MATIU 27:3-4 |
[3] Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, nụrụ na a mara Jisọs ikpe ọnwụ, o chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ahụ ha kwụrụ ya.[4] Ọ gwara ha sị, “Emehiela m, nꞌihi na araara m nwoke na-emeghị ihe ọjọ ọ bụla nye nꞌaka ọnwụ.” Ma ha zara ya sị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ ihe dịrị gị.” |
|
MATIU 6:14-15 |
[14] Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu.[15] *** |
|
MAK 11:25 |
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu. |
|
MATIU 7:12 |
“Meere ndị ọzọ dị ka i si chọọ ka ha meere gị. Nke a bụ ihe Mosisi na ndị amụma ziri. |
|
HIBRU 4:15 |
Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya. |
|
ROM 3:23 |
Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |