A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Beelzebul]


MATIU 12:24
Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ha kwuru, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nꞌihi na ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”

MAK 3:22
Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “O bu ekwensu nꞌisi. Ọ bụkwa ekwensu a na-enye ya ike o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”

MATIU 10:25
Ihe ọ bụla dakwasịrị onye nkuzi na-adakwasị nwanta akwụkwọ ya. Otu a kwa ohu na-eketa oke nꞌihe dakwasịrị nna ya ukwu. Ebe ha kpọrọ m ekwensu, ha ga-enyekwa unu aha ọjọọ karịrị nke a.

MATIU 12:27
Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nꞌike ekwensu, ọ̀ bụ nꞌike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nꞌihi okwu a unu kwuru.

LUK 11:15-19
[15] Ma ụfọdụ mmadụ nꞌime ndị nọ ebe ahụ kwuru sị, “Ọ bụ site nꞌike ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ ka o si achụpụ mmụọ ọjọọ ndị a.”[16] Ndị ọzọ nwakwara ya ọnwụnwa sị ya gosi ha ihe ịrịba ama na mbara eluigwe iji gosi na ọ bụ Onye nzọpụta.[17] Ma Jisọs onye maara ihe ha na-eche nꞌobi ha gwara ha okwu sị, “Obodo ọ bụla ịlụ ọgụ dị nꞌime ya agaghị adịgide ruo mgbe tere anya, ezinụlọ ọ bụla kwa nkewa na ịlụ ọgụ dị nꞌime ya, enweghị ike ịnọkọta.[18] Ya mere, ọ bụrụ na ekwensu na-alụso onwe ya ọgụ site nꞌinye m ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, alaeze ya ọ̀ ga-esi aṅaa guzosie ike?[19] Ọ bụrụ na m sitere nꞌike ekwensu achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ site nꞌike onye ka ụmụ unu ji achụpụ ndị ha na-achụpụ? Ya mere, ọ bụ ndị na-eso ụzọ unu ga-ezi unu na okwu unu erijughị afọ.

LUK 11:18
Ya mere, ọ bụrụ na ekwensu na-alụso onwe ya ọgụ site nꞌinye m ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, alaeze ya ọ̀ ga-esi aṅaa guzosie ike?

MAK 3:20-30
[20] Mgbe nke a gasịrị, Jisọs laghachiri nꞌụlọ ahụ o bi. Ọ dịghị anya ndị mmadụ bidoro na-abịakwutekwa ya. Ndị mmadụ dị nnọọ ukwuu mee ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụ inwe ohere iri ihe.[21] Mgbe ndị ikwu Jisọs nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nꞌụlọ ha. Ha sịrị, “Isi adịghị ya mma.”[22] Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “O bu ekwensu nꞌisi. Ọ bụkwa ekwensu a na-enye ya ike o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”[23] Ma Jisọs kpọrọ ndị kwuru okwu a ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu nꞌilu, nꞌụzọ ha ghọtara, jụọ ha ajụjụ sị, “Ekwensu ọ̀ ga-esi aṅaa chụpụ ekwensu?[24] Alaeze nke ọgba aghara dị nꞌime ya enweghị ike iguzo.[25] Otu a kwa, ezinụlọ nke ịlụ ọgụ dị nꞌime ya enweghị ike iguzo.[26] Ọ bụrụkwa na ịlụ ọgụ adịrị nꞌezinụlọ ekwensu, ekwensu ọ̀ pụrụ ịrụpụta ihe ọ bụla?[27] Mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo o ji biri, ma o nwere ike ime nke a ma o buru ụzọ mee otu ihe. O buru ụzọ kee nwoke ahụ dị ike eriri, o nwere ike banye bukọrọ ngwongwo dị nꞌụlọ ya.[28] “Ana m agwasị unu okwu a ike na-asị na mmehie ọ bụla adịghị nke mmadụ mere megide Chineke nke mgbaghara na-adịghị. Ọ dịkwaghị ụdị nkwulu ọ bụla Chineke na-agaghị agbaghara.[29] Ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara. A gaghị agbaghara ya mmehie nkwulu a nꞌụwa a ma ọ bụ nꞌụwa ọzọ.”[30] Jisọs kwuru nke a nꞌihi na ndị ozizi iwu sịrị na ọrụ ebube nile ọ na-arụ bụ site nꞌike ekwensu bi nime ya.

MATIU 9:34
Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya ike ime ihe ndị a nile.”

NKPUGHE 21:20
nke isii nkume a na-akpọ sadiusu, nke asaa nkume a na-akpọ krisolait, nke asatọ nkume a na-akpọ beril, nke toolu nkume a na-akpọ topaazi, nke iri nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ nkume a na-akpọ ametisiti.

JỌN 1:1
Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke.

