A A A A A

Chọọchị: [Pentikọst]


ỌLU OZI 2:1-13
[1] Nꞌụbọchị mmemme owuwe ihe ubu, nke bụ Pentikọọsụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst nile zukọrọ nꞌotu ebe.[2] Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ.[3] Ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ ihe yiri ire ọkụ. Ire ọkụ ndị a nọkwasịrị nꞌisi ha nile nꞌotu nꞌotu.[4] E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.[5] Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem.[6] Mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, ha nile gbakọtara. Ihe ha hụrụ juru ha anya! Nꞌihi na ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-asụ asụsụ nke onye ọ bụla nꞌime ha na-aghọta. Ndị si ebe dị iche iche bịa, nụrụ ka ndị a na-ekwu okwu nꞌasụsụ nke ha.[7] Ihe ndị a juru ha anya. Ha jụrịtara onwe ha sị, “Ndị a ha esighị Galili?[8] Gịnị mere o ji bụrụ na anyị na-anụ okwu ha nꞌasụsụ anyị dị iche iche?[9] Anyị na-anụ ka ha na-asụ asụsụ ndị Patia, na nke ndị Mid, na nke ndị Elam, na nke ndị Mesopotamia, na nke ndị Judia, na nke ndị Kapadosia, na nke ndị Pọntus, na nke ndị Esia,[10] na nke ndị Frigia, na nke ndị Pamfilia, na nke ndị Ijipti, na asụsụ mba dị gburugburu Libiya, na nke ndị Sirini. Anyị ndị ọbịa site na Rom, ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu,[11] ndị Krit, na ndị si Arebia, lee, anyị na-anụ okwu ha na-ekwu banyere ọrụ ebube Chineke na-arụ.”[12] O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụkwa?”[13] Ma ụfọdụ ndị ọzọ nọ na-achị ha ọchị na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”

Igbo Bible 1988
No Data