A A A A A

Omume Ọjọọ: [Imegwara / Venbọ Ọbọ]


1 PITA 3:9
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.

1 TESALỌNAIKA 5:15
Ka onye ọ bụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nꞌọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ịrụ ọrụ ziri ezi nye onye ọ bụla.

2 KỌRINT 13:11
Ugbu a ụmụnna m nꞌime Kraịst, ka m jiri okwu ndị a mechie akwụkwọ ozi a. Na-aṅụrịnụ ọnụ! Na-etokwanụ eto nꞌime Kraịst. Werenụ okwu ndị a m gwara unu rụọ ezi ọrụ. Na-ebikwanụ nꞌudo. Ka Chineke onye hụrụ anyị nꞌanya, na onye na-enye anyị udo dịnyeere unu.

2 TESALỌNAIKA 1:8
Ọ ga-ata ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ ebighị ebi nꞌọkụ ala mmụọ. Ee, ọ ga-ata ndị ahụ ahụhụ, bụ ndị jụrụ ịnabata ụzọ nzọpụta ya nke o mere ka ọ pụta ìhè nꞌime Jisọs Kraịst.

HIBRU 10:30
Dị ka ndị maara Chineke na ọ bụ onye okwu ya na-adị dị ka o si kwuo ya, anyị maara na ọ bụ Chineke kwuru sị, “Mụ onwe m nwe ọbọ, mụ onwe m ga-enyeghachikwa.” Ọ bụkwa Chineke kwuru sị, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”

MAK 11:25
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.

ROM 12:18-19
[18] Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.[19] Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”

ROM 13:4
Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.

MATIU 18:21-22
[21] Mgbe ahụ Pita bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onywenwe anyị, ọ bụ ugbo ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ̀ bụ ugbo asaa?”[22] Jisọs zara sị ya, “Ọ dịghị, ọ bụghị ugbo asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa uzọ asaa.

MATIU 5:38-39
[38] “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’[39] Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.

LUK 6:27-28
[27] “Geenụ ntị nꞌihe m chọrọ ikwu, unu nile nọ nꞌebe a ugbu a. Hụnụ ndị iro unu nꞌanya, meekwaranụ ndị na-akpọ unu asị ihe ọma.[28] Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere.

EFESỌS 4:31-32
[31] Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu.[32] Nꞌọnọdụ ihe ndị a nile, nweenụ obi ọma nꞌebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dị ka Chineke sitere nꞌamara ya gbaghara unu nꞌihi na unu bụ nke Kraịst.

1 PITA 2:21-23
[21] Ọ bụ nꞌihi ime ihe dị otu a ka Chineke ji kpọọ unu, nꞌihi na Kraịst sitere nꞌụzọ dị otu a hụọ ahụhụ nꞌihi unu. Ọ bụkwa ihe ịma atụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.[22] O nweghị mgbe ọ bụla Kraịst mehiere, o nwekwaghị mgbe ọ bụla onye ọ bụla nụrụ okwu ụgha nꞌọnụ ya.[23] O kwutọghị onye ọ bụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọ bụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama nanị ihe o mere bụ iwere ihe nile nyefee nꞌaka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi.

ROM 12:17-21
[17] Bie ndụ ga-egosi ndị mmadụ na ị bụ onye Kraịst. Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị.[18] Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.[19] Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”[20] Kama, ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie. Nye ya mmiri, ma ọ bụrụ na ọ chọọ ịṅụ mmiri. Nꞌịhi na ọ bụrụ na ị na-eme otu a, ọrụ ọma gị ga-eme ka ihere mee ya mgbe o chetara ihe ọjọọ o mere gị.[21] Ekwela ka ihe ọjọọ na-achị gị, kama site nꞌezi ọrụ ị na-arụ merie ihe ọjọọ nile.

MATIU 5:40-45
[40] Ọ bụrụ na mmadụ agbaara gị akwụkwọ nꞌụlọ ikpe ka ọ nara gị uwe ime ahụ gị, nyekwa ya uwe elu ahụ gị.[41] Ọ bụrụ na mmadụ esite nꞌike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii, ma ọ bụrụ na nke a ga-eme ka udo dịrị.[42] Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.[43] “A gwara unu sị, ‘Hụnụ ndị enyi unu nꞌanya, ma kpọọkwanụ ndị iro unu asị.’[44] Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.[45] Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke nna unu bi nꞌeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọra ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.

Igbo Bible 1988
No Data