LUK 11:19
Ọ bụrụ na m sitere nꞌike ekwensu achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ site nꞌike onye ka ụmụ unu ji achụpụ ndị ha na-achụpụ? Ya mere, ọ bụ ndị na-eso ụzọ unu ga-ezi unu na okwu unu erijughị afọ.

LUK 3:1
Nꞌafọ iri na ise nke Tiberius nọrọ dị ka eze na-achị alaeze ndị Rom, Chineke ziri Jọn nwa Zakaraya ozi a nꞌọzara ebe o bi.

NKPUGHE 16:16
Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ chịkọtara ndị eze ahụ nile nꞌotu ebe a na-akpọ Amagidọn nꞌasụsụ Hiburu.

MATIU 22:37
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’

MAK 3:1-6
[1] Ọzọ kwa, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌime ya ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.[2] Ụfọdọ mmadụ nọ na-ele ya anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma Jisọs ọ ga-agwọ nwoke a nꞌụbọchị izuike. Ha na-echekwa ibo ya ebubo mmebi iwu maka edebeghị ụbọchị izuike nsọ.[3] Ma Jisọs gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Bilie, bịa guzo nꞌetiti ụlọ ekpere a.”[4] Mgbe nwoke ahụ pụtara guzo ebe Jisọs ziri ya, Jisọs tụgharịrị jụọ ndị mmadụ ajụjụ sị, “Olee ihe unu chere bụ ihe dị mma? Ọ̀ bụ inyere mmadụ aka nꞌụbọchị izuike ka ọ bụ imerụ mmadụ ahụ? Ọ̀ bụ ịzọpụta mmadụ ka ọ bụ igbu ya?” O nweghị onye kwuru okwu nꞌetiti ndị ahụ nile.[5] Jisọs lere ha anya nꞌiwe. Enweghị ọmiko ha were ya iwe nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Setipụ aka gị!” Nꞌotu mgbe ahụ nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Mgbe ọ na-eme nke a aka ya dizikwara nke ọma.[6] Ngwangwa, ndị Farisii nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ sitere nꞌebe ahụ pụọ nꞌiwe. Ha gara soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi gbuo Jisọs.

MAK 10:46-52
[46] Mgbe ahụ ha ruru Jeriko. Mgbe ha nọtụsịrị nꞌebe ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, na ọtụtụ igwe mmadụ bidoro isite nꞌobodo ahụ pụọ. Ma o nwere otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs, nke pụtara nwa Timiọs, onye nọ nꞌakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.[47] Mgbe Batimiọs nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs nwa Devidi, meere m ebere!”[48] Ọtụtụ mmadụ baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ gị!” Ma Batimiọs nọgidere na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devidi, meere m ebere!”[49] Jisọs kwụsịrị gwa ndị mmadụ okwu sị, “Kpọọnụ ya!” Ha kpọrọ onye ìsì ahụ sị, “Enyi, taa bụrụ gị ụbọchị ọma. Bilie ọtọ, ọ na-akpọ gị!”[50] Batimiọs tụpụrụ akwa ochie ya nꞌotu akụkụ, wulie elu bịakwute Jisọs.[51] Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Batimiọs zara sị, “Onye ozizi, arịọ m gị, achọrọ m ịhụ ụzọ!”[52] “Laa!” Ka Jisọs gwara ya, “Okwukwe gị agwọọla gị!” Nꞌotu oge ahụ Batimiọs bidoro ịhụ ụzọ, soro Jisọs na-agbada ụzọ ahụ.

MATIU 10:3
Filip, na Batalomi, na Tọmọs, na Matiu onye ọnaụtụ. Jemes nwa Alfiọs, na Tadịọs.

ỌLU OZI 2:9
Anyị na-anụ ka ha na-asụ asụsụ ndị Patia, na nke ndị Mid, na nke ndị Elam, na nke ndị Mesopotamia, na nke ndị Judia, na nke ndị Kapadosia, na nke ndị Pọntus, na nke ndị Esia,

ỌLU OZI 6:5
Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya.

NKPUGHE 1:11
Olu ahụ tiri mkpu gwa m okwu sị, “Mụ onwe m bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile.” Mgbe ahụ olu ahụ gwakwara m okwu sị, “Detuo ihe nile ị hụrụ nꞌakwụkwọ. I dechaa ya, ziga ha nye nzukọ Kraịst asaa ahụ dị nꞌala Tọkị. Ya bụ, nzụkọ dị nꞌEfesọs, na Smarna, na Pegamọs, na Tiatira, na Sadis, na Filadelfia, na Laodesia.”

MAK 3:23
Ma Jisọs kpọrọ ndị kwuru okwu a ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu nꞌilu, nꞌụzọ ha ghọtara, jụọ ha ajụjụ sị, “Ekwensu ọ̀ ga-esi aṅaa chụpụ ekwensu?

Igbo Bible 1988
No Data