A A A A A

Omume Ọjọọ: [Onye ihu abụọ]


1 JỌN 4:20
Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị, “Ahụrụ Chineke nꞌanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ nnọọ onye ụgha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nꞌanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ̀ ga-esi aṅaa hụ Chineke nꞌanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya?

1 PITA 2:16
Bienụ ndụ unu dị ka ndị na-anọghị nꞌokpuru iwu. Ma unu ejikwala onwunwe unu nwe onwe unu eme ihe ọ bụla masịrị unu. Unu ejila ya eme ihe ọjọọ, kama na-ebinụ ndụ unu ime nanị ihe Chineke chọrọ mgbe nile.

GALETIA 6:3
Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌetiti unu echee na ya bụ onye dị mkpa, onye na-apụghị iweda onwe ya ala mee ihe ndị a, onye ahụ na-eme onwe ya onye nzuzu. O nwekwaghị ihe onye ahụ bụ nꞌezie.

LUK 6:46
“Gịnị mere unu ji na-akpọ m Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ma unu adịghị eme ihe m gwara unu?

LUK 12:2
Nꞌihi na ọ dịghị ihe zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị emesịa kpughee.

MAK 7:6
Jisọs zara sị ha, “Okwu ahụ Aịzaya kwuru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, ‘Ndị a ji ire dị ụtọ na-ekwu okwu banyere m, ma nꞌime obi ha, ha ahụghị m nꞌanya.

MATIU 6:1
“Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe.

ROM 10:3
Nꞌihi na ha jụrụ ịnabata ụzọ ezi omume ahụ si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama ha nọgidere na-agbalịsi ike isite nꞌụzọ idebe iwu ndị Juu ịchọ ime ka Chineke nabata ha. Ma ụzọ ahụ abụghị ụzọ Chineke kwadoro isite ịzọpụta mmadụ.

TAITỌS 1:16
Ọ bụ ezie na ndị dị otu a na-asị na ha maara Chineke ma e lee anya nꞌomume ha, ọ na-ezipụta na ha amaghị ya. Ha bụ ndị ọjọọ, ndị rere ure na ndụ ha, ndị na-adịghị ekwenye nꞌihe ọ bụla gbasara Chineke, ndị na-enweghị ike ịrụpụta ezi ọrụ ọ bụla na ndụ ha.

MATIU 23:27-28
[27] “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe mara mma, ma ime ha jupụtara nꞌọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe rere ure nile.[28] Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie.

LUK 20:46-47
[46] “Jienụ onwe unu aka site nꞌebe ndị ozizi iwu nọ. Nꞌihi na ihe ha hụrụ nꞌanya bụ iyi uwe ogologo na-ejegharị ebe nile. Ihe na-atọkwa ha ụtọ bụ ka a na-ekele ha ekele dị iche nꞌime ahịa. Ha hụkwara ịnọdụ nꞌoche dị mkpa nꞌụlọ ekpere na nꞌoge mmemme ọ bụla nꞌanya.[47] Ma ha bụ ndị na-abakwuru ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ, pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ekpe ogologo ekpere ka ndị mmadụ too ha. Ha ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu site nꞌaka Chineke.”

JEMES 1:22-23
[22] Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ nanị, site nꞌụzọ dị otu a na-aghọgbu onwe unu. Kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.[23] Nꞌihi na onye ọ bụla na-ege ntị nꞌokwu ọ bụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nꞌenyo.

MATIU 6:16-18
[16] “Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha.[17] Ma mgbe unu na-ebu ọnụ, dịnụ mma ile anya.[18] Ka mmadụ ọ bụla hapụ ịmata na unu na-ebu ọnụ. Nna unu, onye maara ihe nile, ga-akwụghachikwa unu ụgwọ.

MATIU 7:21-23
[21] “Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.[22] Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’[23] Ma aga m asị ha, sitenụ nꞌihu m pụọ, amaghị m unu, nꞌihi na ọrụ unu dị njọ.

MATIU 15:7-9
[7] “Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya kwuo sị,[8] ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ.[9] Ịkpọ isi ala ha bụ ihe efu, nꞌihi na ọ bụ ozizi mmadụ ka ha na-ezi nꞌọnọdụ iwu Chineke.’ ”

MATIU 6:1-4
[1] “Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe.[2] Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha.[3] Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, mmenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.[4] Chineke bụ Nna gị, onye maara ihe nzuzo nile, ga-akwụghachi gị ụgwọ zuru ezu.

2 TIMỌTI 3:1-5
[1] Ma mata nke a, Timoti, na nꞌoge ikpeazụ ahụ, ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịbụ ndị nke Kraịst.[2] Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha.[3] Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.[4] Ndị na-arara ibe ha nye nꞌaka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nꞌanya, kama ịhụ Chineke nꞌanya.[5] Ha ga-abụ ndị na-aga chọọchị, ma ha agaghị ekwenye nꞌihe ọ bụla ha nụrụ. Wezuga onwe gị nꞌebe ndị dị otu a nọ.

