A A A A A

Chọọchị: [Mkpagbu Church]


ỌLU OZI 8:1
Sọl kwenyere ka e gbuo Stivin. Nꞌụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Mkpagbu a mere ka ndị kwere ekwe site na Jerusalem gbapụ. Ha gbaara ọsọ gbaga obodo ndị ọzọ dị iche iche dị na Judia na Sameria. Ọ bụkwa nanị ndị ozi Kraịst fọdụrụ na Jerusalem.

MATIU 5:44
Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.

2 TIMỌTI 3:12
Nꞌezie, ndị nile chọrọ ime ihe ga-atọ Kraịst Jisọs ụtọ, site nꞌibi ndụ ịsọpụrụ Chineke, ga-ahụ ahụhụ site nꞌaka ndị iro Kraịst.

JỌN 15:20
Unu chetakwa ihe m gwara unu malite na mbụ, na ohu adịghị ukwuu karịa onyenwe ya. Nꞌihi nke a ebe ụwa kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ha agaghị erube isi nꞌokwu unu, nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌihe m ziri ha.

NKPUGHE 2:10
Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ.

ROM 8:35
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!

MATIU 5:11
“Ndị a gọziri agọzi ka unu bụ ma ọ bụrụ na a na-ata unu ụta, na-esogbu unu, ma na-ekwukwa okwu ụgha megide unu nꞌihi m.

ROM 12:14
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere.

JỌN 5:16
Nꞌihi nke a ndị Juu sogburu Jisọs, chọsiekwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Nꞌihi na ọ dịghị asọpụrụ ụbọchị izuike ha.

MATIU 5:10-12
[10] Ndị a na-akpagbu nꞌihi ezi omume ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.[11] “Ndị a gọziri agọzi ka unu bụ ma ọ bụrụ na a na-ata unu ụta, na-esogbu unu, ma na-ekwukwa okwu ụgha megide unu nꞌihi m.[12] Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ.

2 KỌRINT 12:10
Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.

ỌLU OZI 13:50
Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ kpalịrị obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke tinyere ndị isi obodo ahụ. Ha sitere nꞌọgbakọ ọjọọ ndị a megide Pọl na Banabas, chụpụ ha site nꞌobodo ahụ.

ỌLU OZI 7:52
Kpọọ onye amụma ahụ aha nke nna nna unu na-akpagbughị! Ha gburu ndị ahụ buru amụma banayere ọbịbịa onye ezi omume ahụ, bụ Onye nzọpụta ahụ unu raara nye, onye e gbukwara.

MAK 4:17
Ma okwu ahụ ha nụrụ adabanyeghị nke ọma nꞌala ala obi ha ọ dịghị anọgidekwa. Ya mere, mgbe nsogbu na mkpagbu bidoro nꞌihi ime ihe ahụ ha nụrụ na Chineke chọrọ ka ha mee, ha na-akwụsị.

GALETIA 4:29
Nꞌihi nke a, anyị ndị e sitere na Mmụọ Nsọ mụọ ka ndị chọrọ ka anyị soro ha na-edebe iwu na-emegbu, na-esogbukwa, dị ka Ishmel nwa Hega, nwanyị ohu, si megbuo, ma sogbuokwa Aịzik.

MAK 10:30
nke na-agaghị anataghachikwa nꞌụwa a, ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ndị nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nꞌụwa ọzọ.

MATIU 13:21
Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara nꞌime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara nꞌihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa.

ỌLU OZI 22:4
Akpagburu m ndị nile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nꞌaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nụlọ mkpọrọ.

MATIU 5:10
Ndị a na-akpagbu nꞌihi ezi omume ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.

GALETIA 6:12
Ndị ozizi ahụ na-abịakwute unu, na-agbalị iduhie unu ka e bie unu ugwu, na-eme ya nꞌihi otu ihe. Ha chọrọ ka ndị mmadụ mara ha, ka ha si otu a gbanarị mkpagbu a gaara akpagbu ha, ma ọ bụrụ na ha kwusaa sị na ọ bụ obe Kraịst nanị nwere ike ịzọpụta anyị.

LUK 21:12
“Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m.

