A A A A A

Chọọchị: [Ndị nkuzi ugha]


LUK 6:26
Lee ka ahụhụ si na-eche ndị ahụ ụmụ mmadụ na-eto, ndị ha na-ekwu okwu ọma banyere. Nꞌihi na site na mgbe ochie ọ bụ ndị amụma ụgha ka a na-eto otuto.

MATIU 24:24
Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara.

MATIU 16:11-12
[11] Gịnị mere unu ji chee na ọ bụ ihe banyere nri ka m na-ekwu? Ka m kwuokwa okwu m kwuru ọzọ, cheenụ onwe unu nche nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”[12] Nꞌikpeazụ ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ọjọọ ndị Farisii na ndị Sadusii.

2 TIMỌTI 4:3-4
[3] Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.[4] Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi.

2 TIMỌTI 4:3-4
[3] Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.[4] Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi.

ỌLU OZI 20:28-30
[28] “Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha.[29] Nꞌihi na amaara m na mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, ndị ozizi ụgha yiri ọdụm ga-apụta nꞌetiti unu mee ka igwe atụrụ Chineke site nꞌeziokwu kpafuo.[30] “Ụfọdụ nꞌime unu ga-elefu eziokwu ahụ anya ka unu dọtara onwe unu mmadụ.

2 PITA 3:14-18
[14] Bikonụ ndị m hụrụ nꞌanya, mgbe unu nọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, kwerekwanụ ka unu na ndị ọzọ biri nꞌudo, ka a hapụ ịchọta ntụpọ ọ bụla nꞌime unu mgbe unu ga-eguzo nꞌihu Chineke.[15] Chetakwanụ ihe mere Onyenwe anyị adịghị eme ngwangwa ịlọghachi. Ọ na-enye anyị ohere ime ka ndị ọzọ nata ozi ọma ahụ ga-ewetara ha nzọpụta. Nwanna anyị Pọl ejirila amamihe Chineke nyere ya dee ihe banyere okwu a nꞌọtụtụ akwụkwọ ozi ọ na-ede. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta. Ma ọ bụ nꞌụdị okwu a ka a na-ahụ ọtụtụ ndị nzuzu, ndị na-akọwa okwu ndị a dị ka ha si chepụta nꞌobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere isi, mee ka a ghọta okwu ndị a nꞌụzọ na-abụghị ụzọ Pọl onye dere ha chọrọ ka anyị ghọta ha. Nke a bụkwa ihe ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ si otu a na-ewetara onwe ha ịla nꞌiyi.[16] ***[17] Ụmụnna m, ana m adọ unu aka na ntị banyere ihe ndị a, ime ka unu nọọ na nche, ka a ghara isite na njehie ndị ozizi ọjọọ a duhie unu, ime ka unu si nꞌọnọdụ unu dapụ.[18] Bụrụnụ ndị na-eto eto nꞌime mmụọ unu, bụrụkwanụ ndị na-aga nꞌihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin.

1 JỌN 4:1-6
[1] Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile.[2] Ụzọ unu ga-esi mata ma okwu unu nụrụ o si nꞌaka Mmụọ Chineke bụ nke a, ọ̀ na-ekwupụta na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke ghọrọ mmadụ jiri anụ ahụ mmadụ bịa nꞌụwa? Ọ bụrụ na okwu ahụ kwagidere na Jisọs bịara nꞌụdị mmadụ nꞌụwa mgbe ahụ okwu ahụ bụ nke si nꞌebe Chineke nọ bịa.[3] Ma ọ bụrụ na nkwusa ahụ asị na Jisọs esighị otu a bịa, ọ bụghị nke si nꞌebe Chineke nọ pụta. Ọ bụ nkwusa okwu ụgha ahụ, nke si nꞌebe onye iro Kraịst bịa. Unu anụla ihe banyere ọbịbịa ya. Ndị ozi ya jupụtara ụwa taa.[4] Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa.[5] Nꞌihi na ndị a nile si nꞌime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ nanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.[6] Ma anyị bụ ụmụ Chineke, ya mere, ọ bụ nanị ndị maara Chineke ga-ege anyị ntị. Ndị ụwa agaghị ege anyị ntị nꞌihi na ha amaghị Chineke. Nke a bụkwa ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta onye si nꞌọnụ ndị nkwusa na-ekwu okwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke esi nꞌọnụ ha kwuo okwu ụwa agaghị anabata ya.

