A A A A A

Chọọchị: [Ilu Jizọs]


MATIU 5:14-16
[14] Unu bụ ìhè nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nꞌelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.[15] Ndị mmadụ adịghị amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nꞌelu ihe ịdọba iheọkụ, ka o nye ndị nile nọ nꞌụlọ ahụ ìhè.[16] Ya mere, unu ezokwala ìhè unu. Kwerenụ ka ìhè unu nwuore mmadụ nile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu bi nꞌeluigwe.

MATIU 7:1-5
[1] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.[2] Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.[3] Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya?[4] Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ?[5] Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya.

MATIU 9:16-17
[16] “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-adụkọta akwa ochie na nke ọhụrụ. Nꞌihi na akwa ahụ ga-esi nꞌebe a dụrụ ya dọwaa, mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.[17] Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ochie nꞌihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-eche ha abụọ nke ọma.”

MATIU 12:24-30
[24] Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ha kwuru, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nꞌihi na ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”[25] Ma Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Mba ọ bụla ndị bi nꞌime ya na-alụrịta ọgụ enweghị ike ịdịgide ruo oge dị anya. Obodo ọ bụla, ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla e nwere nkewa na ịlụ ọgụ, nke ndị bi nꞌime ya na-egburita ibe ha, agaghị adịgide.[26] Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ.[27] Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nꞌike ekwensu, ọ̀ bụ nꞌike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nꞌihi okwu a unu kwuru.[28] Kama ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Mmụọ Nsọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nꞌetiti unu.[29] Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo nile dị nꞌụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ. Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo nile dị nꞌụlọ nwoke ahụ.[30] Onye na-adịghị adịnyere m na-emegide m. Otu a kwa, onye na-adịghị enyere m aka ikpokọta ekpokọta na-achụsasị achụsasị.

MATIU 13:1-23
[1] Emesịa, nꞌụbọchị ahụ kwa, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nꞌọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala na-ezi ndị mmadụ ihe.[2] Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nꞌime ụgbọ mmiri. Nꞌime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nꞌọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị, ihe.[3] O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịgha mkpụrụ nꞌubi ya.[4] Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nꞌime ha dara nꞌakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrụ ha loo.[5] Ma ụfọdụ nꞌime ha dara nꞌala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha pupụtara, too, nꞌihi na aja dị nꞌebe ahụ emighị emi.[6] Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nꞌihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nꞌime ala.[7] Mkpụrụ ụfọdụ danyere nꞌala ebe ogwu ogwu dị. Mgbe ha topụtara, ogwu ahụ kpagburu ha.[8] Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nꞌezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị iri mkpụrụ atọ, ụfọdụ iri mkpụrụ isii, ụfọdụ kwa narị mkpụrụ.[9] Onye nwere ntị ya nụrụ.”[10] Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nꞌilu?”[11] Jisọs zara ha sị, “Nanị unu ka ọ dịrị ịghọta ihe omimi nke alaeze Chineke. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya.[12] “Nꞌihi na onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nweta hie nne. Ma onye na-enweghị ihe ọ bụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere.[13] Ana m agwa ha okwu nꞌilu nꞌihi na ọ bụ ezie na ha nwere anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa ezie na ha na-anụ ihe m na-ekwu ma ha adịghị aghọta ya.[14] Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, ‘Ha ga-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta. Ha ga-ele anya leekwa anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọ bụla.[15] Nꞌihi na obi ha gbara abụba, dịkwa rọ. Ha mechiri ntị ha, ka ha ghara ịnụ ihe. Ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ha mechiri obi ha, ka ha ghara ịghọta ma tụgharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ Ma a gọziri anya unu na ntị unu agọzi, nꞌihi na ha na-ahụ ụzọ, na-anụkwa ihe.[16] ***[17] Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-agwa unu sị, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe ndị a anya unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe ndị a ntị unu na-anụ, ma ha enweghị ike.[18] “Ugbu a geenụ ntị mgbe m na-akọwara unu ihe banyere ilu onye ọrụ ubi ahụ nke gara ghaa mkpụrụ nꞌubi ya.[19] Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Ala ebe mkpụrụ ahụ dara nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ nke dara nꞌụzọ, nke ụmụ nnụnụ bịara tụrụ loo, nọchiri anya ndụ nụrụ eziokwu nke alaeze ahụ, ma ha aghọtaghị ya. Emesịa ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nꞌobi.[20] Mkpụrụ nke dara nꞌala nkume nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.[21] Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara nꞌime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara nꞌihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa.[22] Mkpụrụ nke dara nꞌala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nꞌakụ nke ụwa, kpagidere okwu dị nꞌime ya, mee ka ọ hapụ ịmị mkpụrụ.[23] Ma mkpụrụ dara nꞌala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nꞌozi ọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-apụ kpọta iri mmadụ anọ, ma ọ bụ iri mmadụ isii, ma ọ bụ narị mmadụ, ndị a ga-eme ka ha baa nꞌalaeze ahụ.”

MATIU 13:24-30
[24] Jisọs tụrụ ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka onye ọrụ ubi nke kụrụ ezi mkpụrụ ọka nꞌubi ya.[25] Ma nꞌotu abalị, mgbe onye ọrụ ubi ahụ nọ nꞌụra, onye iro ya gara nꞌubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nꞌetiti ezi mkpụrụ ọka ahụ ọ kụrụ.[26] Mgbe mkpụrụ ọka ndị ahụ bidoro ito, ahịhịa ahụ bidokwara ito.[27] “Ma ndị na-ejere onye ọrụ ubi ahụ ozi bịara jụọ ya ajụjụ sị, ‘Nna anyị ukwu, ọ̀ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’[28] “Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ Ndị na-ejere ya ozi sịrị, ‘Ka anyị gaanụ fopụtasịa ha.’[29] “Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị! nꞌihi na mgbe unu na-achọ ifopụ ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site nꞌamaghị ama fopụ ezi mkpụrụ.[30] Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ tokọtaa, tutuu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nꞌoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunụ ụzọ fopụtasịa ahịhịa ndị a nile, kee ha nꞌukwu nꞌukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpọkọtaanụ ọka ndị a tinye ha nꞌọba.’ ”

MATIU 13:31-32
[31] Jisọs tukwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nꞌubi ya. Ọ bụ ezie ha ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi nile, ọ dị nta dị ka mkpụrụ aṅara[32] ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe nile a kụrụ nꞌubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-arụ akwụ ha nꞌalaka ya.”

MATIU 13:33-34
[33] Ọzọ kwa, Jisọs ji alaeze eluigwe tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo.[34] Oge nile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọ bụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.

MATIU 13:44
“Ala eze eluigwe dị ka akụ e zoro nꞌotu ibiribe ala, nke otu nwoke chọpụtara. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe nile o nwere, ma gaa zụọ ibiribe ala ahụ.

MATIU 13:45-46
[45] “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụ ahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.[46] Mgbe ọ hụrụ nkume a, o rere ihe nile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụ ahịa.

MATIU 13:47-50
[47] “Ọzọ kwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke onye ọkụ azụ wụnyere nꞌime mmiri, jiri ya jide azụ dị iche iche, ndị a na-eri eri na ndị a na-adịghị eri eri.[48] Mgbe ụgbụ a juru, onye ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya, nọdụ ala họpụtasịa ndị a na-eri eri ma na-etufụ ndị a na-adịghị eri eri.[49] Otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nꞌetiti ụmụ Chineke.[50] A ga-atụba ndị ọjọọ nꞌime ọkụ. Nꞌebe ahụ ka ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.

MATIU 15:10-20
[10] Mgbe ahụ, Jisọs kpọrọ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Geenụ ntị nꞌihe m na-ekwu. Ghọtakwanụ okwu m![11] Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”[12] Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwaara na obi adịghị ndị Farisii mma nꞌihi okwu ahụ i kwuru.”[13] Ma Jisọs zara sị ha, “Osisi ọ bụla Nna m na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-efopụ.[14] Ya mere, unu echegbula onwe unu, nꞌihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Mgbe ọ bụla kwa onye ìsì na-edu onye ìsì ibe ya ha abụọ aghaghị ịdaba nꞌime olulu.”[15] Pita sịrị ya, “Kọwaaranụ anyị ihe okwu a pụtara. ‘Ọ bụghị ihe mmadụ riri na-emerụ ya.’ ”[16] Jisọs jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụ na ị ghọtaghị? Ọ̀ ga-abụ na o nweghị ihe dị iche nꞌetiti gị na ha nꞌịghọta eziokwu?[17] Ọ̀ ga-abụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla mmadụ riri nꞌọnụ ya na-abanye ya nꞌime afọ, emesịa o sitekwa ya nꞌike pụọ?[18] Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.[19] Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ.[20] Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupuu o rie nri, ma ọ bụ na ọ kwọghị.”

