A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Dibịa afa / Ime Anwansi]


NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”

NKPUGHE 18:23
Abalị nile ga-abụkwa nanị oge ọchịchịrị nꞌihi na a gaghị ahụ, ọ bụladị otu oriọna nꞌime ya. Ọṅụ nke oriri ọlụlụ di na nwụnye agaghị adịkwa ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌụwa nile ka a maara ndị ahia nile si nꞌobodo a, ọ bụkwa mgbaasị ya ka o ji ghọgbuo mba nile nke ụwa.

NKPUGHE 9:21
Ọ dịkwaghị mgbe ọ bụla ha chigharịrị site nꞌizu ọjọọ nke obi ha, nke igbu mmadụ na ikpere arụsị na ịkwa iko na izu ohi pụta.

NKPUGHE 22:15
Nꞌazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị nile na-agba aja, na ndị nile na-akwa iko, na ndị nile na-egbu mmadụ, na ndị nile na-ekpere arụsị, na ndị nile hụrụ ụgha nꞌanya ma na-emekwa ya.

GALETIA 5:20
Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.

ỌLU OZI 8:9-24
[9] Ma o nwere otu nwoke bi nꞌobodo ahụ a na-akpọ Saimọn. Tupuu Filip abịa, Saimọn na-arụ ọrụ ịtụnanya dị iche iche site nꞌike ọgwụ e kere eke. Nꞌihi ihe ndị a ọ na-eme, ọ na-akpọ onwe ya mmadụ dị mkpa.[10] Onye ọ bụla na Sameria, onye ukwu na onye nta, na-ege ya ntị. Ha na-asị na ọ bụ ike Chineke a na-akpọ Ike dị ukwuu.[11] Ha na-eso ya nꞌihi na ọrụ ya na-eju ha anya.[12] Ma mgbe Filip kwusasịrị ozi ọma, ha kweere na Jisọs, na ọ bụ Onye nzọpụta. Ha kwekwara ihe nile Filip kwuru banyere alaeze Chineke. E mere ọtụtụ nꞌime ha baptizim, nwoke na nwanyị ha.[13] Saimọn kwekwaara otu aka ahụ. E mekwara ya baptizim. O bidoro iso Filip nꞌihi na ọrụ ebube nile Filip rụrụ tụrụ ya nꞌanya nke ukwuu.[14] Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala ozi ọma Chineke, ha zipụrụ Pita na Jọn ka ha gaa hụ ihe na-eme nꞌebe ahụ.[15] Mgbe ha bịaruru, ha bidoro ikpe ekpere ka ndị a kwere ekwe nata Mmụọ Nsọ.[16] Nꞌihi na tutuu ruo ugbu a, ha anatabeghị Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nanị baptizim ka e mere ha baa nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.[17] Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ndị a kwere ekwe aka nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ.[18] Mgbe Saimọn hụrụ na ndị a natara Mmụọ Nsọ nanị site nꞌaka ndị ozi bikwasịrị ha nꞌisi, o chere ha ego nꞌihu, rịọ ha sị,[19] “Werenụ ego a, nyekwanụ m ike a. Ka onye ọ bụla m bikwasịrị aka nꞌisi nata Mmụọ Nsọ.”[20] Ma Pita baara ya mba sị, “Gị na ego gị laakwa nꞌiyi! Ì si aṅaa chee na ị pụrụ iji ego zụta onyinye Chineke?[21] I nweghị oke nꞌọrụ a, nꞌihi na obi gị adịghị ọcha nꞌihu Chineke.[22] Si nꞌajọ omume gị tụgharịa, kpeekwa ekpere. Ma eleghị anya Chineke ga-agbaghara gị echiche ọjọọ gị nile.[23] Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.”[24] Saimọn rịọrọ Pita sị ya, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a nile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”

ỌLU OZI 19:18-19
[18] Ọtụtụ ndị chegharịrị bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha nile, nꞌihu mmadụ nile.[19] Ọtụtụ ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị, bupụtara akwụkwọ nile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nꞌihu mmadụ nile. A kpọkwara ọgwụ nile ọkụ. Akwụkwọ nile a kpọrọ ọkụ nꞌụbọchị ahụ ga-erukwa akwụkwọ a ga-eji puku naịra anọ zụta.

ỌLU OZI 8:9
Ma o nwere otu nwoke bi nꞌobodo ahụ a na-akpọ Saimọn. Tupuu Filip abịa, Saimọn na-arụ ọrụ ịtụnanya dị iche iche site nꞌike ọgwụ e kere eke. Nꞌihi ihe ndị a ọ na-eme, ọ na-akpọ onwe ya mmadụ dị mkpa.

GALETIA 5:19-21
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.

Igbo Bible 1988
No Data