MATIU 7:15-20
[15] “Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu.[16] Unu ga-amata ha site nꞌụdị ndụ ha na-ebi. A na amara osisi ọ bụla site na mkpụrụ ya. Ị gaghị ahụ mkpụrụ ose kpọọ ya mkpụrụ aṅara.[17] A na-esite na mkpụrụ nke osisi mịpụtara mata ụdị osisi ọ bụ.[18] Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma.[19] Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ.[20] Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya.

2 PITA 1:12-21
[12] Ọ bụ nzube m na m ga na-echetara unu ihe ndị a site nꞌoge ruo nꞌoge. Ọ bụ ezie na unu maara ha na-eguzosikwa ike nꞌeziokwu ahụ unu natara.[13] Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoo haa na oge m nwere nꞌụwa adịkwaghị ukwuu, na m ga-anwụ nꞌoge na-adịghị anya. Ya mere, na nwa oge ahụ fọdụrụ, ana m agụ ya nꞌihe ziri ezi ịkpọtụ mmụọ unu na uche unu site nꞌichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nꞌụwa a.[14] ***[15] Aga m agbalịsi ike ịhụ na a sịkwarị na m nwụọ, unu ga na-echeta ihe ndị a.[16] Ihe nile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nꞌamamihe ya. Nꞌihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbia ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya m abụọ ka m ji hụ ebube na ịma mma ya.[17] Eso m nọdụ nꞌelu ugwu ahụ dị nsọ mgbe Chineke mere ka otuto ya na nsọpụrụ ya pụta ìhè. Eji m ntị m nụrụ mgbe olu ahụ dị ebube si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ nꞌanya nke ukwuu, onye ihe ya dịkwa m ezi mma.”[18] ***[19] Nꞌezie, anyị ahụla, nwapụtakwa na amụma ahụ ndị amụma buru emezuola. Ọ ga-abara unu uru ilezi anya nꞌihe ahụ nile ndị amụma dere, nꞌihi na ozi ha dị ka ìhè nke na-acha nꞌakụkụ ụlọ gbara ọchịchịrị. Okwu ha na-enyere anyị aka ịghọta ọtụtụ ihe gaara esiri anyị ike ịghọta. Mgbe unu tulere eziokwu ahụ dị nꞌokwu ahụ ndị amụma kwuru, ìhè ga-enwụbata nꞌobi unu, mgbe ahụ kwa Kraịst onye dị ka kpakpando na-acha nꞌisi ụtụtụ ga-eme ka ihè ya chabata nꞌime unu.[20] Nke ka nke, chetanụ nke a, na okwu amụma ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ abụghị nke onye ọ bụla nwere ika ịkọwa otu o si dị ya mma.[21] Nꞌihi na o nweghị okwu amụma ọ bụla ndị amụma ochie sitere nꞌobi ha chepụta dee ma ọ bụ kwuo. Kama ọ bụ Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha nyere ha ozi ahụ Chineke chọrọ ka ha kwuo.

