A A A A A

Omume Ọjọọ: [Nganga]


GALETIA 6:4
Ka onye ọ bụla nꞌetiti unu ghọta ma kpebie nꞌobi ya na ihe ọ na-eme ziri ezi. Mgbe ahụ ọ ga-enwe afọ ojuju nꞌime onwe ya na ọrụ ya bụ ezi ọrụ. Ọ gaghị adịkwa mkpa na ọ ga-eji onwe ya tụnyere onye ọzọ.

JEMES 4:6
Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.”

JEMES 4:10
Wedanụ onwe unu ala nꞌihu Chineke ka o nwee ike ibuli unu elu.

MATIU 2:3
Ajụjụ ha wutere Herọd nke ukwuu. O jukwara ndị nile bi na Jerusalem anya.

ROM 12:3
Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha.

ROM 12:16
Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile.

1 KỌRINT 13:4
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.

GALETIA 6:1-3
[1] Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?[2] Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma sitenụ otu a debezuo iwu Onyenwe anyị.[3] Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌetiti unu echee na ya bụ onye dị mkpa, onye na-apụghị iweda onwe ya ala mee ihe ndị a, onye ahụ na-eme onwe ya onye nzuzu. O nwekwaghị ihe onye ahụ bụ nꞌezie.

Igbo Bible 1988
No Data