A A A A A

Chọọchị: [Ọmụmụ Jizọs]


MATIU 1:18-23
[18] Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya.[19] Ma nwoke a na-achọ ịlụ Meri bụ ezi mmadụ. Nꞌihi ya, mgbe ọ chọpụtara na Meri dị ime, o zubere ịhapụ ya na nzuzo, nꞌihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ihe bụ ọnọdụ Meri.[20] Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devidi, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye gị, nꞌihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ.[21] Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nꞌihi na ọ ga-azọpụta ndị ya site na mmehie ha.[22] Ọmụmụ nwa a ga-emezu ihe ahụ Chineke kwuru site nꞌọnụ onye amụma ya sị,[23] ‘Lee, nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. A ga-akpọ aha ya Ịmanụelụ, nke bụ ma asụgharịa ya, Chineke nọnyeere anyị.’ ”

LUK 2:7-21
[7] Ọ mụpụtakwara nwa mbụ ya, nwa nwoke. O ji akwa kee ya, nyibe ya nꞌụlọ a na-edebe anụ ụlọ, nꞌihi na ha enwetaghị ebe ndina nꞌụlọ ndị ije dị nꞌobodo Betilehem.[8] Nꞌoge a, e nwere ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ na-elekọta igwe atụrụ ha, nꞌazụ obodo nta Betilehem nꞌabalị ụbọchị ahụ.[9] Na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ a hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ọ bịara guzo nꞌihu ha. Ebube Chineke gbakwara ha gburugburu mee ka ìhè jupụta nꞌebe ahụ ha nọ dị ka a ga-asị na ọ bụkwaghị abalị. Oke egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ.[10] Ma mmụọ ozi ahụ gwara ha okwu sị ha, “Unu atụla egwu nìhi na ewtaara m unu ozi oma nke na-eweta oke ọṅụ, bụ ọṅụ ga-adịrị mmadụ nile.[11] Nꞌihi na taa, na Betilehem, obodo Devidi, ka a nọ mụọra unu onye nzọpụta nke bụ onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara![12] Unu ga-esi aṅaa chọta ya? Ọ bụrụ na unu abaa nꞌime obodo, unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e jiri akwa kee, nyibe ya nꞌala nꞌụlọ a na-edebe anụ.”[13] Mgbe mmụọ ozi a kpụ okwu ndị a nꞌọnụ na-ekwu, na mberede, igwe mmụọ ozi pụtara soro mmụọ ozi a, ee, ọtụtụ igwe mmụọ ozi nke eluigwe pụtara, soro mmụọ ozi a bido ịbụ abụ na ito Chineke na-asị,[14] “Otuto dịrị Chineke nꞌebe kachasị elu nke eluigwe, udo nꞌelu ụwa nye ndị nile ihe ha dị Chineke mma.”[15] Mgbe ndị mmụọ ozi a laghachiri nꞌeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betilehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a dị egwu nke Onyenwe anyị gwara anyị site nꞌọnụ mmụọ ozi.”[16] Ha jiri ọsọ jeruo Betilehem. Ha chọtara Meri na Josef, hụkwa nwa ọhụrụ ahụ ka o dina nꞌụlọ anụ.[17] Mgbe ha kelesịrị ya, ha pụrụ kọọrọ onye ọ bụla ha hụrụ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ha banyere nwanta a.[18] Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị nile nụrụ ya anya.[19] Ma Meri nꞌonwe ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya, cheekwa echiche banyere ha.[20] Nꞌikpeazụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri azụ nꞌebe igwe atụrụ ha nọ. Mgbe ha na-aga, ha na-eto Chineke nꞌihi ihe ha nụrụ, na nꞌihi ihe ha hụkwara. Nꞌihi na ihe nile ha hụrụ dị, dị ka mmụọ ozi ahụ gwara ha.[21] Nꞌụbọchị nke asatọ ya, mgbe oge ruru ibi nwanta ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi sị na a ga-akpọ ya tupuu Meri adịrị ime.

