A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Lucifa]


1 PITA 5:8
Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi.

2 KỌRINT 4:4
ndị ahụ na-ekweghị, nꞌihi na chi nke oge a bụ ekwensu, emeela ka anya nke akọnuche ha kpuo ìsì, ka ìhè nke ebube Kraịst ghara ịmụkwasị ha, ka ha ghara ịnụ ihe anyị na-ekwusa banyere ebube Kraịst, onye dị nꞌụdị Chineke nꞌonwe ya.

2 KỌRINT 11:14
Ma omume ha adịghị eju m anya, nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya nwere ike ịgbanwe onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.

2 PITA 1:19
Nꞌezie, anyị ahụla, nwapụtakwa na amụma ahụ ndị amụma buru emezuola. Ọ ga-abara unu uru ilezi anya nꞌihe ahụ nile ndị amụma dere, nꞌihi na ozi ha dị ka ìhè nke na-acha nꞌakụkụ ụlọ gbara ọchịchịrị. Okwu ha na-enyere anyị aka ịghọta ọtụtụ ihe gaara esiri anyị ike ịghọta. Mgbe unu tulere eziokwu ahụ dị nꞌokwu ahụ ndị amụma kwuru, ìhè ga-enwụbata nꞌobi unu, mgbe ahụ kwa Kraịst onye dị ka kpakpando na-acha nꞌisi ụtụtụ ga-eme ka ihè ya chabata nꞌime unu.

EFESỌS 6:11-12
[11] Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu.[12] Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.

JEMES 4:7
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ.

JỌN 8:44
Onye na-eme ihe dị otu a bụ nna unu ekwensu. Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi na unu na-eme ihe nile na-atọ ya ụtọ. Ekwensu bụ ogbu mmadụ site na mbụ. Ọ kpọrọ eziokwu asị nꞌihi na eziokwu ọ bụla adịghị nꞌime ya. Ọ na-anyakwa isi mgbe nile, nꞌime ụgha nile, nꞌihi na ọ hụrụ ịgha ụgha nꞌanya. Ọ bụkwa nna nke ndị nile na-agha ụgha.

JUD 1:6-9
[6] Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.[7] Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.[8] Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha.[9] Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.

MATIU 4:3
Mgbe ahụ ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa sị ya, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke meenụ ka nkume ndị a ghọọrọ gị nri.”

MATIU 12:24
Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ha kwuru, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nꞌihi na ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”

NKPUGHE 3:9
“Achọrọ m ka ị mata na aga m eme ka ndị ahụ na-akwagide ụzọ ekwensu ma na-asị na ha bụ ndị dị nsọ mata na mụ onwe m họpụtara gị nye onwe m. Ha ga-abịa kpọọ isi ala nye m, kwupụta na ha aghọtala na ọ bụ gị ka m hụrụ nꞌanya.

NKPUGHE 20:10
Mgbe ahụ ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nꞌọdọ ọkụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nꞌọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

ROM 16:20
Mgbe na-adịghị anya, Chineke onye na-enye udo ga-azọpịa ekwensu na ndị ọrụ ya nꞌokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. Yenwe anyị Jisọs dịnyere unu.

NKPUGHE 12:7-9
[7] Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.[8] Mgbe a lụchara ọgụ a, e meriri agwọ ochie ahụ nꞌagha, chụpụ ya site nꞌeluigwe.[9] Agwọ ukwu a bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu, nke na-eduhie ndị nile bi nꞌụwa. A chụturu ya nꞌụwa, ya na ndị agha ya nile.

LUK 10:18-20
[18] Mgbe ahụ Jisọs kwuru okwu sị, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nꞌeluigwe daa dị ka mgbe amụma na-egbu na mbara eluigwe.[19] Geenụ ntị. Enyela m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, ha agaghị emerụkwa unu ahụ. Enyekwala m unu ike imegide ike nile nke onye iro.[20] Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nꞌihi na mmụọ ọjọọ rubere isi mee ihe unu nyere ha nꞌiwu, kama ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi na e deela aha unu nꞌeluigwe.”

NKPUGHE 13:1-18
[1] Mgbe ahụ, ahụrụ m otu anụ ọhia buru ibu, ka o si nꞌime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhia a nwere isi asaa na mpi iri. Okpu eze iri dịkwa nꞌelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nꞌisi asaa ahụ nꞌotu nꞌotu bụ aha ikwutọ na ikwuhie Chineke.[2] Anụ ọhia a m hụrụ dị ka agụ, ụkwụ ya dị ka ụkwụ anụ bi na mmiri, o nwekwara ọnụ dị ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike, nyekwa ya ocheeze ya na ike ịchị isi.[3] Ahụkwara m na otu nꞌime isi asaa ahụ o nwere bu ọnya nke pụrụ ime ka ọ nwụọ, ma e mere ka ọnya ahụ laa. Nke a juru ndị nile nọ nꞌụwa anya, mee ka ha na-esogharị anụ ọhia a ka ha leruo ya anya.[4] Ha kpọrọ isi ala nye agwọ ochie ahụ nꞌihi na o nyere anụ ọhia ahụ ike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya? Ònye pụkwara ibu agha megide ya?”[5] Mgbe ahụ agwọ ochie ahụ gbara anụ ọhia ahụ ume ikwu okwu nkwulu megide Onyenwe anyị. O nyekwara anụ ọhia ahụ ike ịchị isi nꞌelu ụwa afọ atọ na ọnwa isii.[6] Nꞌime afọ atọ na ọnwa isii ndị a anụ ọhia ahụ kwuluru aha Chineke na ụlọ nsọ ya na ndị nile bi nꞌeluigwe.[7] Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ibu agha megide ndị Chineke na imeri ha. O nyekwara ya ike ịchị ebo nile na asụsụ nile dị nꞌebe nile ụwa sọtụrụ.[8] Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu.[9] Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe, ya nụrụ.[10] Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu.[11] Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhia ọzọ dị iche nke nwere mpi nta abụọ dị ka mpi Nwa atụrụ ahụ. Kama olu ya yiri olu agwọ ochie ahụ. Ọ bụ anụ ọhia na-eme ka ụjọ tụọ ndị lekwasịrị ya anya. O sikwa nꞌime ala pụta.[12] E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ.[13] Anụ ọhia a si nꞌime ala pụta rụrụ ọtụtụ ọrụ ịtụ nꞌanya dị iche iche. O mere ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nꞌụwa nꞌihu mmadụ nile.[14] Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.[15] E nyere anụ ọhia nke abụọ a ike ikunye ume ndụ nꞌime ihe ahụ a kpụrụ akpụ. E nyekwara ya ike ime ka o kwuo okwu. Mgbe a kpụsịrị ihe ahụ kunye ya ume ndụ, ihe a a kpụrụ akpụ nyere iwu ka e gbuo onye ọ bụla jụrụ ife ya onwe ya ofufe.[16] O nyere iwu ka a kaa onye ọ bụla akara nꞌaka nrị ma ọ bụ nꞌegedege ihu, onye ọ bụla, ma onye ukwu ma onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya.[17] Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụ ahia ma ọ bụ ree ahia ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhia ahụ, ma ọ bụ ihe e ji mara ya, nke bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.[18] Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.

Igbo Bible 1988
No Data