A A A A A

Omume Ọjọọ: [Ime ihe ike]


1 PITA 3:9
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.

1 TIMỌTI 3:3
***

HIBRU 10:10
Ebe ọ bụ na Jisọs mere ihe Chineke chọrọ, anyị abụrụla ndị a sachapụrụ mmehie ha site nꞌịta Jisọs ji onwe ya chụọ nanị otu ugboro.

ROM 13:4
Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.

ROM 14:1
Nabatanụ ụmụnna ndị akọnuche ha na-esogbu ma ha soro ndị ọzọ okwukwe ha siri ike mee ihe ha na-eme. Unu ekwujọla ha, nꞌihi na ụzọ ha si ele ihe anya abụghị ụzọ unu si ele ya.

TAITỌS 3:2
Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama ka ha bụrụ enyi mmadụ nile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nꞌebe mmadụ nile nọ.

MAK 7:21-22
[21] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌime obi mmadụ ka echiche ọjọọ nile si apụta, ya na ịkwa iko nile dị iche iche, na izu ohi, na igbu mmadụ na ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye,[22] na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla.

MATIU 5:38-39
[38] “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’[39] Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.

MATIU 7:1-2
[1] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.[2] Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.

GALETIA 5:19-21
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.

MATIU 26:52-54
[52] Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nꞌọbọ ya, nꞌihi na mmadụ ọ bụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya, ga-anwụ site na mma.[53] I cheghị na m pụrụ ịkpọ Nna m oku ka o zitere m igwe ndị mmụọ ozi, ka ha bịa napụta m?[54] Ọ bụrụkwanụ na m emee otu a, a ga-esi aṅaa mee ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru mezuo? Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ihe ndị a na-eme ugbu a aghaghị imezu otu a.”

ROM 14:10-13
[10] Ya mere, o kwesịghị ka i kwujọọ nwanna gị. O kwesikwaghị ka i leda ya anya. Nꞌihi na anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Chineke nꞌụbọchị ahụ ọ ga-ekpe ụwa ikpe.[11] Nꞌihi na Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ebe m na-adị ndụ, mmadụ nile nꞌotu nꞌotu aghaghị igbu ikpere nꞌala nye m. Mmadụ nile ga-ekwupụtakwa mmehie ha nꞌihu m.”[12] Ee, anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nꞌihu Chineke.[13] Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie.

Igbo Bible 1988
No Data