MATIU 2:1-12
[1] A mụrụ Jisọs na Betilehem nke Judia nꞌoge Herọd bụ eze. Mgbe ahụ, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịara na-ajụ ajụjụ sị,[2] “Ebee ka a nọ mụọ eze ọhụrụ ndị Juu ahụ? Anyị hụrụrị kpakpando ya nꞌọwụwa anyanwụ. Ugbu a anyị bịara ka anyị kpọọ isi ala nye ya.”[3] Ajụjụ ha wutere Herọd nke ukwuu. O jukwara ndị nile bi na Jerusalem anya.[4] Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?”[5] Ha zara sị ya, “Betileham, nꞌala Judia! Nꞌihi na Maịka onye amụma dere sị,[6] ‘Ọ̀ bụ ezie na ị dị nta gị obodo nta Betileham, ma ị bụ obodo dị mkpa na Judia, nꞌihi na ọ bụ site na gị ka onye ga-achị ndị m Izirel ga-esi pụta.’ ”[7] Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụọ ha oge ha hụrụ kpakpando ahụ.[8] Emesịa, ọ sịrị ha. “Gaanụ Betileham chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isi ala nye ya.”[9] Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem.[10] Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu![11] Ha jeruru Betilehem, banye nꞌụlọ ebe nwantakịrị ahụ na nne ya nọ, daa nꞌala kpọọ isi ala nye nwa ọhụrụ ahụ. Ha meghere akpa ha nye ya onyinye ọlaedo, ọkpụrụkpụ eso osisi abụọ na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na maar.[12] Mgbe ndị amamihe a chọrọ ịlaghachi obodo ha, ha esikwaghị Jerusalem ịkọrọ Herọd ihe ha hụrụ. Nꞌihi na Onyenwe anyị nyere ha iwu na nrọ sị ha site ụzọ ọzọ laa.

GALETIA 4:4
Ma mgbe oge a kara aka ruru, oge ahụ Chineke kpebiri, o zitere Ọkpara ya, ka nwanyị mụọ ya dị ka onye Juu.

LUK 2:1-4
[1] Nꞌoge a, Siza Ọgọstọs onye bụ onye na-achị alaeze ndị Rom, nyere iwu ka a gụọ onye ọ bụla nọ nꞌalaeze ya ọnụ.[2] (Nke a bụ igụ mmadụ onụ nke mbụ e nyere iwu ya mgbe Kwirinus na-achi akụkụ Siria.)[3] Nꞌihi iwu ịgụ mmadụ ọnụ a, onye ọ bụla gara nꞌobodo nke a mụrụ ya idenye aha ya nꞌakwụkwọ.[4] Josef onye bi nꞌobodo Nazaret nke dị na Galili, hapụrụ ebe ahụ gaa Judia. Na Judia, ọ gakwara nꞌobodo nke a mụrụ ya, bụ Betilehem. Betilehem bụkwa ebe a nọ mụọ Devidi. Ya mere, Josef gara Betilehem nꞌihi na o si nꞌagbụrụ Devidi.

NKPUGHE 12:1-5
[1] Mgbe ihe ndị a gasịrị, oke ihe ịrịba ama pụtara ìhè nꞌeluigwe nke na-egosi ihe gaje ime. Ahụrụ m otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe. Ọnwa dịkwa nꞌokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpu eze nke kpakpando iri na abụọ dị gburugburu ya, dịkwa ya nꞌisi.[2] Nwanyị ahụ dị ime, na-etikwa mkpu dị ka nwanyị ime na-eme, nke na-ejikere ịmụpụta nwa ọhụrụ.[3] Na mberede, agwọ ochie ahụ a na-akpọ Dragọn nꞌasụsụ bekee pụtara ìhè. O nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpu eze asaa nꞌisi ya.[4] Nꞌazụ ya, o nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke kpakpando nile dị nꞌeluigwe, tụda ha nꞌala. Ọ bịara guzo nꞌihu nwanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ nwanyị ahụ ga-amụpụta.[5] Emesịa, nwanyị ahụ mụpụtara nwantakịrị ahụ, onye gaje ịchị achị nꞌelu ụwa dum. Onye ga-ejikwa aka dị ike chịa ọchịchị ya. Mgbe ahụ a mụpụtara ya, nꞌotu oge ahụ kwa, e si nꞌebe ahụ wepụ nwanta ahụ were ya gaa nꞌebe Chineke nọ nꞌeluigwe nꞌocheeze ya.

Igbo Bible 1988
No Data