A A A A A

Omume Ọjọọ: [Iwe]


EFESỌS 4:26-31
[26] Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị.[27] Enyela ekwensu ohere. Nꞌihi na mgbe iwe na-ewe gị, ị pụrụ inye ekwensu ohere ime gị ka i mehie.[28] Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụpụta ego, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.[29] Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.[30] Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu.[31] Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu.

JEMES 1:19-20
[19] Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.[20] Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe.

KỌLỌSI 3:8
Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta.

JEMES 4:1-2
[1] Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nꞌetiti unu? Ọ̀ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nꞌime onwe unu?[2] Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a.

MATIU 5:22
Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.

Igbo Bible 1988
No Data