A A A A A

Omume Ọjọọ: [Esemokwu]


HIBRU 10:32
Ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ka unu chefuo ụbọchị ndị ahụ gara aga. Nꞌoge ahụ ìhè Chineke mụkwasịrị unu, unu guzosikwara ike ọ bụladị nꞌọnọdụ mkpagbu.

MATIU 18:15
“Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.

1 TIMỌTI 3:15
nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke.

JỌN 8:32
Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.”

MATIU 5:23-24
[23] “Ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nꞌụlọ nsọ Chineke, ma i cheta nꞌebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nꞌudo,[24] hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.

JỌN 6:54
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.

MAK 6:3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.

EFESỌS 5:25
Unu bụ ndị nwoke na-alụ nwụnye, hụnụ nwụnye unu nꞌanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nꞌanya nwụọ nꞌihi ya.

HIBRU 12:14
Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.

MATIU 18:15-17
[15] “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.[16] Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.[17] Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.

JEMES 5:16
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya.

GALETIA 1:19
Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs.

FILIPAI 1:30
Ọ bụ anyị nile na-ebukọ agha a nꞌotu. Mụ onwe m ahụọla ahụhụ nꞌihi Kraịst nꞌoge gara aga. Ma ruo ugbu a, unu na-ahụkwa na m nọkwa nꞌime ahụhụ dị ukwuu, dị ka unu maara.

KỌLỌSI 2:1
Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu ga-ghọta otu m si gbasie mgba ike nꞌekpere m nꞌihi unu, na nꞌihi ndị nọ nꞌobodo Laodisia, na ndị nile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.

ROM 12:18
Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.

JỌN 14:6
Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

EFESỌS 4:26
Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị.

JEMES 1:19
Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.

MATIU 5:9
Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.

JỌN 3:3-5
[3] Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”[4] Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”[5] Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.

JEMES 1:19-20
[19] Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.[20] Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe.

GALETIA 4:19
Ezi ụmụ m, lee ka omume unu si ewute mmụọ m. Lee ka m si nọdụkwa nꞌọnọdụ ihe mgbu, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka unu zuo oke nꞌime Kraịst, dị ka nwanyị nọ nꞌihe mgbu si eche ọmụmụ nwa ọhụrụ ya.

MATIU 16:18
Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya.

MATIU 18:15-18
[15] “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.[16] Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.[17] Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.[18] Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe.

EFESỌS 1:22-23
[22] Chineke emeela ka ihe nile dị nꞌokpuru ike Kraịst, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe nile nke nzukọ ya bụ chọọchị.[23] Nꞌihi na chọọchị bụ anụ ahụ Kraịst. Ọ bụkwa ihe na-emezu Kraịst onye ya onwe ya bụ mmezu ihe nile nꞌebe nile.

EFESỌS 5:23-24
[23] Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.[24] Ya mere, dị ka nzukọ Kraịst si edo onwe ya nꞌokpuru Kraịst, otu a ka ụmụ nwanyị nwere di kwesịrị ido onwe ha nꞌokpuru di ha.

ỌLU OZI 4:32
Ndị nile kwere ekwe nwere otu obi. O nweghị onye ọ bụla gụrụ ihe ọ bụla o nwere dị ka nke aka ya. Kama ha mere ka ndị ọzọ keta oke nꞌihe ha nwere.

1 KỌRINT 1:10
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.

JỌN 12:48
Onye ọ bụla jụrụ m, jụkwa ozi m, nwere onye na-ekpe ya ikpe. Okwu nile m kwuru ka a ga-eji kpee ya ikpe.

MATIU 7:12
“Meere ndị ọzọ dị ka i si chọọ ka ha meere gị. Nke a bụ ihe Mosisi na ndị amụma ziri.

JỌN 14:28
Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m.

1 TESALỌNAIKA 2:2
Unu maara ụdị ahụhụ anyị tara na Filipai tupuu anyị abịakwute unu. Unu makwaara ụdị ahụhụ anyị tara na Tesalonaịka mgbe anyị bịaruru. Ma Chineke nyekwara anyị obi ike ikwukwara unu ozi ọma ahụ, ọ bụladị mgbe anyị maara na ndị iro gbara anyị gburugburu.

1 KỌRINT 13:4
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.

ROM 1:20
Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke.

Igbo Bible 1988
No Data