MAK 10:29-30
[29] Jisọs zara ya sị, “Ana m agwa gị eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya, ụmụnne ya nwoke, ụmụnne ya nwanyị, nne ya, nna ya, ụmụ ya, na ala ubi ya nꞌihi m, na nꞌihi ozi ọma a,[30] nke na-agaghị anataghachikwa nꞌụwa a, ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ndị nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nꞌụwa ọzọ.

ROM 8:35-37
[35] Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba![36] Nꞌihi na akwụwkọ nsọ na-agwa anyị sị, “Ọ bụ nꞌihi gị, Chineke, ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị nile. A na-ele anyị anya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.”[37] Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị.

ỌLU OZI 11:19-21
[19] Ndị kwere ekwe ahụ nile sitere Jerusalem gbapụ nꞌoge ahụ mkpagbu ahụ bidoro, mgbe a tụgburu Stivin na nkume, gara nꞌihu na-agbasa ozi ọma. Ụfọdụ ha gara Fonisia na Saiprọs na Antiọk. Ma ọ bụ nanị ndị Juu ka ha na-ekwusara ozi ọma ahụ.[20] Otu ọ dị, ụfọdụ zisakwaara ndị Griik ozi ọma. Ụfọdụ ndị a sitere nꞌobodo Saiprọs na Sirini gaa nꞌobodo a na-akpọ Antiọk kwusaa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs.[21] Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha nile. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ sitere nꞌetiti ndị mba ọzọ chegharịa kwere nꞌOnyenwe anyị.

ỌLU OZI 9:4-5
[4] Sọl dara nꞌala, nụ olu na-akpọ ya oku sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m?”[5] Sọl zara sị, “Onyenwe anyị ị bụ onye?” Olu ahụ zaghachiri sị, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu!

GALETIA 5:11
Ụfọdụ mmadụ dị ndị na-asị na m na-ekwusa na-asị na ibi mmadụ ugwu na idebe omenala ndị Juu dị mkpa tupuu azọpụta mmadụ. Ọ bụrụ nꞌezie na m na-ekwusa ihe dị otu a, agaghị m abụ onye a na-akpagbu, nꞌihi na ụdị okwu dị otu a adịghị ewetara onye na-ekwusa ya nsogbu. Ma ebe ọ bụ na a na-akpagbu m, o gosiri na ihe m na-ekwusa bụ na nzọpụta dị nanị site nꞌokwukwe nꞌobe Kraịst.

MATIU 10:23
“Ọ bụrụ na ndị mmadụ esogbuo unu nꞌotu obodo gbaranụ ọsọ gaa nꞌobodo ọzọ. Unu agaghị agazucha obodo ndị a nile tupu m lọghachi.

MATIU 5:12
Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ.

1 TIMỌTI 1:13
Ọ bụ ezie na nꞌoge gara aga ekwuru m okwu ọjọọ megide Kraịst, meekwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ihere. Ma Chineke meere m ebere nꞌihi na amataghị m ihe m na-eme mgbe m na-eme ihe ndị a. Nꞌihi na amaghị Kraịst nꞌoge ahụ.

MATIU 5:11-12
[11] “Ndị a gọziri agọzi ka unu bụ ma ọ bụrụ na a na-ata unu ụta, na-esogbu unu, ma na-ekwukwa okwu ụgha megide unu nꞌihi m.[12] Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ.

LUK 11:49
“Ọ bụ nꞌihi nke a ka Chineke jiri kwuo okwu sị, ‘Aga m ezitere unu ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgbu.’

1 TESALỌNAIKA 3:3-4
[3] Ka unu hapụ ịda mba nꞌihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nsogbu dị otu a bụ ihe Chineke zubere nye anyị.[4] Nꞌihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a ihe anyị kwuru emezuola.

HIBRU 11:36-38
[36] E mere ụfọdụ ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti. A tụrụ ndị ọzọ mkpọrọ. Ma ha nọgidesịrị ike bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.[37] A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa, bụrụ ndị a na-amaghị ama. A kpagbukwara ụfọdụ.[38] Ha wagharịrị nꞌọzara na nꞌugwu, nꞌọnụ nkume na nꞌọnụ ala. Agụụ, ahụ ọkụ, na mmekpa ahụ dị iche iche dịgidere ha nꞌahụ. Nꞌanya ụwa a gụrụ ha nꞌihe efu.