MATIU 18:10-14
[10] “Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.[11] Nꞌihi na mụ, Nwa nke mmadụ, bịara ịzọpụta ndị furu efu.[12] “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nꞌime ha akapfuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu fọdụrụ pụọ jegharịa nꞌugwu na ndịda nile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?[13] Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-aṅụrị ọṅụ nꞌihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ toolu na toolu ndị nọ nꞌụlọ.[14] Otu a ka ọ dịkwa nꞌebe Nna m nọ; ọ bụghị ọchịchọ ya na otu nꞌime ndị a dịkarịsịrị nta ga-ala nꞌiyi.

MATIU 18:23-35
[23] “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji.[24] Mgbe ha malitere na-apịazi, a kọtaara eze ahụ otu nꞌime ndị ohu ya ji ya ụgwọ ruru nde naịra abụọ.[25] Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Eze ahụ nyere iwu ka e refuo ya na nwụnye, na ụmụ ya, na ihe nile o nwere, nꞌihi ụgwọ o ji.[26] “Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’[27] “Eze ahụ jupụtara nꞌọmiko nꞌebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.[28] “Ma mgbe ohu ahụ sitere nꞌihu eze ahụ pụọ, o jekwuuru otu nwoke ji ya ụgwọ otu puku naịra. O jidere ya nꞌaka ike, machie ya aka nꞌakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a!’[29] “Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’[30] “Ma nwoke ahụ e ji ụgwọ achọghị ichere! O jidere nwoke ahụ, tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji ya.[31] “Mgbe ndị enyi nwoke ahụ e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụrụ ihe mere enyi ha, ha jekwuuru eze ahụ, kọọrọ ya ihe nile ha hụrụ.[32] Eze ahụ kpọrọ nwoke a, nke ọ gbaghara ụgwọ nile o ji na mbụ sị ya, ‘Ajọ ohu! Nꞌebe a ka m nọ gbaghara gị.[33] Ebe m gbaghara gị ụgwọ i ji m, o kwesịghị ka i nwee obi ebere nꞌebe ndị ọzọ nọ, dị ka m si nwee obi ebere nꞌebe ị nọ?’[34] “Mgbe abụ, eze ahụ oke iwe juru obi, zipụrụ nwoke ahụ ka a taa ya ahụhụ, tutuu ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji, na-afọdụghị otu kobo.[35] Otu a ka Nna m bi nꞌeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị ụmụnne unu.”

