A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Ndị mmụọ ọjọọ]


1 JỌN 4:4
Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa.

1 TIMỌTI 4:1
Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.

2 KỌRINT 2:11
Ihe mere anyị ga-eji gbaghara ya bụ na anyị achọghị inye ekwensu ohere ọ bụla inwe mmeri nꞌebe anyị nọ, nꞌihi na anyị maara ihe ekwensu na-agbalị ime.

2 KỌRINT 4:4
ndị ahụ na-ekweghị, nꞌihi na chi nke oge a bụ ekwensu, emeela ka anya nke akọnuche ha kpuo ìsì, ka ìhè nke ebube Kraịst ghara ịmụkwasị ha, ka ha ghara ịnụ ihe anyị na-ekwusa banyere ebube Kraịst, onye dị nꞌụdị Chineke nꞌonwe ya.

JEMES 2:19
Amaara m na i kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dị. Nke a bụ ezi ihe. Chetakwa na ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dịkwa. Ọ bụ nke a na-eme ha ji atụ egwu, na-amakwa jijiji.

MATIU 8:31
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs arịrịọ sị ya, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nꞌime ezi ndị a.”

MATIU 12:45
Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ na o si otu a dịrị, ọ na-apụ gaa chọtakwa mmụọ ọjọọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha nile na-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị unu ndị bi nꞌọgbọ a jọrọ njọ.”

LUK 8:30
Jisọs jụrụ nwoke ahụ ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ nọ nꞌime nwoke ahụ zara sị ya, “Aha m bụ ìgwe, nꞌihi na anyị dị ọtụtụ.”

NKPUGHE 20:10
Mgbe ahụ ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nꞌọdọ ọkụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nꞌọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

1 KỌRINT 10:20-21
[20] Ihe m na-ekwu bụ na ndị nile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nꞌotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ, ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu mgbe unu so ha rie nri ahụ ha ji chụọra arụsị ha aja.[21] Nꞌihi na mmadụ enweghị ike isoro rie oriri nsọ, sorokwa rie nri ekwensu.

EFESỌS 6:10-12
[10] Tupu m mechie okwu m, achọrọ m ime ka unu cheta na ịdị ike unu kwesịrị ịbụ site nꞌike dị ukwuu nke Onyenwe anyị, onye nọ nꞌime unu.[11] Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu.[12] Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.

ỌLU OZI 19:13-16
[13] Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nꞌime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nꞌaha Jisọs. Ihe ha na-agwa mmụọ ọjọọ bụ nke a, “E ji m aha Jisọs onye Pọl na-ekwusa nye gị iwu ka i site nꞌime ya pụta.”[14] Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa Skiva onye nchụaja ndị Juu.[15] Mgbe ha mere ihe dị otu a nꞌebe otu nwoke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya, mmụọ ọjọọ ahụ sịrị ha, “Amaara m Onye Jisọs bụ. Amakwaara m Pọl, ma onye ka unu bụ?”[16] Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị jidere mmadụ abụọ nꞌime ha tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbaara ọtọ gbapụ nꞌụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ nke ukwuu nꞌakụkụ ahụ ha nile.

2 PITA 2:4-10
[4] Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ.[5] Chineke emereghị ndị ụwa mbụ ebere. O mere ka mmiri zoo, kpuchie ụwa ahụ jupụtara na ndị na-amaghị Chineke, ka ọ bụrụ nanị Noa onye gwara ndị ọgbọ ya okwu banyere omume Chineke ka o chebere ndụ, ya na mmadụ asaa ọzọ.[6] Ọzọ, Chineke mara obodo Sodọm na Gomora ikpe, werekwa ọkụ rechapụ obodo ahụ, ya na ndị nile bi nꞌime ya, ime ka nke a bụrụ ihe ịma atụ nye ndị na-amaghị Chineke ihe ga-abụ ọnọdụ ha mgbe Chineke ga-ekpe ha ikpe.[7] Ma nꞌoge ọ na-emebi Sodọm na Gomora, ọ napụtara Lọt site nꞌaka ọnwụ. Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ ndị obodo ahụ na-ebi wutere nke ukwuu.[8] Ụbọhcị nile, ehihie na abalị, ihe ọjọọ nile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, wutere mkpụrụ obi ya nke ukwuu.[9] Nke a na-egosi na Chineke maara otu o si adọpụta mụ na gị site nꞌọnwụnwa gbara anyị gburugburu. Ọ makwaara otu o si ata ndị ọjọọ ahụhụ, tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ.[10] Nke ka nke, Chineke maara otu o si emeso ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ rere ure nke anụ ahụ mmeso, bụ ndị ahụ jupụtara na nganga na isi ike, ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nꞌebube nke anya na-adịghị ahụ.

