A A A A A

Chọọchị: [Diakon]


1 TIMỌTI 3:1-13
[1] Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ.[2] Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.[3] ***[4] Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinụlọ nke aka ya nke ọma. Onye nwere ụmụ ndị dị nwayọọ na ndị na-asọpụrụ ya.[5] Nꞌihi na ọ bụrụ na nwoke enweghị ike chịkọtazie ezinụlọ ya ọ̀ ga-esi aṅaa chịzie ụlọ chọọchị Chineke.[6] Onye a ga-enye ụdị ọrụ a agaghị abụ onye nabatara Kraịst ọhụrụ, nꞌihi na ọnọdụ dị elu a pụrụ ime ka o bido ịnya isi. Unu maara na ịnya isi nwere ike ibutere ya ịla nꞌiyi. Dị ka ekwensu si welie onwe ya elu, ma Chineke chụpụrụ ya.[7] Onye a ga-enye ọnọdụ a aghaghị ịbụ onye ndị na-abụghị ndị Kraịst na-agba ezi ama banyere, ka ekwensu hapụ isiste nꞌọnụ ndị a boo ya ebubo ga-eme ka ọ ghara inwe nkwuwa okwu ịchịzi ndị nọ nꞌokpuru ya.[8] Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị omume ha dị mma na ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị hụrụ ego nꞌanya.[9] Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.[10] Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.[11] Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.[12] Ndị nile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinụlọ nke aka ha nke ọma.[13] Nꞌihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkuwa okwu ha nwere banyere okwukwe ha nꞌime Kraịst Jisọs.

FILIPAI 1:1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Jisọs Kraịst na-abịara ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị isi nile nọ nꞌụlọ nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Filipai. Anyị na-edekwa ya nye ndị nile kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

ỌLU OZI 6:1-7
[1] Nꞌoge ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, esemokwu dapụtara nꞌetiti ndị kwere ekwe na-asụ asụsụ Griik na ụmụnna ha ndị Juu. Esomokwu a dapụtara nꞌihi na ụfọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ adịghị eketa nri kwesịrị ịbụ nke ha oge nile a na-eke ya.[2] Nꞌihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ nzukọ ndị nile kwere ekwe sị ha, “O zighị ezi na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma Chineke bido na-eke nri.[3] Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka.[4] Ma anyị ga-ewerekwanụ ọrụ ikpe ekpere, na ọrụ nile metụtara izisa ozi ọma.”[5] Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya.[6] Ha kpọtaara ndị ozi mmadụ asaa ndị a ha họpụtara. Ndị ozi kpeere ha ekpe, bikwasịkwa ha aka nꞌisi.[7] Okwu Chineke gbasara. Ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe bakwara ụba. Nꞌoge a ọtụtụ ndị nchụaja nabatara Jisọs Kraịst.

ROM 16:1
Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị nwanyị, Fibi, ezi onye Kraịst si na chọọchị dị nꞌobodo Sinkria, ga-abịa ịhụ unu na Rom na mgbe na-adịghị anya site ugbu a.

TAITỌS 1:7
Ebe ndị isi chọọchị a ga-abụ ndị na-elekọta ọrụ Chineke, ha ga-abụ ndị mmadụ na-apụghị ibo ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Ha agaghị abụ ndị nganga, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị isi ike, ndị na-alụ ọgụ nꞌihi ịṅụbiga mmanya oke, ndị hụrụ ego nꞌanya.

ỌLU OZI 6:3
Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka.

JỌN 8:32
Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.”

EFESỌS 4:11
Ọ bụkwa ya nyere ndị mmadụ onyinye. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ ndị ozi, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị amụma, ndị ọzọ onyinye ikwusa ozi ọma, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ụkọchukwu, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ozizi.

ỌLU OZI 20:28
“Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha.

JỌN 6:54
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.

MAK 6:3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.

1 KỌRINT 12:28
Nke a bụ ụfọdụ nꞌime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị bụ ahụ Kraịst: ndị ozi, ndị amụma, ndị nkụzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe nile nꞌusoro, na ndị na-asụ aụsụ dị iche iche.

GALETIA 1:19
Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs.