MATIU 20:1-16
[1] “Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nꞌisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nꞌubi ya.[2] Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha naịra abụọ nꞌihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nꞌubi ya.[3] “Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, nꞌihe dị ka elekere toolu ụtụtụ, o sitere nꞌebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro na-eche onye ga-akpọ ha ọrụ.[4] Ọ kpọrọ ha ziga ha nꞌubi ya sị ha, ‘Ihe ọ bụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu, mgbe unu rụsịrị ọrụ.’[5] Nꞌelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie ụbọchị ahụ, ọ hụkwara ndị ọzọ, ziga ha nꞌubi ya.[6] “Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu arụghị ọrụ taa?’[7] “Ha zara sị ya, ‘Nꞌihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ Ọ gwara ha sị, ‘Gaanụ soro ndị ọzọ rụọ ọrụ nꞌubi m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’[8] “Nꞌabalị ụbọchị ahụ, nwoke a gwara onye na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ka ọ kwụọ ha nile ụgwọ. O mekwara ka onye na-akwụ ụgwọ malite nꞌonye ikpeazụ bịara ọrụ nꞌubi ahụ ruo na ndị buru ụzọ bido ọrụ nꞌụtụtụ.[9] Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nꞌelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha naịra abụọ, naịra abụọ.[10] Nꞌihi ya mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nꞌisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha nile naịra abụọ abụọ.[11] “Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamụrụ ntamụ megide nna nwe ụlọ sị,[12] ‘Ndị a rụrụ ọrọ nanị otu awa, ma ị kwụrụ ha ụgwọ dị ka anyị bụ ndị rụrụ ọrụ site nꞌụtụtụ ruo anyasị.’[13] “Nna nwe ụlọ zara otu nꞌime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọ bụla. Ọ̀ bụghị gị kwere na ị ga-arụ ọrụ ụbọchị taa nile? Ọ̀ bụghị gị kwekwaara na ị ga-anara naịra abụọ?[14] Were ego gị laa. Ọ bụrụ na m akwụọ mmadụ nile otu ihe ahụ,[15] ọ̀ dị iwu megidere m, nꞌihi na m nyere ego m dị ka m si chọọ? Ị̀ na-ewe iwe nꞌihi na m meere ndị mmadụ ebere?’ ”[16] Jisọs kwukwara sị, “Otu a ka ọ ga-adị, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”

MATIU 21:28-32
[28] Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m gaa rụọ ọrụ nꞌubi m taa.’[29] Nwa ahụ zara nna ya sị, ‘Agaghị m aga’. Ma mgbe e mesịrị, ọ gbanwere obi ya gaa.[30] Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta sị ya, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ nꞌubi m taa.’ Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga.’ Ma nꞌikpeazụ ọ gaghị.[31] Ònye nꞌime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ha, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nꞌezie, ndị ọnaụtụ na ụmụ nwanyị akwụla ga-ebu unu ụzọ banye nꞌalaeze Chineke.[32] Nꞌihi na Jọn bịakwutere unu gwa unu ka unu chegharịa, lọghachikwute Chineke, ma unu ekweghị. Ndị ọnaụtụ, na ụmụ nwanyị akwụla chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ ha, nke a emekwaghị ka unu chegharịa kwere.”

MATIU 21:33-45
[33] “Ugbu a geekwanụ ntị nꞌilu ọzọ. Otu nwoke dị nke nwere ala ubi. Nwoke a kụrụ osisi oroma nꞌubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, wuokwa mbadamba ebe a ga-anọ mee mmanya nꞌime ya. O wukwara ụlọ nche nꞌime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nꞌaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa biri nꞌala ọzọ.[34] “Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị na-ejere ya ozi ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nꞌubi ahụ.[35] Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị ozi ya ahụ tie otu onye nꞌime ha ihe, gbuokwa onye ọzọ nꞌime ha. Ha tụkwara otu nꞌime ha nkume.[36] “Emesịa, nwoke a zigakwara ọtụtụ ndị ozi karịrị ndị nke mbụ nꞌọnụ ọgụgụ, ịnata mkpụrụ ruuru ya. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ.[37] Nꞌikpeazụ nwoke ahụ zigara ọkpara ya. Echiche ya bụ na ndị na-elekọta ubi ahụ ga-asọpụrụ ya.[38] “Ma mgbe ndị a na-elekọta ubi ahụ lepụrụ anya hụ ọkpara nwoke a ka ọ na-abịa, ha gbara izu nꞌetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’[39] Mgbe ọkpara nwoke ahụ bịarutere, ha jidere ya nꞌike, kpụrụ ya gafee nꞌazụ ubi ahụ, gbuo ya nꞌebe ahụ.[40] “Mgbe nwoke nwe ubi ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”[41] Ndị nọ nꞌebe ahụ zara sị ya, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nꞌiyi nꞌụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nꞌoge ya.”[42] Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ̀ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ka e mere ka ọ bụrụ nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ? Nke a bụ ọrụ nke nanị Onyenwe anyị rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nꞌanya anyị!’[43] “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-enyeghachikwa Chineke mkpụrụ ruuru ya.[44] Ndị nile ga-adakwasị nkume eziokwu ahụ ka a ga-etiwasị. Ma ndị nkume ahụ dakwasịrị ka a ga-egwepịa dị ka ntụ.”[45] Mgbe ndị isi nchụaja na ndị Farisii ghọtara na okwu ndị a Jisọs kwuru bụ banyere ha,