ROM 2:1-5
[1] Enyi m nwoke, ọ bụrụ na ị na-edo onwe gị ugbu a dị ka onye ikpe megide ndị ahụ mehiere, achọrọ m ime ka ị mata na o nweghị ụzọ o si kwesị ekwesị ka gị, onye ọ bụla ị bụ, kpee onye ọzọ ikpe. Nꞌihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, chetakwa na ọ bụkwa onwe gị ka ị na-ama ikpe, ebe ọ bụ na gị onwe gị na-emekwa otu ụdị mmehie ahụ.[2] Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nꞌụzọ ziri ezi.[3] Ya mere, mgbe gị onwe gị nọdụrụ ala na-atụ onye ọzọ aka nꞌihu nꞌihe ndị ahụ ị na-emekwa, i chere na Chineke ga-ekpe ya ikpe hapụ ikpe gị ike? Ka ị na-eche na o nwere ụzọ ị ga-esi gbanarị ikpe ọmụma Chineke?[4] Ka ị na-eleda obi ebere Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachi obi ya anya? Ị maghị na obi ebere o nwere nꞌebe ị nọ kwesịrị ime ka i site na mmehie gị chegharịa?[5] Ma ọ naghị emetụ gị nꞌobi ikwere na Chineke, nꞌihi mkpọchị nke obi gị kpọchịrị! Ma ihe ị na-eme bụ nanị ijikere onwe gị nye ụbọchị ahụ Chineke ga-esite nꞌiwe ya kpee gị ikpe dị egwu. Mgbe Chineke ga-ekpughe na ọ bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi.

JEMES 1:21-26
[21] Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ nile na ihe ọ bụla dị njọ nke fọdụrụ nꞌime ndụ unu. Nꞌọnọdụ ya nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nꞌobi unu, nke nwere ike ịzọpụta unu.[22] Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ nanị, site nꞌụzọ dị otu a na-aghọgbu onwe unu. Kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.[23] Nꞌihi na onye ọ bụla na-ege ntị nꞌokwu ọ bụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nꞌenyo.[24] O lesịa onwe ya pụọ, ọ naechefukwa ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.[25] Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nꞌime iwu ahụ zuru oke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya ee, nwoke ahụ na-aga nꞌihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka Chineke ga-agọzi mgbe ọ na-aga nꞌihu na-eme ihe ahụ.[26] Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.

LUK 6:37-42
[37] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. Amala ndị ozọ ikpe ka a ghara ima unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.[38] Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.”[39] Mgbe ahụ Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Onye ìsì enweghị ike idu onye ìsì ibe ya, nihi na ha abụọ ga-adaba nꞌime olulu.[40] Nwanta akwụkwọ enweghị oge ọ ga-ama ihe karịa onye na-ezi ya ihe, kama mgbe ọ mụsịrị akwụkwọ ya ọ ga-amata ihe dị ka onye ziri ya ihe.[41] “Gịnị mere i ji legide anya na ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ị na-eme banyere ibe osisi dachiri gị anya?[42] Ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, biko kwere ka m tụpụta gị ahịhịa ntakịrị dị gị nꞌanya mgbe ibe osisi dachiri gị nꞌanya adịghị ekwe gị hụ ụzọ? Buru ụzọ wepụta ibe osisi dachiri gị nꞌanya, mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya.

MATIU 7:1-6
[1] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.[2] Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.[3] Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya?[4] Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ?[5] Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya.[6] “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụ ahịa. Ha ga-azọ ha ụkwụ ma lusịkwa gị ọgụ.

1 JỌN 2:1-6
[1] Ụmụ m, ana m edere unu ihe ndị a nile ka unu si nꞌime mmehie pụta. Ọ bụrụkwanụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee mmehie, anyị nwere Jisọs Kraịst, onye na-eguzo nꞌihu Chineke, bụ Nna anyị, arịọrọ anyị arịrịọ. Jisọs Kraịst pụrụ ime nke a nꞌihi na ọ dị ọcha bụrụkwa onye na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nꞌụzọ nile.[2] Jisọs bụ onye ahụ hụrụ ahụhụ nꞌihi mmehie anyị si otu a mee ka anyị bụrụ ndị nwere ike ịbịakwute Chineke. Ọ bụ Kraịst mere ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị nile, na mmehie ụwa nile.[3] Ya mere anyị nwere ike ịmata na anyị bụ ụmụ Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-edebe iwu e nyere anyị.[4] Dị ka ọ dị, onye ọ bụla na-ekwu sị, “Abụ m onye Kraịst”, ga-eme ihe Kraịst nyere nꞌiwu. Ma onye na-akpọ onwe ya onye Kraịst ma ọ dịghị eme ihe o nyere nꞌiwu bụ onye okwu ụgha.[5] Ma ndị ahụ na-edebe iwu Kraịst, ndị na-eme ihe ọ chọrọ ga-amụta otu e si ahụ Chineke nꞌanya. Nke a bụkwa ụzọ e si ama onye bụ onye nke Kraịst nꞌezie.[6] Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya bụ onye nke Kraịst, o kwesịrị ibi ndụ dị ka Kraịst si bie.

