mma na ebube nke anyanwụ dị iche, ọnwa nwekwara nke pụrụ iche. Otu a kwa, kpakpando nwekwara ịma mma pụrụ iche. Ma ụfọdụ kpakpando na-enwu ọcha karịa kpakpando ndị ọzọ.[42] Otu a ka mbilite nꞌọnwụ ga-adị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ.[43] Anụ ahụ nke anyị nwere ugbu a, bụ nke pụrụ ịrịa ọrịa na nke pụrụ ịnwụ anwụ. Ma mgbe e mere ka anyị dịrị ndụ ọzọ, a ga-eme ka o bilie nꞌotuto. Ee, ha bụ anụ ahụ na-adịghị ike ugbu a, ma mgbe anyị biliri ọzọ, a ga-eme ka ọ bụrụ anụ ahụ nwere ike.[44] Ọ bụ nanị anụ ahụ mmadụ ka ha bụ mgbe e liri ya, ma mgbe e si nꞌọnwụ kpọlite ha, ha ga-abụ anụ ahụ nke mmụọ na-achị. Dị ka e nwere anụ ahụ nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị, otu a kwa ka e nwere anụ ahụ nke mmụọ na-achị.[45] Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “E kere Adam nwoke mbụ ka ọ bụrụ mmadụ dị ndụ, ma Kraịst, Adam ikpeazụ, bụ mmụọ na-enye ndụ.”[46] Na mbụ anyị na-enwe anụ ahụ mmadụ, ma nꞌikpeazụ Chineke ga-enye anyị anụ ahụ nke mmụọ na-achị.[47] E si nꞌịta kee Adam nwoke mbụ, ma Kraịst, Adam nke ikpeazụ, si nꞌeluigwe bịa.[48] Mmadụ nile nwere anụ ahụ dị ka Adam, nke e si nꞌịta kpụọ. Ma ndị nile bụ nke Kraịst ga-enwe ụdị anụ ahụ ahụ Kraịst nwere, anụ ahụ nke si nꞌeluigwe.[49] Dị ka anyị nile si nwee anụ ahụ yiri nke Adam, nke si nꞌịta, otu ahụ kwa ka anyị ga-esi nwee anụ ahụ ga-adị ka nke Kraịst onye si nꞌigwe.

LUK 24:39
Leenụ anya nꞌaka m! Leekwanụ anya nꞌụkwụ m! Ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ahụ. Metụnụ m aka chọpụtanụ ihe m bụ nꞌonwe unu, nꞌihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ dị ka m nwere.”

HIBRU 9:27
Nꞌihi na dị ka o si bụrụ ihe a kwadobeere mmadụ na ọ ga-anwụ nanị otu ugboro, ma nke a gasịa ikpe eso ya,

FILIPAI 1:21-23
[21] Nꞌihi na nꞌebe m nọ, ịdị ndụ bụ ịnọ nꞌime Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru nye m.[22] Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ ga-enye m ohere iritere Kraịst ọtụtụ ndị mmadụ nꞌuru, amakwaghị m nke ka mma, ma ọ bụ ịdị ndụ ma ọ bụ ịnwụ anwụ.[23] Nꞌihi na mgbe ụfọdụ ụzọ ihe abụọ na-agụsi m ike. Ọ na-agụ m ịdị ndụ na-aga nꞌihu, ma mgbe ụfọdụ ọ na-agụ m ikewapụ onwe m site nꞌanụ ahụ nke a, ka m lakwuru Kraịst, ebe mụ na ya ga-anọ mgbe nile. Ọ bụkwa ịlakwuru Kraịst kachasị ihe nile ọ bụla mma.

EFESỌS 1:22-23
[22] Chineke emeela ka ihe nile dị nꞌokpuru ike Kraịst, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe nile nke nzukọ ya bụ chọọchị.[23] Nꞌihi na chọọchị bụ anụ ahụ Kraịst. Ọ bụkwa ihe na-emezu Kraịst onye ya onwe ya bụ mmezu ihe nile nꞌebe nile.

1 KỌRINT 1:10
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.

JỌN 8:12
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Mụ onwe m bụ onye na-enye ndị bi nꞌụwa ìhè. Onye ọ bụla sooro m agaghị ejegharị nꞌime ọchịchịrị, kama ìhè ahụ ga-anọnyere ya ruo mgbe ebighị ebi.”

1 PITA 3:15
Na-enyenụ Chineke nsọpụrụ nꞌime obi unu. Nọọkwanụ na njikere mgbe nile iguzo kọwaara onye ọ bụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nꞌime unu. Ma werenụ obi dị umeala na nsọpụrụ na-eme ya.