TAITỌS 1:6-16
[6] Ndị isi chọọchị ọ bụla ị ga-ahọpụta ga-abụ ndị a maara nke ọma dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị ụmụ ha kwa bụ ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya, nke ndị mmadụ na-agbara akaebe dị mma na ha abụghị ụmụ naebi ndụ ọjọọ, na ndị na-adịghị erube isi.[7] Ebe ndị isi chọọchị a ga-abụ ndị na-elekọta ọrụ Chineke, ha ga-abụ ndị mmadụ na-apụghị ibo ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Ha agaghị abụ ndị nganga, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị isi ike, ndị na-alụ ọgụ nꞌihi ịṅụbiga mmanya oke, ndị hụrụ ego nꞌanya.[8] Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.[9] Ha ga-abụkwa ndị guzosiri ike nꞌeziokwu nke ozi ọma ahụ anyị ziri ha. Nke a ga-eme ka ha nwee ike izi ndị ọzọ eziokwu ahụ, na iji ya zi ndị ahụ na-arụ ụka ebe ha si jehie.[10] Nꞌihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị ozi ọma a, nke ka nke, ndị ahụ na-asị na ọ dị mkpa ka onye nke Kraịst debe iwu ndị Juu nile nke. Ma okwu ndị a bụ okwu nzuzu, nke naegbochi ndị mmadụ iso eziokwu.[11] Ihe dị mkpa ugbu a bụ ịkwụsị ndị na-ezi ihe dị otu a, nꞌihi na ha esitela nꞌihe ha na-ezi weta oke nsogbu nꞌọtụtụ ezinụlọ, meekwa ka ndị na-anabata ihe ha na-ezi lefuo amara Chineke anya. Ndị na-ezi ihe a na-eme ya nꞌihi ego ha na-enweta.[12] Ọ bụ otu onye nꞌime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit nile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nꞌazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”[13] Nꞌezie, ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Nꞌihi nke a gwasie ha okwu ike banyere mmehie ha na-atụghị ụjọ. Ọ bụ nanị nke a ga-enyere ha aka ibi ezi ndụ nꞌime okwukwe anyị.[14] Kwụsị ha ige ntị nꞌakụkọọ ifo ndị Juu na-akọ. Ekwekwala ka ha gee ntị nꞌiwu ahụ ndị jụrụ eziokwu ahụ na-enye ha.[15] Onye ọ bụla obi ya dị ọcha na-ahụ nanị ihe dị mma na ihe dị ọcha nꞌihe nile. Ma onye ahụ obi ya na-adịghị ọcha, nke na-adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ka ọ na-ahụ nꞌihe nile. Nꞌihi na obi ruru unyi, nke na-ekweghị ekwe, na-eme ka ihe nile ọ na-ahụ bụrụ nanị ihe rụrụ arụ.[16] Ọ bụ ezie na ndị dị otu a na-asị na ha maara Chineke ma e lee anya nꞌomume ha, ọ na-ezipụta na ha amaghị ya. Ha bụ ndị ọjọọ, ndị rere ure na ndụ ha, ndị na-adịghị ekwenye nꞌihe ọ bụla gbasara Chineke, ndị na-enweghị ike ịrụpụta ezi ọrụ ọ bụla na ndụ ha.

