A A A A A

Chọọchị: [Na-asụ Asụsụ]


1 KỌRINT 1:5
Nꞌihi na Chineke emeela ka unu baa ụba nꞌụzọ nile, ebe ọ bụ na unu na Kraịst bụ otu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu nile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwuwapụta okwu banyere ozi ọma ya.

ỌLU OZI 2:4
E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.

ỌLU OZI 19:6
Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nꞌasụsụ dị iche iche, buokwa amụma.

GALETIA 5:22
Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na

MAK 16:17
“Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche.

1 KỌRINT 14:2
Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị.

1 KỌRINT 14:23
Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri?

1 KỌRINT 14:27-28
[27] A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu nꞌime chọọchị, ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nꞌotu nꞌotu nꞌusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nꞌebe ahụ.[28] Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịtaa ya.

1 KỌRINT 12:8-11
[8] Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ.[9] Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.[10] Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.[11] Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma.

1 KỌRINT 13:1-13
[1] A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme.[2] A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla.[3] A sịkwa na m ewere ihe nile m nwere nye ndị ogbenye, kwerekwa ka e ree m ọkụ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst, ihe ndị a nile abaghị uru, ma ọ bụrụ na m ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya.[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.[5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya.[6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.[7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.[8] Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga.[9] Ugbu a ihe anyị maara adịghị ukwuu, mmụta anyị na amụma anyị na-ebu ezughị oke, nꞌihi na ihe anyị maara bụ nanị nwa ntịị.[10] Ma mgbe e mere ka anyị zuo oke, mgbe ahụ, mkpa nke onyinye ndị a na-ezughị oke na-egboro anyị agaghị adịkwa. Onyinye ndị a ga-agwụsịkwa.[11] Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ.[12] Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a.[13] Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya.