HIBRU 13:17
Ruberenụ ndị isi unu isi. Gbalịanụ ime ihe ha gwara unu. Nꞌihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụ obi unu. Chineke ga-ekpekwa ha ikpe dị ka ọrụ ha si dị. Ruberenụ ha isi ka ha nwee obi aṅụrị ịrụ ọrụ ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha ejiri ihu mgbarụ rụọ ọrụ ha, ọrụ ha agaghị abara unu uru.

JỌN 3:3-5
[3] Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”[4] Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”[5] Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.

HIBRU 12:14
Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.

ỌLU OZI 6:4
Ma anyị ga-ewerekwanụ ọrụ ikpe ekpere, na ọrụ nile metụtara izisa ozi ọma.”

1 TIMỌTI 3:1-7
[1] Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ.[2] Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.[3] ***[4] Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinụlọ nke aka ya nke ọma. Onye nwere ụmụ ndị dị nwayọọ na ndị na-asọpụrụ ya.[5] Nꞌihi na ọ bụrụ na nwoke enweghị ike chịkọtazie ezinụlọ ya ọ̀ ga-esi aṅaa chịzie ụlọ chọọchị Chineke.[6] Onye a ga-enye ụdị ọrụ a agaghị abụ onye nabatara Kraịst ọhụrụ, nꞌihi na ọnọdụ dị elu a pụrụ ime ka o bido ịnya isi. Unu maara na ịnya isi nwere ike ibutere ya ịla nꞌiyi. Dị ka ekwensu si welie onwe ya elu, ma Chineke chụpụrụ ya.[7] Onye a ga-enye ọnọdụ a aghaghị ịbụ onye ndị na-abụghị ndị Kraịst na-agba ezi ama banyere, ka ekwensu hapụ isiste nꞌọnụ ndị a boo ya ebubo ga-eme ka ọ ghara inwe nkwuwa okwu ịchịzi ndị nọ nꞌokpuru ya.

1 TIMỌTI 2:12
Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.

ỌLU OZI 14:23
Pọl na Banabas họpụtakwara ndị okenye nꞌime nzụkọ Kraịst dị nꞌebe ahụ. Ha sitere nꞌobubu ọnụ na ekpere tinye ha na nlekọta Onyenwe anyị, onye ha tụkwasịrị obi.

1 TIMỌTI 5:17
O kwesịrị ka akwụọ ndị ụkọchukwu na-arụzi ọrụ ha ụgwọ dị mma, nke kwesịrị ọrụ ha na-arụ. O kwesịkwara ka a na-enye ha nsọpụrụ ruru ha, karịsịa, ndị ahụ na-arụsị ọrụ ike ikwusa na izi okwu Chineke.

HIBRU 13:7
Chetanụ ndị isi unu ndị wetaara unu ozi ọma Chineke. Ha bụ mkpụrụ ndụ ọma ahụ. Unu ga-ejekwa ije na nzọ ụkwụ ha, tụkwasịkwa Chineke obi dị ka ha mere.

TAITỌS 1:8
Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.

1 PITA 5:2
Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.

TAITỌS 1:6
Ndị isi chọọchị ọ bụla ị ga-ahọpụta ga-abụ ndị a maara nke ọma dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị ụmụ ha kwa bụ ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya, nke ndị mmadụ na-agbara akaebe dị mma na ha abụghị ụmụ naebi ndụ ọjọọ, na ndị na-adịghị erube isi.

1 TIMỌTI 5:22
Ebikwasịkwala onye ọ bụla aka nꞌisi ọsịịsọ ime ya okenye ma ọ bụ onye na-eje ozi. Nꞌihi na ị pụrụ ilefu mmehie ya anya. Nke a pụkwara ime ka ọ dị ka ị naakwagide mmehie ha. Hụ na gị onwe gị wezugara onwe gị nꞌebe mmehie nile dị.

TAITỌS 1:5
Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ọ bụla dị mkpa nꞌusoro nke ga-enyere ụlọ nzụkọ dị nꞌebe ahụ aka. Ahapụkwara m gị ka ị họpụta ndị isi chọọchị nꞌobodo ahụ nile, ndị ga-eme ihe m nyere gị nꞌiwu.

GALETIA 4:19
Ezi ụmụ m, lee ka omume unu si ewute mmụọ m. Lee ka m si nọdụkwa nꞌọnọdụ ihe mgbu, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka unu zuo oke nꞌime Kraịst, dị ka nwanyị nọ nꞌihe mgbu si eche ọmụmụ nwa ọhụrụ ya.

Igbo Bible 1988
No Data