2 PITA 2:1-22
[1] Ma na mgbe ochie ahụ kwa e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nꞌetiti ha, dị ka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nꞌetiti unu, ndị na-eweta ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nꞌiyi, ndị ga-agọnarị Onyenwe anyị, onye ji ọbara ya gbapụta ha. Ma ọnwụ ha ga-abụ nnọọ na mberede, ha ga-anwụchakwa ọnwụ.[2] Ma nꞌihi otu ha si ebi ndụ ha ọtụtụ mmadụ ga-ekwu okwu megide ụzọ nke eziokwu ahụ.[3] Ndị nkuzi ụgha a ga-esite nꞌakpịrị ego ha nwere gwa unu ihe ọ bụla, nke ga-eme ka ego unu bata ha nꞌaka. Ma ha bụ rị ndị Chineke mara ikpe kemgbe oge gara aga ọge ịla nꞌiyi ha na-abịa nso.[4] Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ.[5] Chineke emereghị ndị ụwa mbụ ebere. O mere ka mmiri zoo, kpuchie ụwa ahụ jupụtara na ndị na-amaghị Chineke, ka ọ bụrụ nanị Noa onye gwara ndị ọgbọ ya okwu banyere omume Chineke ka o chebere ndụ, ya na mmadụ asaa ọzọ.[6] Ọzọ, Chineke mara obodo Sodọm na Gomora ikpe, werekwa ọkụ rechapụ obodo ahụ, ya na ndị nile bi nꞌime ya, ime ka nke a bụrụ ihe ịma atụ nye ndị na-amaghị Chineke ihe ga-abụ ọnọdụ ha mgbe Chineke ga-ekpe ha ikpe.[7] Ma nꞌoge ọ na-emebi Sodọm na Gomora, ọ napụtara Lọt site nꞌaka ọnwụ. Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ ndị obodo ahụ na-ebi wutere nke ukwuu.[8] Ụbọhcị nile, ehihie na abalị, ihe ọjọọ nile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, wutere mkpụrụ obi ya nke ukwuu.[9] Nke a na-egosi na Chineke maara otu o si adọpụta mụ na gị site nꞌọnwụnwa gbara anyị gburugburu. Ọ makwaara otu o si ata ndị ọjọọ ahụhụ, tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ.[10] Nke ka nke, Chineke maara otu o si emeso ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ rere ure nke anụ ahụ mmeso, bụ ndị ahụ jupụtara na nganga na isi ike, ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nꞌebube nke anya na-adịghị ahụ.[11] Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ndị na-eguzo nꞌihu Onyenwe anyị, dị ike karịa mmadụ ndị a, ma ha adịghị eji ọnụ ha ekwulu mmụọ ndị a dị ike, na ndị dị ebube, nke ndị ozizi ụgha ndị a na-emeghe ọnụ ha ha ekwutọ.[12] Ma ana m eche na ndị ozizi ụgha a bụ ndị nzuzu. Ha na-eme ihe ọ bụla ha kpebiri nꞌobi ha. Ha dị ka ụmụ anụ ọhia ndị a na-amụ nanị nꞌihi ka ndị mmadụ gbuo ha rie. Lee ka ha si ekwulu ndị dị ike ha na-aghọtaghị ihe ọ bụla banyere. A ga-alakwa ha nꞌiyi, ha na mmụọ ọjọọ nile na ike nile nke ọkụ ala mmụọ.[13] Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị ozizi ụgha ahụ nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na ihe na-atọ ha ụtọ bụ nanị ibi ndụ nke imejupụta ihe ọjọọ ahụ nile na-agụ anụ ahụ ha agụụ. Ha bụ ndị na-ewetara unu ihe ihere mgbe ọ bụla ha so unu na-eri oriri ịhụnanya unu, nꞌihi na nꞌotu akụkụ, ha na-ebi ndụ ajọ omume. Ma ha na-eso unu ezukọ dị ka a ga-asị nꞌezie, na ha bụ ndị dị ọcha nꞌobi ha.[14] O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ.[15] Ha esitela nꞌezi ụzọ ahụ jehie, bụrụ ndị furu efu dị ka Belam, nwa Beoa onye chọrọ ime ihe ọjọọ nꞌihi ego ọ maara na ọ ga-enweta.[16] Ma e mere ka Belam si nꞌụzọ ọjọọ dị otu a pụta, mgbe e mere ka inyinya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu, baara ya mba.[17] Ndị ozizi ụgha a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọ bụla na-adịghị nꞌime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị nke na-adịghị ezo mmiri ọ bụla.[18] Ha na-agwa ndị a ha na-eduhie okwu sị, “A zọpụtaghị unu nꞌihi ọrụ ọma unu rụrụ, ya mere ọ bụghị ihe ọjọọ ma unu gaa nꞌihu ime mmehie. Nꞌihi nzọpụta a zọpụtara unu, unu enwerela onwe unu, meenụ ihe ọ bụla dị unu mma nꞌanya.” Ma ndị ozizi a na-ezi ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha site nꞌiwu, bụ ohu mmehie na ịla nꞌiyi nꞌonwe ha. Nꞌihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọ bụla na-achị ya.[19] ***[20] Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie.[21] Ọ gaara akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na o nweghị oge o ji mata ihe banyere Kraịst na ụzọ ya, karịa na ọ matara ya, mụta ihe banyere ya, mesịa gbaketa iwu ahụ nile e nyere ya azụ.[22] Ọ bụrụ na ihe dị otu a emee, a ga-eji omume onye ahụ tụnyere ilu ndị a nke kwuru sị, “Nkịta gbọchaa agbọ, ọ laghachi rachaa ihe ọ gbọrọ.” “A sachaa ezi ahụ, ya eburu onwe ya tụnye nꞌunyi.”