NKPUGHE 9:1-7
[1] Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu onye si nꞌeluigwe daa nꞌala. E nyere ya ihe ntụghe ụzọ nke e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ.[2] Mgbe o meghere olulu ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwuu sitere nꞌime ya pụta, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ. Iku ụme adịkwaghị mfe nye mmadụ ọ bụla nꞌihi anwụrụ ọkụ ahụ.[3] Nꞌotu oge ahụ, e mere ka igurube dị ukwuu, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ site nꞌime anwụrụ ọkụ ahụ pụta. Igurube ndi a jupụtara ebe nile nꞌụwa. E nyekwara ha ike ịgba mmadụ ọ bụla dị ka akpị.[4] E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọ bụla, ma ọ bụ osisi na ihe ọ bụla a kụrụ nꞌala, dị ka ihe ubi. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọ bụla na-enweghị akara Chineke nꞌegedege ihu ya.[5] Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị mmadụ kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Ndị ha gbara ga-anọkwa nꞌime ahụ ụfụ na nhụju anya dị ka ndị akpị gbara.[6] Nꞌime ụbọchị ndị ahụ ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nꞌebe ha nọ wezụga onwe ya.[7] Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka inyinya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpu eze e ji ọlaedo kpụọ nꞌisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ.

MAK 1:21-27
[21] Mgbe oge nta gasịrị, Jisọs na ndị so ya bịaruru Kapanọm. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, nke bụ ụbọchị Satọde, bụrụkwa ụbọchị ịga nꞌụlọ ekpere, Jisọs na ndị na-eso ya jere nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ. Nꞌebe ahụ, Jisọs ziri ndị bịara okwu Chineke.[22] O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya otu Jisọs si kwuo okwu Chineke. Nꞌihi na o zighị ha dị ka ndị ozizi ndị Juu si ezi. Kama o ziri ha dị ka onye maara ihe nile.[23] Ma nꞌụlọ ekpere ahụ e nwere otu nwoke nọ nꞌime ya nke mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe nwoke a nụrụ ihe Jisọs na-ezi, o tiri mkpu akwa sị,[24] “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Jisọs onye Nazaret? Ị̀ bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌiyi? Amaara m gị, ị bụ Ọkpara Chineke dị ndụ!”[25] Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ si nꞌime nwoke a pụta!”[26] Nꞌotu oge ahụ mmụọ ọjọọ ahụ mere ka akwụkwụ dọọ nwoke ahụ. Emesịa ọ kwara akwa nꞌoke olu hapụ nwoke ahụ.[27] O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Anyị ga-esi aṅaa kọwaa ihe anya anyị hụrụ taa? Nꞌezie, nke a bụ nnọọ ozizi ọhụrụ! Lee, okwu ọnụ efu ka o ji nye iwu ka mmụọ ọjọọ site nꞌahụ mmadụ pụọ, ha pụkwara!”

MATIU 7:14-20
[14] Ole na ole na-achọta ụzọ na-eduba na ndụ, nꞌihi na ọ dị warara.[15] “Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu.[16] Unu ga-amata ha site nꞌụdị ndụ ha na-ebi. A na amara osisi ọ bụla site na mkpụrụ ya. Ị gaghị ahụ mkpụrụ ose kpọọ ya mkpụrụ aṅara.[17] A na-esite na mkpụrụ nke osisi mịpụtara mata ụdị osisi ọ bụ.[18] Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma.[19] Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ.[20] Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya.