LUK 16:10-15
[10] Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu.[11] Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike tụkwasị gị obi ilekọtazi akụ na ụba nke ụwa a, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi nye gị ezi akụ nke eluigwe?[12] Ọ bụrụkwa na o nweghị onye na-atụkwasị gị obi ijizi akụ onye ọzọ, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi ijizi ihe nke bụ nke gị?[13] “Otu onye apụghị ịbụ odibo mmadụ abụọ. Ọ ghaghị ịkpọ otu asị hụ nke ọzọ nꞌanya, ma ọ bụkwanụ ọ ga-eme nanị ihe otu nꞌime ha chọrọ leda onye nke ọzọ anya. Nꞌụzọ dị otu a kwa mmadụ enweghị ike ịhụ Chineke na ego nꞌanya otu mgbe ahụ.”[14] Ndị Farisii hụrụ ego nꞌanya, ndị nụrụ ihe ndị a Jisọs kwuru, weere Jisọs mee ihe ọchị.[15] Ma Jisọs gwara ha sị, “Nꞌihu ndị mmadụ, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị dị nsọ na ndị bụ ndị ezi omume. Ma Chineke maara obi unu. Nꞌihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị mkpa abaghị uru nꞌihu Chineke.

JEMES 2:14-26
[14] Olee utu ọ bara ụmụnna m, na mmadụ kpọrọ onwe ya onye nwere okwukwe nꞌime Chineke, ma ọ bụrụ na ndụ ya na omume ya adakọtaghị nꞌihe ọ na-akpọ onwe ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ̀ pụrụ ime ka Chineke nabata ya?[15] Ọ bụrụ na i nwere enyi nke bịakwutere gị, nke mkpa nri na uwe ọ ga-eyi na-akpa,[16] ma ị sị enyi gị ahụ, “Laa nꞌudo nwanna m, Chineke gọzie gị. Ya nyekwa gị uwe ị ga-eji chụọ oyi, na nri ị ga-eji zụọ afọ gị,” ma ọ dịghị ihe ọ bụla i mere iji nyere ya aka igbo mkpa agụụ na-agụ ya na oyi na-atụ ya, ọ̀ dị ụzọ okwu ọma nile i kwuru siri nyere ya aka?[17] Nꞌụzọ dị otu a, okwukwe gị nꞌime Chineke abaghị uru, ma ọ bụrụ na ndụ gị na omume gị egosighị ihe ndị a nile.[18] Mmadụ pụrụ ịgwa m sị, “I nwere okwukwe ma e nwere m ọrụ ọma.” Ma ihe m ga-asa onye ahụ bụ nke a, “Zi m otu i siri nwee okwukwe nꞌime Chineke mgbe ị na-arụghị ọrụ ọma ọ bụla iji gosi ya, ma mụ onwe m ga-egosikwa gị na m bụ onye nwere okwukwe nꞌime Chineke site nꞌọrụ ọma m naarụ.”[19] Amaara m na i kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dị. Nke a bụ ezi ihe. Chetakwa na ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dịkwa. Ọ bụ nke a na-eme ha ji atụ egwu, na-amakwa jijiji.[20] Onye nzuzu, ruo olee mgbe ka ị ga-amụta na ọ bụ nanị site nꞌọrụ ị rụrụ ka ị pụrụ igosi na i nwere okwukwe nꞌime Chineke.[21] Leenụ Eberaham nna anyị ochie, gịnị mere Chineke jiri gụọ ya nꞌonye ezi omume? Ọ̀ bụghị nꞌihi ihe o mere? Ọ̀ bụghị nꞌihi na o duuru Aizik chọọ iji ya chụọra Chineke aja?[22] Site na nke a ka anyị jiri mata na okwukwe o nwere nꞌime Chineke gosiri onwe ya nꞌọrụ ọma ọ rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ọma ya mere ka okwukwe ya zuo oke.[23] Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na-asị, “Eberaham kweere na Chineke, ma Chineke nꞌonwe ya ebe ọ bụ na Eberaham rubeere ya isi, gụrụ Eberaham nꞌonye ezi omume, kpọọkwa ya ‘Enyi Chineke.’ ”[24] O weela anya ugbu a na ọ bụghị nanị na mmadụ kweere na Chineke ka e ji agụ ya nꞌonye ezi omume, kama ọ bụkwa nꞌihi na ndụ onye ahụ na omume ya, na-egosi na ọ na-erubere Chineke isi.[25] Rehaab, nwanyị akwụla ahụ, bụkwa otu onye anyị ga-eji maa atụ. A zọpụtara ya nꞌihi ihe o mere. O lekọtara ụmụ Izirel bịara iledo obodo Jeriko anya. O gosikwara ha ụzọ ha siri gbapụ![26] Ya mere, dị ka o siri bụrụ ihe rara ahụ na a pụrụ ịhụ mmadụ dị ndụ nke na-enweghị mmụọ, otu a kwa, okwukwe nke na-adịghị egosi onwe ya site nꞌọrụ ọma, bụ ihe nwụrụ anwụ.

Igbo Bible 1988
No Data