1 KỌRINT 14:1-40
[1] Ka ịhụ mmadụ ibe unu nꞌanya bụrụ ihe na-agụsi unu agụụ ike. Rịọkwanụ Chineke ka o nye unu onyinye nke Mmụọ Nsọ ya na-enye, nke ka nke, onyinye ibu amụma, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke.[2] Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị.[3] Ma onye ahụ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ okwu na-enyere ha aka ito eto nꞌime Onyenwe anyị. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu.[4] Ya mere, nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma na-enyere chọọchị nile aka ito eto nꞌime mmụọ, ma nwoke ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere nanị onwe ya aka.[5] Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu nile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu nile enwee onyinye izisa ozi ọma. Nke a bụ nꞌihi na nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma bara uru karịa nwoke na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, onye nwekwara ike ikọwara chọọchị ihe o kwuru.[6] Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ nke unu na-adịghị anụ, olee uru m baara unu? Ọ baghị uru ọ bụla! Kama ọ bụrụ na m ekwuo okwu nꞌụzọ doro anya, banyere ihe Chineke kpughere gosi m, ma ọ bụ ihe nile m maara, ma ọ bụ ihe gaje ime, ma ọ bụ ozizi nke eziokwu Chineke, nke a ọ̀ gaghị abara unu uru?[7] Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nꞌetiti ihe nile na-enweghị ndụ, ma ha bụ ihe na-eme ụzụ dị ka opi, ma ọ bụ ụbọ akwara. O nweghị onye ga-aghọta ihe onye na-afụ opi na-egbu ma ọ bụ ihe onye na-akpọ ụbọ akwara na-akpọ ma ọ bụrụ na ọ maliteghị ya nke ọma.[8] Ọ bụrụkwa na nwoke na-egbu opi ike egbuzighị ya dị ka o si kwesị, olee otu ndị agha ga-esi mata na agha dị?[9] Nꞌotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nꞌasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Ịgwa mmadụ okwu otu ahụ dị ka mmadụ ichenye ọnụ nꞌezi na-ekwuru ifufe okwu.[10] Asụsụ a na-asụ nꞌụwa a dị ukwuu, ma ha nile bara uru nye ndị na-anụ ha.[11] Ọ bụrụ na mmadụ e jiri otu nꞌime asụsụ ndị a gwa m okwu, aga m abụ ọbịa nꞌebe onye na-asụrụ m asụsụ ahụ m na-adịghị anụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nꞌebe m nọ.[12] Ebe unu na-achọsi ike inwe onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ Chineke elu.[13] Ọ bụrụ na Chineke nyere onye ọ bụla onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ya rịọ Chineke ka o nyekwa ya ike ịkọwa ihe ọ na-ekwu.[14] Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.[15] Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị jirikwa uche kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m ghọtara. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị, jirikwa uche m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m ghọtara, ka m nwee ike ịmata ihe m na-ekwu na ihe m na-abụ nꞌabụ.[16] Nꞌihi na mgbe i ji asụsụ nke ndị ọzọ na-amaghị na-ekpere Chineke ekpere, olee otu ndị nile nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amin?[17] Ọ bụ ezie na ekpere gị ga-ama mma, ma o nyereghị onye ahụ na-anụghị ya aka.[18] Ana m ekele Chineke nꞌihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu nile.[19] Ma mgbe ọ bụla ndị Kraịst zukọrọ nꞌofufe, ọ na-akara m mma ikwu nanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ nile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nꞌasụsụ dị iche nke onye ọ bụla na-apụghị ịghọta.[20] Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nꞌechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nꞌihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nꞌihe gbasara ụdị okwu a.[21] E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na Chineke ga-eji asụsụ ndị mba ọzọ gwa ndị ya bụ ụmụ Izirel okwu, ma ha agaghị ege ntị.[22] Nke a na-egosi na ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe dị mkpa nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ịrịba ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma, nke bụ ikwusa eziokwu Chineke, bụ ihe dị ndị kweere na Kraịst mkpa. Ndị na-ekweghị ekwe anaghị ahụ mkpa nke a dị.[23] Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri?[24] Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ.[25] Mgbe ọ ga-anọ na-ege ntị, ihe ọ ga-anụ ga-emekụta echiche nzuzo ya nile, mee ka ndụ ọjọọ ya pụta ìhè. Nke a ga-emekwa ka o gbuo ikpere nꞌala kpọọ isi ala nye Chineke sị, “Nꞌezie, Chineke nọ nꞌetiti unu.”[26] Ugbu a, ụmụnna m, gịnị bụ isi ihe m na-ekwu? Mgbe ọ bụla unu zukọrọ ife Chineke, ụfọdụ kwesịrị ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe, ma ọ bụ gwa unu ozi dị mkpa Chineke gosiri ya, ma ọ bụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọ bụla e mere nꞌime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-abara onye ọ bụla uru.[27] A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu nꞌime chọọchị, ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nꞌotu nꞌotu nꞌusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nꞌebe ahụ.[28] Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịtaa ya.[29] Ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nꞌotu nꞌotu, mgbe mmadụ nile nọrọ nwayọọ na-ege ha ntị.[30] Ọ bụrụ na onye ọzọ anata ozi site nꞌaka Chineke, mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu, ka onye ahụ natara ozi ahụ chere tutuu onye nke na-ekwu ekwuchaa tupuu o kwuo nke ya.[31] Nꞌụzọ dị otu a, ndị nile nwere onyinye ibu amụma nwere ike izisa ozi ọma Chineke. Nꞌụzọ dị otu a kwa, a ga-enyere mmadụ nile aka kasiekwa ha obi.[32] Chetanụ na onye ahụ Chineke chọrọ isite nꞌọnụ ya kwuo okwu nwere ike iji ndidi chere ruo mgbe o ruru oge nke ya ikwu okwu.[33] Nꞌihi na Chineke abụghị onye na-achọ ka ihe nile na-aga aghara aghara. Chineke chọrọ ka ihe nile na-aga nꞌusoro nꞌime chọọchị nile nke ndị ya.[34] Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke.[35] Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị.[36] Ùnu jụrụ ịnabata okwu a? Ùnu chere na okwu Chineke malitere nꞌaka unu? Ùnu chekwara na ọ ga-akwụsị nꞌaka unu? Ụgha![37] Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, ma ọ bụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, nanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nꞌonwe ya nyere m.[38] Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ige ntị nꞌihe m kwuru nꞌakwụkwọ a, unu aṅala ya ntị![39] Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke nꞌụzọ doro anya. Kama unu akwụsịkwala ndị nwere onyinye ịsụ asụsụ nke ha na-amụghị amụ.[40] Ma meenụ ihe nile nꞌụzọ dị mma, ka ha dịkwa nꞌusoro.

Igbo Bible 1988
No Data