MATIU 22:1-14
[1] Jisọs tụrụ ilu dị iche iche iji kọwaa ihe alaeze eluigwe yiri.[2] Nke a bụkwa ilu ọzọ: “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke bụ eze, nke kpọrọ oriri ọlụlụ nwụnye, nꞌihi ọkpara ya.[3] Ọ kpọkwara ọtụtụ ndị mmadụ ka ha bịa oriri ahụ. Mgbe ọ kwadosịrị ihe oriri, o zipụrụ ndị ozi ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha nile achọghị ịbịa.[4] Eze ahụ zipụkwara ndị ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Ihe nile dị na-eche unu, bịanụ ọsịịsọ.’[5] “Ma ndị ahụ nile a kpọrọ oriri chịrị ọchị, lefuo ya anya. Onye ọ bụla nꞌime ha jewere ime mkpa ya. Otu onye gara nꞌubi ya, nke ọzọ nꞌụlọ ahia ya.[6] Ndị ọzọ tiri ndị ozi eze ahụ ihe, mee ha ihe ihere. Ụfọdụ gbukwara ndị ozi ahụ eze zitere.[7] “Mgbe eze ahụ nụrụ ihe ha mere ndị ozi ya, o were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nꞌiyi, rechapụkwa obodo ha nꞌọkụ.[8] Emesịa, ọ kpọrọ ndị na-ejere ya ozi si ha, ‘Edoziri m oriri ọlụlụ nwụnye a ma ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa rie ya ekwesịghị ugwu e nyere ha.[9] Ugbu a, gaanụ nꞌakụkụ ụzọ nile, kpọbatanụ ndị nile unu hụrụ, ka ha bịa nꞌoriri ọlụlụ nwụnye a.’[10] “Ndị na-ejere eze ahụ ozi pụrụ gaa nꞌokporo ụzọ nile kpọbata mmadụ nile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.[11] Mgbe eze ahụ batara ileta ndị nile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwụnye.[12] “Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nꞌebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwụnye?’ Nwoke ahụ mechiri ọnụ ya nꞌihi na o nweghị ihe ọ ga-asa.[13] “Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ nwoke a eriri, aka na ụkwụ, wepụkwanụ ya, gaa tụnye ya nꞌime ọchịchịrị, ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze.[14] Nꞌihi na ọ bụ ezie na a kpọrọ ọtụtụ mmadụ, ma ọ bụ mmadụ ole na ole ka a na-ahọrọ.’ ”

MATIU 24:32-35
[32] “Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya jupụtara nꞌahịhịa ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.[33] Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile ka ha na-eme marakwanụ na anọ m nso, na ọbịbịa m dị nnọọ nso.[34] Ihe ndị a nile aghaghị imezu tupuu ọgbọ a agabiga.[35] “Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m nile ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

MATIU 24:45-51
[45] “Ị̀ bụ ohu ahụ maara ihe, nke kwesịkwara ntụkwasị obi, onye e mere onyeisi ezinụlọ m, ka ị na-enye ụmụntakịrị m nri nꞌoge ha chọrọ ya?[46] Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, ma ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ gị nꞌeziokwu mgbe m ga-alọghachi.[47] Nꞌezie, aga m eme gị onyeisi ihe nile m nwere.[48] “Ma ị bụrụ ohu nke na-asị nꞌobi ya, ‘Onyenwe m ga-anọ tee anya tupuu ọ lọta’,[49] ị malite na-eti ndị ohu ibe gị ihe, sorokwa ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-eri, na-aṅụkwa,[50] Onyenwe gị ga-alọta nꞌụbọchị ị na-atụghị anya ya.[51] Ọ ga-etikwa gị oke ihe otiti, zipụ gị ka e kpee gị ikpe dị ka onye ihu abụọ. Nꞌebe ahụ ka ị ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze.”

