A A A A A

Omume Ọjọọ: [Ihe-efu]


ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

1 TIMỌTI 4:8
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu.

GALETIA 5:16-26
[16] Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee.[17] Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.[18] Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nꞌokpuru iwu.[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.[22] Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na[23] ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.[24] Ma ndị nile bụ ndị Kraịst akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nꞌelu obe.[25] Ọ bụrụkwa na anyị na-adị ndụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ka anyị soro nduzi na ntụzi Mmụọ Nsọ nꞌakụku nile nke ndụ anyị.[26] Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị.

Igbo Bible 1988
No Data