A A A A A

Chọọchị: [Ọrụ Ndị Nwanyị]


GALETIA 3:28
Ọ dịkwaghị ihe dị iche ugbu a. Nkewa ọ bụla adịkwaghị. A naghị ahụkwa anyị dị ka ndị Juu, ma ọ bụ ndị Griik, ma ọ bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nwere onwe ha, ma ọ bụkwanụ ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị, kama anyị nile bụ ndị nke Kraịst, ndị e jikọtara nꞌotu nꞌime Kraịst Jisọs.

1 TIMỌTI 2:9-15
[9] Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma.[10] ***[11] Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.[12] Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.[13] Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv.[14] Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke.[15] Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke.

1 TIMỌTI 2:12
Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.

1 KỌRINT 11:3
Ma ọ dị otu ihe dị mkpa m chọrọ ichetara unu. Achọrọ m ka unu mata na dị ka Kraịst si bụrụ isi nwoke nile, otu a ka nwoke ọ bụla si bụrụ isi nwụnye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.

LUK 8:1-3
[1] Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gara nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile na-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke. Ndị ozi ya iri na abụọ ahụ sokwa ya.[2] Ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a Jisọs gwọrọ ọrịa na-enye ha nsogbu, onye dị ka Meri Magdalin onye o sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,[3] na Joana nwụnye nwoke a na-akpọ Chuza onye na-elekọta obi eze Herọd na akụ ya nile, na Suzana, na ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ so Jisọs na-egboro ya mkpa ya.

EFESỌS 5:22-33
[22] Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị.[23] Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.[24] Ya mere, dị ka nzukọ Kraịst si edo onwe ya nꞌokpuru Kraịst, otu a ka ụmụ nwanyị nwere di kwesịrị ido onwe ha nꞌokpuru di ha.[25] Unu bụ ndị nwoke na-alụ nwụnye, hụnụ nwụnye unu nꞌanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nꞌanya nwụọ nꞌihi ya.[26] Jisọs Kraịst sitere nꞌọnwụ ya mee ka nzukọ ya dịrị nsọ, site na nsacha nke baptizim na nke okwu Chineke.[27] Ka nzukọ ahụ bụrụ nzukọ jupụtara nꞌebube, na ịma mma, na ịdị ọcha na-enweghị ntụpọ ọ na-enweghibụla.[28] Otu a ka ndị nwoke kwesịrị isi hụ nwụnye ha nꞌanya dị ka ha bụ anụ ahụ ha. Nꞌihi na onye ọ bụla hụrụ nwụnye ya nꞌanya na-ahụ anụ ahụ ya nꞌanya.[29] Mmadụ ọ bụla adịghị nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama ọ na-azụ ya na-edozikwa ya. Nke a bụkwa ihe Kraịst meere anụ ahụ ya bụ chọọchị.[30] Nꞌihi na anyị nile bụ akụkụ anụ ahụ ya.[31] Dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ ụlọ nne na nna ya ka e jikọtaa ya na nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.”[32] Amaara m na okwu a siri ike ịghọta, ma ọ bụ ihe e ji ama atụ banyere njikọta e jikọtara Kraịst na nzukọ ya.[33] Ya mere, ọ dị mkpa na nwoke ga-ahụ nwụnye ya nꞌanya dị ka onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwesịkwara ịsọpụrụ di ya.

1 TIMỌTI 2:11-15
[11] Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.[12] Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.[13] Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv.[14] Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke.[15] Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke.

LUK 10:38-42
[38] Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gakwara nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Emesịa, ha rutere obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata bi. Nwanyị a nabatakwara ha nꞌụlọ ya.[39] Mgbe Jisọs batara nꞌụlọ ahụ nọdụ ala, Meri nwanne Mata, bịara nọdụ nꞌala na-ege ntị nꞌihe Jisọs na-ekwu.[40] Mgbe ihe ndị a na-eme, Mata nọrị na-agbalị ikwado nri Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-eri. Ọ dịghị anya ọrụ a bidoro ịgbakasị ya ahụ nꞌihi na ọ bụ ọrụ dị ukwuu. Mgbe Mata na-enweghị ike idi ịrụ ọrụ a nanị ya, ọ pụtara jụọ Jisọs sị, “Onyenwe m, ọ̀ dị mma na Meri ga-ahapụrụ nanị m ọrụ ndị a nile? Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.”[41] Ma Jisọs zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-atụfu nnọọ oge ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ dị iche iche.[42] Ma ọ bụ nanị otu ihe dị mkpa nꞌụwa, Meri nwanne gị achọtala ihe ahụ. Agaghị m anapụkwa ya ihe ahụ ọ chọtara!”

TAITỌS 2:3-5
[3] Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.[4] Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya.[5] Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.