LUK 4:31-41
[31] O sitere nꞌebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyekwara nꞌụlọ ekpere ha bido izi ndị mmadụ ihe.[32] Ihe o ziri ha juru ndị mmadụ anya. Nꞌihi na o ziri ha ihe dị ka onye maara ihe bụ eziokwu, dị ka ọpụtaobie, ọ bụghị dị ka onye na-ekwu site nꞌihe ọ nụrụ nꞌọnụ ndị ọzọ.[33] Otu ụbọchị mgbe ọ nọ na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu, otu nwoke nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya bịara nso ebe ọ nọ bido na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị,[34] “Chei! Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌịyi? Amaara m onye ị bụ. Ị bụ Ọkpara Chineke dị nsọ.”[35] Ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ gị si nꞌime ya pụta!” Mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke a nꞌala nꞌihu ndị nọ nꞌebe ahụ, site nꞌime nwoke ahụ pụta, ma o merụghị ya ahụ.[36] Nke a juru mmadụ nile anya mee ka ha sịrịta onwe ha, “Gịnị dị nꞌokwu ọnụ nwoke a, lee na o ji ike na-enye mmụọ ọjọọ ndị a iwu, ha na-apụkwa!”[37] Akụkọ ọrụ a Jisọs rụrụ gbasara jeruo obodo nile dị ebe ahụ gburugburu.[38] Mgbe Jisọs si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, ọ gara nꞌụlọ Saimọn. Nꞌebe ahụ ọ chọpụtara na nne nwụnye Saimọn nwere ahụ ọkụ.[39] Jisọs gara guzo nꞌakụkụ ihe ndina nwanyị ahụ baara ahụ ọkụ ahụ mba. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ nwanyị ahụ. O biliri kwadooro ha ihe oriri.[40] Nꞌụbọchị ahụ kwa, nꞌoge anyasị, ndị nile nwere enyi nke ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, buteere ha Jisọs ka ọ gwọọ ha. O bikwasịrị ha aka gwọọ ha.[41] Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nꞌime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” Ma Jisọs baara ha mba, kwụsị ha ikwu okwu, nꞌihi na ha maara na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.

EFESỌS 6:1-18
[1] Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nꞌihi na nke a bụ ọrụ unu dị ka ndị nke Kraịst. Ọ bụkwa ihe ziri ezi ka unu mee.[2] “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya.[3] Ụgwọ ọrụ ahụ bụ, “Ka ihe nile gaara unu nke ọma, ka unu biekwa ogologo ndụ.”[4] Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst.[5] Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.[6] Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst.[7] Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya.[8] Nꞌihi na unu maara na ọrụ ọma ọ bụla mmadụ rụrụ ka ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya site nꞌaka Onyenwe anyị, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.[9] Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.[10] Tupu m mechie okwu m, achọrọ m ime ka unu cheta na ịdị ike unu kwesịrị ịbụ site nꞌike dị ukwuu nke Onyenwe anyị, onye nọ nꞌime unu.[11] Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu.[12] Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.[13] Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha nile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.[14] Ime nke a, meenụ ka eziokwu dịịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike. Ezi omume bụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.[15] Meenụ ka njikere unu mgbe nile ikwusa ozi ọma nke udo bụrụ ihe dị ka akpụkpọ e yikwasịrị nꞌụkwụ unu.[16] Mgbe nile unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ akụ nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nꞌebe unu nọ.[17] Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.[18] Kpeenụ ekpere mgbe nile. Rịọnụ Chineke ihe ọ bụla mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ kwaliri unu ikpe ekpere. Rosiekwanụya arịrịọ ike, na-echetara ya mkpa unu, na-ekpekwa ekpere nꞌihi ndị kwere ekwe nọ nꞌebe nile.

Igbo Bible 1988
No Data