A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Ndị mmụọ ozi na-eche nche]


1 KỌRINT 4:9
Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka Chineke na-eme ka anyị bụ ndị ozi bụrụ ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta nanị mgbe ihe nile na-agwụsị agwụsị. Anyị dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ, ndị a na-akpọpụta nꞌihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.

1 JỌN 4:1
Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile.

ỌLU OZI 8:26
Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ sitere Jerusalem na-aga Gaza, ya bụ, ụzọ ọzara.”

ỌLU OZI 12:15
Ma ọ dịghị onye ọ bụla kwenyere nꞌihe o kwuru. Kama ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dị ka onye anya na-adịghị mma. Mgbe Roda nọgidesịrị ike kwuo na ọ bụ Pita, ha zara sị ya, “Eleghị anya ọ ga-abụ mmụọ ozi Pita ka ị hụrụ, nꞌihi na ndị Juu egbuola ya.”

KỌLỌSI 2:18
Ekwela ka onye ọ bụla gụọ gị dị ka onye furu efu nꞌihi na i kweghị iso ya fee ndị mmụọ ozi, dị ka ha si kwuo. Ha pụrụ ikwu na ha hụrụ ọhụ, gwa unu na unu kwesịrị ịhụ ụdị ihe ha hụrụ. Ndị dị otu a na-afụli onwe ha elu nꞌefu, nꞌihi ụdị echiche mmadụ a ha na-eche.

HIBRU 1:14
E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke.

HIBRU 13:2
Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nꞌihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka ha lekọtara.

JUD 1:6-9
[6] Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.[7] Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.[8] Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha.[9] Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.

LUK 16:22
Otu ụbọchị Lazarọs nwụrụ. Ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nꞌebe Eberaham nọ. Nꞌikpeazụ, onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.

MATIU 18:10
“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.

NKPUGHE 5:11
Nꞌime ọhụ m, anụrụ m olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị gbara ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ nile gburugburu, ka ha na-abụ abụ na-asị,

NKPUGHE 19:10
Mgbe ọ gwasịrị m okwu a, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya ịkpọ isi ala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesịghị ka ị kpọọ isi ala nye m nꞌihi na abụ m nanị onyeozi Chineke dị ka gị onwe gị, na dị ka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere okwukwe ha nwere nꞌime Jisọs. Ọ bụ nanị Chineke ka i kwesịrị ịkpọ isi ala nye. Nꞌihi na isi amụma nile na isi ihe ndị a nile m ziri gị bụ ịgwa gị ihe banyere Jisọs.”

Igbo Bible 1988
No Data