A A A A A

Omume Ọjọọ: [Lười biếng]


KỌLỌSI 3:17-23
[17] Mọi điều anh chị em nói hay làm hãy vì Giê-xu, Chúa chúng ta. Việc gì anh chị em làm hãy tạ ơn Thượng Đế, Cha chúng ta trong Chúa Giê-xu.[18] Người làm vợ, hãy vâng phục quyền hành của chồng vì đó là điều phải trước mặt Chúa.[19] Người làm chồng, hãy yêu thương và đối xử dịu dàng với vợ.[20] Con cái, hãy vâng lời cha mẹ trong mọi việc vì điều ấy vừa lòng Chúa.[21] Bậc làm cha, không nên cau có với con cái mình vì nếu anh em quá khó tính, chúng nó sẽ bỏ cuộc.[22] Kẻ làm tôi tớ, hãy vâng phục chủ mình trong mọi việc. Đừng giả bộ vâng phục trước mặt để chủ vừa lòng nhưng phải phục vụ một cách lương thiện vì anh chị em kính sợ Chúa.[23] Làm việc gì cũng phải hết lòng như làm cho Chúa chứ không phải làm cho người.

1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.

LUK 16:10
Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu.

EFESỌS 5:15-17
[15] Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.[16] Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.[17] Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Chineke chọrọ ka unu mee, meekwa ya.

2 TESALỌNAIKA 3:6-10
[6] Ụmụnna anyị, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu na onye ọ bụla kpọrọ onwe ya onye Kraịst na-ebi ndụ umengwụ na nke arụsịghị ọrụ ike dị ka anyị ziri unu hapụ inwekọ ihe ọ bụla.[7] Nꞌihi na unu maara nke ọma nꞌime onwe unu na unu kwesịrị ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọ bụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesịrị ịrụ.[8] O nweghị onye ọ bụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọ bụla.[9] Anyị mere ihe ndị a, ọ bụghị nꞌihi na anyị enweghị ike ịkwagide unu ka unu na-enye anyị nri dị ka o kwesịrị ịdị. Kama nzube anyị bụ ka anyị bụrụ ihe ilere anya nye unu, na ndị unu ga-eji maa ezi atụ banyere mkpa ọ dị ịrụsị ọrụ ịke.[10] Mgbe anyị na unu nọkwa anyị nyere unu iwu sị, “Onye na-arụghị ọrụ agaghị eri nri.”

MATIU 25:24-29
[24] “Onye e nyere otu narị naịra batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nꞌebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nꞌebe ị na-agbasaghị.[25] Atụrụ m egwu gị, nꞌihi na amaara m onye ị bụ. Ya mere eweere m ego gị liere gị nꞌala. Lee ya nꞌebe a!’[26] “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ! Ị maara na m na-ewe ihe ubi nꞌebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nꞌebe m na-agbasaghị.[27] Ị gaara etinye ego m nꞌaka ndị na-eche ego, ndị gaara akwụghachi ya na ụma ya.[28] Napụtanụ ya narị naịra ahụ o ji, ma were ya nye nwoke ahụ ji narị naịra ise![29] Nꞌihi na nwoke ahụ na-ejizi ihe e nyere ya ka a ga-enye ihe ọzọ. Ọ ga-enwebigakwa ihe oke. Ma site nꞌaka nwoke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka a ga-anapụ, ọ bụladị ihe nta ahụ e nyere ya.

Igbo Bible 1988
No Data