MATIU 23:1-29
[1] Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ nile na ndị na-eso ụzọ ya okwu sị,[2] “Ndị ozizi iwu na ndị Farisii bụ ndị e nyere ike ịkọwa iwu Mosisi.[3] Ya mere, meenụ ihe nile ha si unu mee. Ma nke kachasị nke, unu esokwala omume ha. Nꞌihi na adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ.[4] Ha na-ebokwasị unu iwu nke mmadụ na-apụghị idebe, ma ha onwe ha adịghị agbalị idebe iwu ndị a.[5] “Ihe nile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ too ha. Ha na-ejegharị dị ka ndị dị nsọ. Leenụ ka igbe ha kekwasịrị nꞌegedege ihu ha na nꞌaka ha siri buo ibu. Igbe ebe ha tinyere amaokwu ha depụtara site nꞌakwụkwọ nsọ![6] Ha hụrụ ịnọdụ nꞌisi oche nꞌoge oriri nꞌanya.[7] Ọ na-atọ ha ụtọ mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche, nꞌakụkụ ụzọ ma ọ bụ nꞌahịa. Ọ na-atọkwa ha ụtọ mgbe a na-akpọ ha ‘Onye ozizi, Onye ozizi.’[8] Unu ekwela ka onye ọ bụ kpọọ unu aha dị otu a. Nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke bụ onye ozizi unu nwere. Unu nile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu.[9] Unu akpọkwala onye ọ bụla nꞌụwa a Nna, nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke dị nꞌeluigwe ka unu nwere dị ka Nna unu.[10] Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nꞌihi na ọ bụ nanị otu onyendu ka unu nwere, onye bụ Onye nzọpụta ahụ.[11] “Onye dị ukwuu nꞌetiti unu kwesịrị ịbụ onye na-ejere unu ozi.[12] Ma onye ọ bụla mere onwe ya onwe ukwu ka a ga-eweda nꞌala. Ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.[13] “Ahụhụ dịrụ unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha gasi bata nꞌalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata, unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ịbata. Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-eme dị ka ndị dị nsọ site nꞌikpe ogologo ekpere nꞌakụkụ ụzọ nile ka mmadụ hụ unu. Ma unu na-eripịa akụ dị nꞌụlọ ndị inyom di ha nwụrụ. Unu ga-anata ikpe ọmụma.[14] ***[15] Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-agbalsị ike nꞌụzọ nile, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee onye ahụ ka ọ jọọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.[16] Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru isi! Nꞌihi na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla jiri ụlọ nsọ ukwu Chineke ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla jiri ọlaedo dị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ ṅụọ iyi kwesịrị imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’[17] Ndị nzuzu kpuru isi! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọ nsọ ahụ e debere ya ime ya ka ọ bụrụ ihe dị nsọ?[18] Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ nụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla ga-eji onyinye dị nꞌelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ nụrụ.’[19] Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ̀ bụ onyinye dị nꞌelu ebe ịchụ aja ka ọ̀ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ?[20] Ya mere, mgbe onye ọ bụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nꞌelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ.[21] Otu a kwa, onye ji ụlọ nsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọ nsọ ahụ na Chineke bi nꞌime ya na-aṅụ iyi.[22] Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nꞌelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.[23] “Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa.[24] Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda inyinya![25] “Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nꞌike na ọchịchọ ọjọọ nile.[26] “Gị onye ìsì na-akpọ onwe gị onye Farisii! Buru ụzọ mee ka ime iko na efere gị dị ọcha, mgbe ahụ ha ga-adị ọcha ihu na azụ.[27] “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe mara mma, ma ime ha jupụtara nꞌọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe rere ure nile.[28] Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie.[29] “Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-ewu ili ndị amụma ahụ nna unu ha gburu, na-atụkwasị okoko osisi nꞌili ahụ e liri ndị ezi omume ahụ nna unu ha gburu.

Igbo Bible 1988
No Data