JỌN 15:20-21
[20] Unu chetakwa ihe m gwara unu malite na mbụ, na ohu adịghị ukwuu karịa onyenwe ya. Nꞌihi nke a ebe ụwa kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ha agaghị erube isi nꞌokwu unu, nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌihe m ziri ha.[21] Ee, ha ga-eme unu ihe nile ndị a nꞌihi na unu bụ ndị nke m, na nꞌihi na ha amaghị Onye ahụ zitere m.

MATIU 10:21-23
[21] “Nwanne ga-agbagide nwanne ya ama, mee ka ọ nwụọ. Ndị bụ nna ga-ararakwa ụmụ ha nye. Ụmụ ga-ebili imegide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ.[22] Ụmụ mmadụ ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ma ndị nile ga-anọgide nꞌokwukwe ha ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.[23] “Ọ bụrụ na ndị mmadụ esogbuo unu nꞌotu obodo gbaranụ ọsọ gaa nꞌobodo ọzọ. Unu agaghị agazucha obodo ndị a nile tupu m lọghachi.

MATIU 24:8-10
[8] Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalịte ịta ahụhụ nke ga-abịa.[9] “Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m.[10] Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị.

LUK 21:12-19
[12] “Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m.[13] Ma oge a bụ oge unu ga-eji gbaa ama banyere m.[14] Kpebienụ nꞌobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.[15] Nꞌihi na aga m enye unu okwu amamihe unu ga-ekwu, ụdị amamihe na okwu nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike imegide ma ọ bụ imeri.[16] Ọ bụladị ndị mụrụ unu na ndị ikwu unu na ndị enyi unu ga-enyefe unu nꞌaka ndị ga-ekpe unu ikpe. A ga-egbukwa ụfọdụ nꞌime unu.[17] Mmadụ nile ga-akpọ unu asị nꞌihi m.[18] Ma chetanụ na otu agịrị isi dị nꞌisi unu agaghị efu.[19] Kama tachienụ obi, nwee ndidi, nꞌihi na ọ bụ otu a ka unu ga-esi zọpụta ndụ unu.

1 KỌRINT 4:8-13
[8] Ndụ unu na-ebi na-egosi na echiche unu bụ na unu enwezuola ihe nile dị unu mkpa. Ee, unu na-ebi ndụ dị ka ndị afọ juru nꞌihe nke Mmụọ. Unu na-ebi ndụ dị ka ndị eze, ndị nọkwasịrịla nꞌocheeze ha, ma anyị onwe anyị nọ nꞌezi. Nꞌezie, ọ gaara atọ ma a sị na unu anọrọla nꞌocheeze unu, nꞌihi na mgbe oge ịnọ nꞌocheeze ruru, ghọtanụ na anyị onwe anyị ga-anọkwa nꞌebe ahụ, iso unu ịchị achị.[9] Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka Chineke na-eme ka anyị bụ ndị ozi bụrụ ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta nanị mgbe ihe nile na-agwụsị agwụsị. Anyị dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ, ndị a na-akpọpụta nꞌihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.[10] Okwukwe anyị kwere na Kraịst emeela ka anyị ghọọ ndị nzuzu nꞌihu unu, ma unu onwe unu bụkwa ndị Kraịst maara ihe! Lee ka anyị si bụrụ ndị na-adịghị ike, mgbe unu na-awụgharị dị ka agụ. Lee ka anyị si bụrụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-agụ dị ka ndị na-abaghị uru, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ![11] Tutuu ruo ugbu a anyị na-ebu ọnụ nꞌihi ahụghị ihe anyị ga-eri. Anyị na-ejegharị na-arụ ọrụ nꞌọnọdụ akpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.[12] Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.[13] Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutuu ruo ugbu a a na-emeso anyị mmeso dị ka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dị ka ihe a jụrụ ajụ nꞌanya ndị ụwa.

