A A A A A

Omume Ọjọọ: [Egwu]


JỌN 14:27
“Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

MATIU 6:34
“Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere ihe na-aga ime echi. Ọ bụrụ na Chineke emee ka ị dịrị ndụ taa, ọ ga-azụkwa gị echi.

ROM 8:38-39
[38] Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.[39] Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.

1 PITA 5:6-7
[6] Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu.[7] Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.

2 TIMỌTI 1:7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.

MATIU 10:28
“Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ.

ROM 8:15
Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị.

1 KỌRINT 16:13
Na-echenụ nche mgbe nile, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.

HIBRU 13:5-6
[5] Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”[6] Ya mere anyị pụrụ iji nganga na-atụghị egwu kwuo sị, “Chineke bụ onye inye aka m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”

1 JỌN 4:18
Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie.

1 PITA 3:13-14
[13] O nweghị onye ga-emerụ unu ahụ nꞌihi na unu na-eme ezi ihe.[14] Ma a sịkwarị na ha ataa unu ahụhụ nꞌihi na unu mere ihe dị mma, ngọzi dịrị unu. Unu atụla ha egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.

Igbo Bible 1988
No Data