MATIU 25:1-13
[1] “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere iheọkụ ha pụta izute onye na-alụ nwụnye ọhụrụ.[2] Ise nꞌime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.[3] Ise ndị nzuzu ahụ weere iheọkụ ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ ga-ezuru ha.[4] Ise ndị maara ihe wụjuru mmanụ nꞌiheọkụ ha, ma tinyekwara onwe ha karama mmanụ ọkụ ọzọ.[5] “Mgbe onye na-alụ nwụnye ọhụrụ ahụ nọrọ tee anya nꞌọbịbịa ya, ụmụ agbọghọ nile ahụ dinara ala rahụ ụra.[6] Nꞌetiti abalị e tiri mkpu nꞌoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwụnye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’[7] “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ nile biliri mụnye ọkụ ha.[8] Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nꞌime mmanụ ọkụ unu, lee na iheọkụ anyị na-anyụ anyụ.’[9] “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Ọ̀ dịghị! Mmanụ ọkụ anyị nwere adịghị ukwuu, ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ nꞌebe a na-ere mmanụ ọkụ zụrụ nke ga-ezuru unu.’[10] “Ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ gara. Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwụnye ọhụrụ bịarutere. Ụmụ agbọghọ ndị jikeere ejike gara zute ya, sorokwa nꞌoriri ọlụlụ nwụnye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.[11] “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri guzo nꞌezi kụọ aka nꞌụzọ, kpọọkwa oku sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ!’[12] “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Amaghị m ndị unu bụ.’[13] “Ya mere, na-anọgidenụ na che, nꞌihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge ahụ m ga-alọghachi.

MATIU 25:14-30
[14] “A ga-ewerekwa alaeze eluigwe tụnyere akụkọ otu nwoke chọrọ ịga obodo ọzọ. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya nile nye ha ego nꞌotu nꞌotu, ka ha jiri ya malite ịzụ ahịa tutuu ruo mgbe ọ ga-alọta.[15] “O nyere ohu ya nke mbụ narị naịra ise. Ohu nke abụọ ka o nyere narị naịra abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu narị naịra. O nyere ha nꞌotu nꞌotu dị ka ike ha ha. Mgbe o mesịrị otu a, ọ hapụrụ ha gaa ije ya.[16] Ohu ahụ natara narị naịra ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o ritere narị naịra ise ọzọ nꞌuru.[17] Otu a kwa, onye nke e nyere narị naịra abụọ zụpụtakwara narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.[18] “Ma ohu ahụ natara otu narị naịra gara gwuo ala lie ya, nꞌihi ichezi ya nke oma.[19] “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ha ukwu lọtara site nꞌije ya. Ọ kpọkọtara ha nile ka ha gụzie ego ya.[20] Nwoke ahụ o nyere narị naịra ise batara wetakwa narị naịra ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘I nyere m narị naịra ise, ma ugbu a azụpụtala m narị naịra ise ọzọ.’[21] “Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’[22] “Onye nke e nyere narị naịra abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m narị naịra abụọ. Lee nꞌebe a, azụpụtala narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.’[23] “Nna ya ukwu sịrị, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’[24] “Onye e nyere otu narị naịra batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nꞌebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nꞌebe ị na-agbasaghị.[25] Atụrụ m egwu gị, nꞌihi na amaara m onye ị bụ. Ya mere eweere m ego gị liere gị nꞌala. Lee ya nꞌebe a!’[26] “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ! Ị maara na m na-ewe ihe ubi nꞌebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nꞌebe m na-agbasaghị.[27] Ị gaara etinye ego m nꞌaka ndị na-eche ego, ndị gaara akwụghachi ya na ụma ya.[28] Napụtanụ ya narị naịra ahụ o ji, ma were ya nye nwoke ahụ ji narị naịra ise![29] Nꞌihi na nwoke ahụ na-ejizi ihe e nyere ya ka a ga-enye ihe ọzọ. Ọ ga-enwebigakwa ihe oke. Ma site nꞌaka nwoke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka a ga-anapụ, ọ bụladị ihe nta ahụ e nyere ya.[30] Chụpụnụ ohu ọjọọ a na-abaghị uru nꞌọchịchịrị ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze ya.’

Igbo Bible 1988
No Data