HIBRU 10:32-34
[32] Ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ka unu chefuo ụbọchị ndị ahụ gara aga. Nꞌoge ahụ ìhè Chineke mụkwasịrị unu, unu guzosikwara ike ọ bụladị nꞌọnọdụ mkpagbu.[33] Mgbe ụfọdụ a kparịrị unu nꞌihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nꞌoge ọzọ unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso guzokọọkwa.[34] Unu sooro ndị ha tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụkọọ ahụhụ. Mgbe ha na-apụnara unu akụ unu na ihe obibi unu nile unu jiri obi ụtọ nꞌime Onyenwe anyị nara nke a. Nꞌihi na unu maara na unu nwere akụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

HIBRU 11:33-38
[33] Okwukwe ka ha jiri merie mba dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri bie ndụ ezi omume, nata nkwa dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri meekwa ka ike ọdụm ghara ịdị ire.[34] Ọ bụkwa okwukwe ka ha jiri nọọ nꞌime ọkụ na-enweghị mmerụ ahụ. Okwukwe ka ọtụtụ jiri gbanarị ọnwụ. Okwukwe ka ndị dara mba jiri dịrị ike, meekwa ka ụmụ ndị iro dị ike gbalaga.[35] Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.[36] E mere ụfọdụ ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti. A tụrụ ndị ọzọ mkpọrọ. Ma ha nọgidesịrị ike bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.[37] A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa, bụrụ ndị a na-amaghị ama. A kpagbukwara ụfọdụ.[38] Ha wagharịrị nꞌọzara na nꞌugwu, nꞌọnụ nkume na nꞌọnụ ala. Agụụ, ahụ ọkụ, na mmekpa ahụ dị iche iche dịgidere ha nꞌahụ. Nꞌanya ụwa a gụrụ ha nꞌihe efu.