LUK 5:10
Ee, ọ bụladị Jemes na Jọn ụmụ Zebedi ndị ha na Pita so, ka azụ a ha gbutere juru anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu, nꞌihi na site taa gaa nꞌihu, ọrụ unu ga-abụ ịkpọbata mmadụ nꞌalaeze Chineke.”

JEMES 5:16
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya.

2 TIMỌTI 2:2
Nꞌihi na ị ghaghị izi ndị ọzọ ihe ahụ nile gị na ndị ọzọ nụrụ site nꞌọnụ m. Zi ndị kwesịrị ntụkwasị obi eziokwu ahụ, ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a.

NKPUGHE 12:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, oke ihe ịrịba ama pụtara ìhè nꞌeluigwe nke na-egosi ihe gaje ime. Ahụrụ m otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe. Ọnwa dịkwa nꞌokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpu eze nke kpakpando iri na abụọ dị gburugburu ya, dịkwa ya nꞌisi.

JỌN 6:51
Abụ m nri na-enye ndụ nke si nꞌelu bịa. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nri nke m na-enye bụ anụ ahụ m, nke e nyere maka ịgbapụta ụwa nile.”

2 KỌRINT ५:८
Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.

LUK 10:16
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla gere ntị nꞌihe unu gwara ya, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọ bụla kwa jụrụ ịnabata unu, ọ bụ m ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọ bụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata Chineke onye zitere m.”

JỌN 16:13
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime.

1 JỌN 4:6
Ma anyị bụ ụmụ Chineke, ya mere, ọ bụ nanị ndị maara Chineke ga-ege anyị ntị. Ndị ụwa agaghị ege anyị ntị nꞌihi na ha amaghị Chineke. Nke a bụkwa ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta onye si nꞌọnụ ndị nkwusa na-ekwu okwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke esi nꞌọnụ ha kwuo okwu ụwa agaghị anabata ya.

JỌN 21:15-19
[15] Mgbe ha risịrị nri, Jisọs kpọrọ Saịmọn Pita jụọ ya sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya karịa ndị a nile?” Pita zara sị ya, “Ee Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.”[16] Jisọs jụrụ Pita ajụjụ nke ugboro abụọ sị ya “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya?” Pita zara sị ya, “Ee, Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.”[17] Jisọs jụrụ Pita ajụjụ nke ugboro atọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya?” O wutere Pita na Jisọs jụrụ ya ajụjụ a nke ugboro atọ. Pita zara sị ya, “Onyenwe m ị maara ihe nile. Ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.[18] Nꞌezie asị m gị, na mgbe ị bụ okorọbịa i mere ihe dị gị mma nꞌanya. Ị gara ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi ị ga-esite aka gị, mgbe ndị ọzọ ga-edu gị. Ha ga-edu gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”[19] Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ Pita gaanwụ nꞌihi inye Chineke otuto. Mgbe ahụ, Jisọs sịrị Pita, “Soro m.”

MATIU 6:14
Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu.

MATIU 24:37-41
[37] “Ọbịbịa m ga-adị ka ihe mere nꞌoge Noa.[38] Nꞌoge ahụ ndị bi nꞌụwa ga na-ebi ndụ ha. Ha ga na-akpọkwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ụfọdụ ga na-alụ di na nwụnye ha dị ka ọ dị nꞌoge Noa. Ma na mberede, oke mmiri ahụ bịakwasịrị ha, ma Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ya.[39] Ndị mmadụ ekwenyeghị na ọ dị ihe ga-eme tutuu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha nile. Otu ahụ ka ọbịbịa m ga-adị.[40] “Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nꞌubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.[41] Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka ha nꞌụlọ igwe na-akwọ ọka, a ga-ewepụ otu, ma hapụ nke ọzọ.

1 TIMỌTI 2:4
Nꞌihi na Chineke chọrọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha matakwa eziokwu ahụ.

1 TESALỌNAIKA 4:17
Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nꞌụwa, ka a ga-eweli elu nꞌime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na ya ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

1 JỌN 5:13
Ana m edere unu akwụkwọ a unu ndị kweere nꞌỌkpara Chineke ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi.

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

JỌN 5:24
“Ka m gwa unu eziokwu, mmadụ ọ bụla nụrụ okwu m ma kwerekwa na Chineke onye zitere m, nwere ndụ ebighị ebi. Ọmụma ikpe adịkwaghị nye onye ahụ. Kama o sitela nꞌọnwụ banye na ndụ.

1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.

MATIU 25:46
“Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

LUK 23:43
Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, taa, ka ị ga-eso m nọdụ na Paradaịs.”

Igbo Bible 1988
No Data