A A A A A

Chọọchị: [Inye otu ụzọ n'ụzọ iri]


MATIU 5:17
“Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.

MATIU 6:21
***

MATIU 23:23
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa.

ROM 2:29
É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ.

ROM 12:1
Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.

MAK 12:41-44
[41] Emesịa, Jisọs gara nọdụ ala nꞌebe ọ ga-anọ na-ahụ ndị mmadụ mgbe ha na-etinye onyinye ha nꞌime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara tụnye ego buru ibu.[42] Ma otu nwanyị batara. Ọ bụ ogbenye, bụrụkwa onye di ya nwụrụ. Ọ tụnyere mkpụrụ ego ọla abụọ ntakịrị nke ruru otu kobo.[43] Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nwanyị ahụ atụnyela ego dị ukwuu karịa ndị nile tụnyere ego nꞌime igbe onyinye a.[44] Nꞌihi na ndị ọzọ sitere nꞌịba ụba nke ego ha nwere tụnye, ma nwanyị a tụnyere ego nile o nwere nꞌụlọ ya.”

ROM 3:21-31
[21] Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a.[22] Chineke ekwuola na ya ga-anabata anyị, gụọ anyị na ndị na-emeghị mmehie, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jisọs Kraịst. Chineke na-anabatakwa ndị nile kweere na Kraịst na-ajụghị ajụjụ ma ha bụ ndị Juu ma ọ bụkwanụ ndị mba ọzọ.[23] Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.[24] Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị.[25] Nꞌihi na Chineke zitere Kraịst ka ọ bụrụ aja a chụrụ nꞌihi ikpuchi mmehie anyị, ka ọbara Kraịst na okwukwe anyị nwere nꞌime ya bụrụ ihe ịjụrụ obi nye ya maka mgbaghara mmehie. Chineke sitere nꞌụzọ a mee ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ebe o sitere na ntachi obi ya hapụ ịta ndị ahụ mehiere megide ya nꞌoge mgbe ochie ahụhụ.[26] Ugbu a, Chineke na-anabata ndị mmehie site nꞌụzọ a igosikwa na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ahụ na-agụ ndị nile nwere okwukwe nꞌime Jisọs dị ka ndị na-emeghị mmehie.[27] Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst.[28] Ya mere Chineke zọpụtara anyị nꞌihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ bụghị nꞌihi na anyị mere ihe iwu kwuru.[29] Chineke ọ na-azọpụta nanị ndị Juu? Mba! Nꞌihi na Chineke bụkwa Chineke ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabatakwa ndị mba ọzọ bụ ndị bịakwutere ya site nꞌokwukwe nꞌime Kraịst.[30] Nꞌihi na dị ka Chineke si emeso ndị Juu omume, otu a ka o si emesokwa ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabata ndị Juu nile kweere na Kraịst, nabatakwa ndị mba ọzọ site nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs Kraịst.[31] Ọ bụrụ na Chineke na-anabata anyị site nꞌokwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na iwu adịkwaghị mkpa? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesịrị ya.

ROM 8:4
Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ.

Igbo Bible 1988
No Data