ỌLU OZI 12:1-19
[1] Nꞌoge ahụ, eze Herọd bidoro ịkpagbu ndị nile na-akpọku aha Onyenwe anyị.[2] O nyere iwu ka e gbuo Jemes, otu nꞌime ndị ozi Kraịst. Jemes bụkwa nwanne Jọn.[3] Mgbe Herọd chọpụtara na ọtụtụ ndị isi Juu kwagidere omume ya, o jidekwara Pita nꞌoge mmemme ngabiga,[4] tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, O zipụrụ ndị agha iri na isii ka ha chee ya nche. Ihe Herọd bu nꞌobi bụ ka o nyefee Pita nꞌaka ndị Juu, ka ha gbuo ya mgbe mmemme ngabiga gafere.[5] Ma nzukọ Kraịst ezughị ike site nꞌikpe ekpere nye Chineke. Ha rịọsịrị Chineke arịrịọ ike ka o debe Pita nke ọma nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ.[6] Ma nꞌabalị ahụ na-eso ụbọchị ahụ a ga-egbu ya, Pita, nọ na-arahụ ụra ebe e ji eriri igwe kee ya nꞌụkwụ na aka. E kegidekwara ya nꞌahụ otu onye agha. Ndị nche ọzọ nọkwa ya gburugburu na-eche ya nche.[7] Na mberede, ìhè dị ukwuu nwụrụ nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Mmụọ ozi batara guzo nꞌakụkụ Pita metụ ya aka. Pita tetara nꞌụra. Ọ nụrụ ka mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Pita! Bilie ngwangwa!” Nꞌotu oge ahụ, eriri igwe ahụ dapụrụ nꞌala.[8] Mmụọ ozi ahụ gwara Pita okwu sị, “Kee ihe okike nꞌukwu gi, yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.” Pita mere otu ahụ. Mmụọ ozi ahụ sịkwa ya, “Yirikwa uwe ukwu gi, sokwa m nꞌazu.”[9] Pita sooro mmụọ ozi ahụ nꞌazụ site nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụta. Ma Pita chere na ihe ndị a na-eme na nrọ, ma ọ bụ na ọ bụ ọhụ ka ọ na-ahụ. O kwenyeghị na ihe ndị a nile pụrụ imezu. O jukwara ya anya nke ukwuu.[10] Ha pụtara site nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ dịghị anya, ha bịaruru nꞌogige e ji igwe wuo. Ụzọ dị nꞌebe ahụ meghekwara nꞌonwe ya. Mmụọ ozi ahụ jidekwara Pita nꞌaka tutuu ruo mgbe ha gafesịrị ọnụ ụzọ nile nke ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ha pụtara nꞌezi, mmụọ ozi ahụ hapụrụ Pita aka. Pita ahụkwaghị ya anya ọzọ.[11] Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe nile mere. O kwuru sị, “Nꞌezie, Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya ka ọ bịa napụta m site nꞌaka eze Herọd. Ugbu a ọ napụtakwala m site nꞌọchịchọ ọjọọ nile nke ndị Juu.”[12] Mgbe Pita tụgharịsịrị ihe nile ndị a nꞌobi ya, ọ malitere ịga nꞌụlọ Meri nne Jọn Mak. Ọtụtụ ndị kwere ekwe zukọtara nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere banyere Pita.[13] Mgbe Pita rutere nꞌụlọ ahụ, ọ kụrụ aka nꞌọnụ ụzọ. Ma otu nwagbọghọ a na-akpọ Roda bịara ka o meghee ụzọ ahụ.[14] Mgbe Roda nụrụ olu onye na-akụ aka, mata na ọ bụ olu Pita, o chetakwaghị imeghe ụzọ. Kama ọ gbaara ọsọ laghachi nꞌime ụlọ gwa ndị ọzọ sị, “Ọ bụ Pita na-akụ aka nꞌọnụ ụzọ.”[15] Ma ọ dịghị onye ọ bụla kwenyere nꞌihe o kwuru. Kama ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dị ka onye anya na-adịghị mma. Mgbe Roda nọgidesịrị ike kwuo na ọ bụ Pita, ha zara sị ya, “Eleghị anya ọ ga-abụ mmụọ ozi Pita ka ị hụrụ, nꞌihi na ndị Juu egbuola ya.”[16] Nꞌoge ahụ kwa, Pita kụsịrị aka ike nꞌụzọ. Emesịa, ha meghere ụzọ ahụ. Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Pita nꞌezie, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.[17] Ma Pita feere ha aka ka ha jiri nwayọọ kwuo okwu. Ọ kọọrọ ha ihe nile Onyenwe anyị mere site nꞌaka mmụọ ozi ya. Nꞌikpeazụ, Pita gwara ha sị, “Meenụ ka Jemes na ụmụnna anyị nile mata ihe ndị a.” Ọ hapụrụ ha gaa nꞌebe ọzọ.[18] Nꞌisi ụtụtụ echi ya, ọgba aghara dị nꞌụlọ mkpọrọ ahụ. O jukwara mmadụ nile anya ihe mere Pita.[19] Eze Herọd zigara ndị agha ya nꞌụlọ mkpọrọ ahụ ka ha kpụpụta Pita, ma ha ahụghị ya. Nꞌihi nke a Herọd nyere iwu ka ha jide ndị agha ahụ e tinyere iche Pita nche. E gbukwara ha nile. Emesịa Herọd hapụrụ Juda gaa Sizaria.