1 KỌRINT 11:2-16
[2] Ọṅụ juru m obi nꞌihi na unu na-echeta m na nꞌihi na unu na-eme ihe m ziri unu.[3] Ma ọ dị otu ihe dị mkpa m chọrọ ichetara unu. Achọrọ m ka unu mata na dị ka Kraịst si bụrụ isi nwoke nile, otu a ka nwoke ọ bụla si bụrụ isi nwụnye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.[4] Nwoke ọ bụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi ihe na-eme Kraịst onye bụ isi ya ihe ihere.[5] Ma nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi okwu Chineke, ma o kpuchighị isi ya, na-eme di ya ihe ihere, nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌebe nwanyị a na nwanyị kpụchara isi ya nọ.[6] Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.[7] Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke.[8] E si na nwoke kee nwanyị mbụ, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.[9] E keghị nwoke mbụ maka nwanyị, ma e kere nwanyị mbụ maka nwoke.[10] Nꞌihi nke a, nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nꞌokpuru di ya, ime ka ndị mmụọ ozi hụ ụdị omume a, site nꞌihi ya ṅụrịa ọṅụ.[11] Ma dị ka nzube Chineke si dị, mkpa nwanyị na-akpa nwoke, mkpa nwoke na-akpa nwanyị.[12] Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwanyị mbụ si na nwoke pụta, ma ọ bụ ụmụ nwanyị na-amụ ụmụ nwoke nile, nwoke na nwanyị nile sitekwara nꞌebe Chineke onye kere ha nọ na-abịa.[13] Achọrọ m ka unu tulee ihe a nꞌonwe unu, ọ̀ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihu ọha mmadụ?[14] Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka Chineke siri mee ya.[15] Nwanyị nwere agịrị isi dị ogologo na-aṅụrị ọṅụ na-anyakwa isi. Akọnuche anyị na-agwakwa anyị na o kwesịrị ka nwanyị na-ekechi isi ya.[16] Ọ bụrụ na ọ dị onye jụrụ ịnabata ozizi a, ọ bụrụkwa na onye ahụ achọọ ịrụ ụka, nanị ihe m maara bụ na anyị, na chọọchị nile, adịghị ezi ihe ọ bụla karịa na nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ nke na-ekwusa ozi ọma nꞌebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ikechi isi ya.

ỌLU OZI 18:26
Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya duru ya gaa nꞌụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe nile banyere Ụzọ Chineke.

1 KỌRINT 14:33-35
[33] Nꞌihi na Chineke abụghị onye na-achọ ka ihe nile na-aga aghara aghara. Chineke chọrọ ka ihe nile na-aga nꞌusoro nꞌime chọọchị nile nke ndị ya.[34] Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke.[35] Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị.

1 TIMỌTI 2:11
Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.

EFESỌS 5:22-24
[22] Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị.[23] Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.[24] Ya mere, dị ka nzukọ Kraịst si edo onwe ya nꞌokpuru Kraịst, otu a ka ụmụ nwanyị nwere di kwesịrị ido onwe ha nꞌokpuru di ha.

ROM 16:1
Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị nwanyị, Fibi, ezi onye Kraịst si na chọọchị dị nꞌobodo Sinkria, ga-abịa ịhụ unu na Rom na mgbe na-adịghị anya site ugbu a.

TAITỌS 2:4-5
[4] Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya.[5] Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.

EFESỌS 5:22
Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị.

1 TIMỌTI 5:14
Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.

MATIU 27:55-56
[55] Ọ dị ọtụtụ ụmụ nwanyị si Galili soro Jisọs na-enyere ya aka. Ha nọ ebe dị anya na-ele ya anya nꞌelu obe.[56] Nꞌime ha bụ Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Josef, na nne Jemes na Jọn bụ ụmụ Zebedi.

1 KỌRINT 14:34-35
[34] Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke.[35] Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị.

ROM 16:7
Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ndị ozi nile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.

EFESỌS 5:21
Sọpụrụnụ Chineke site nꞌido onwe unu nꞌokpuru ibe unu.

TAITỌS 2:1
Ma gị onwe gị Taịtọs, ahapụkwala ịkụzi eziokwu ahụ ya na ịbụ onye Kraịst so.

1 KỌRINT 11:7
Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke.

1 TIMỌTI 2:13-14
[13] Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv.[14] Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke.

1 TIMỌTI 3:2
Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.

1 TIMỌTI 3:11
Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.

EFESỌS 5:23
Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.

TAITỌS 2:3
Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma.

1 PITA 3:7
Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu.

KỌLỌSI 3:18-19
[18] Unu bụ ụmụ nwanyị nwere dị, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu nꞌihi na nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst.[19] Ma unu ndị bụ di, unu enwela obi ilu nꞌebe nwụnye unu nọ, kama na-ahụnụ ha nꞌanya.

1 PITA 3:1-7
[1] Unu ndị inyom nwere di na-eruberenụ di unu isi nꞌihi na ọ bụ site na mmeso unu na-emeso ha ka ndị na-ekweghị nꞌokwu Chineke nwere ike ikwere.[2] Ndụ ọma unu na-ebi pụrụ ime ka ha chegharịa karịa okwu ọnụ ọ bụla unu ga-agwa ha.[3] Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla.[4] Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke.[5] Nke a bụ ụdị ịma mma a hụrụ na ndụ ndị inyom ihe ha dị Chineke mma na mgbe ochie. Ndị inyom tụkwasịrị Chineke obi, na ndị echiche ha na nzube di ha dakọtara.[6] Nke a bụ ihe Sera nꞌonwe ya mere. O doro onwe ya nꞌokpuru di ya bụ Eberaham, sọpụrụ ya dị ka nna nwe ụlọ. Ugbu a ọ bụrụ na unu emee otu a, unu na-agbaso nzọ ụkwụ Sera dị ka ụmụ na-eme ezi ihe. Mgbe ahụ ịtụ egwu agaghị adịrị unu na unu ga-emejọ di unu.[7] Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu.

1 KỌRINT 14:34
Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke.

KỌLỌSI 4:15
Keleerenụ m ụmụnna anyị ndị bi na Laodisia na nwanna anyị nwoke Nimfas na chọọchị na-ezukọ nꞌụlọ ya.

FILIPAI 4:2-3
[2] Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, ha kwụsị ise okwu.[3] Ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, sị gị biko, nyere ụmụ nwanyị a aka idozi okwu ha, nꞌihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, sorokwa ndị ọzọ mụ na ha rụkọrọ ọrụ rụọ ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data