ỌLU OZI 9:1-14
[1] Ugbu a, Sọl, onye ume nile ọ na-ekupụta bụ nanị ịba mba na ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi, gara hụ onyeisi nchụaja na Jerusalem.[2] Ọ rịọrọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi a bụ ka nzukọ ndị a nyere Sọl aka ịkpagbu ndị kwere ekwe ọ bụla ọ chọpụtara nꞌebe ahụ, nwoke na nwanyị, ka o kee ha agbụ, kpụta ha na Jerusalem dị ka ndị mkpọrọ.[3] Mgbe Sọl na-aga nꞌụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ìhè chakarịrị ìhè nke anyanwụ siri nꞌelu chaa ya gburugburu.[4] Sọl dara nꞌala, nụ olu na-akpọ ya oku sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m?”[5] Sọl zara sị, “Onyenwe anyị ị bụ onye?” Olu ahụ zaghachiri sị, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu![6] Bilie, baa nꞌime obodo. Nọdụ nꞌebe ahụ tutuu ruo mgbe ị natara ozi m.”[7] Ndị nwoke ha na Sọl so guzoro nꞌebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọ bụla.[8] Sọl biliri ọtọ, chọpụta na ya bụ onye kpuru ìsì. Ndị ya na ha so sekpụụrụ ya nꞌaka tutuu ha abata Damaskọs.[9] Nꞌebe ahụ ka ọ nọrọ abalị atọ, na-ahụghị ụzọ. O rikwaghị nri ọ bụla. Mmiri abakwaghị ya ọnụ.[10] Na Damaskọs ahụ, otu onye kwere ekwe nọ ya. Aha ya bụ Ananayas. Ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ a, Onyenwe anyị kpọrọ ya oku sị, “Ananayas!” Ọ zara sị, “Anọ m nꞌebe a, Onyenwe anyị.”[11] Onyenwe anyị gwara ya okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ a na-akpọ Ama E Guzoziri, chọọ ụlọ nwoke a na-akpọ Judas. Nꞌụlọ nwoke a jụọ ajụjụ banyere nwoke a na-akpọ Sọl onye Tasọs. Ọ nọ nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere.[12] Sọl ahụla ọhụ nke gwara ya na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, na ọ ga-ebikwasị aka nꞌisi ya ka ọ hụ ụzọ.”[13] Ma Ananayas zara sị, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ nile nwoke a mere ndị kwere ekwe bi na Jerusalem![14] Ugbu a, anyị nụrụ na ọ natara ike nꞌaka ndị nchụaja ka ọ bịa nꞌebe a jide onye kwere ekwe ọ bụla nọ na Damaskọs!”

GALETIA 1:13
Amaara m na unu amatala ihe banyere ndụ m nꞌoge gara aga, otu m si bụrụ onye weere onwe ya nye nꞌihi ofufe ndị Juu, na otu m siri sogbuo nzukọ Kraịst nꞌebe nile, ma gbalịsiekwa ike imegide ya.

NKPUGHE 2:8-10
[8] “Degara mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smarna akwụkwọ a. Ozi dị nꞌakwụkwọ a sitere nꞌaka onye ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Onye nwụrụ anwụ ma na-adịkwa ndụ ọzọ.[9] “Amaara m ụzọ nile i si taa ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Ọzọ kwa, amaara m ihe banyere ndọgbu i na-adọgbu onwe gị nꞌọrụ, na ọnọdụ ogbenye gị. Ma nꞌezie, i nwere akụ dị ukwuu nꞌeluigwe. Amaara m ihe banyere nkwutọ nile ndị na-emegide gị na-ekwutọ gị, nkwutọ nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Juu, na ụmụ Chineke, ndị na-abụghị ụmụ Chineke, kama ha bụ ndị na-akwagide ọrụ ekwensu.[10] Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ.

ỌLU OZI 26:9-11
[9] “Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso ndị nile kweere na Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ nile.[10] Etinyere m ọtụtụ ndị na-eso ụzọ a bi na Jerusalem nꞌụlọ mkpọrọ, site nꞌike m natara nꞌaka ndị isi nchụaja. Mgbe a mara ndị ha ikpe ọnwụ, ana m akwagide ka e gbuo ha.[11] Ọtụtụ mgbe atara m ndị na-eso ụzọ a ahụhụ, mekpaa ha ahụ nꞌebe nzukọ ha nile, ime ka ha gọnarị Kraịst. Nꞌihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nꞌobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.

1 KỌRINT 4:12
Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.

ỌLU OZI 12:1
Nꞌoge ahụ, eze Herọd bidoro ịkpagbu ndị nile na-akpọku aha Onyenwe anyị.

FILIPAI 3:6
Igosi na m nwere ịnụ ọkụ nꞌobi dị ukwuu banyere ihe m kwenyere nꞌime ya, emesiri m nzukọ Kraịst ike, kpagbuo ndị nọ nꞌime ya. Agbalịrị m idebezu iwu ndị Juu, bụrụkwa onye a pụrụ ịkpọ onye ezi omume tozuru oke, dị ka idebe iwu ndị Juu si dị.

Igbo Bible 1988
No Data