A A A A A

Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ: [Ndị mmụọ ozi]


KỌLỌSI 1:16
Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.

LUK 20:35-36
[35] Ma ndị ahụ Chineke gụrụ dị ka ndị tozuru etozu inwe ndụ ebighị ebi agaghị alụ di na nwụnye mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie,[36] nꞌihi na ha agaghị anwụkwa ọzọ, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke nꞌihi na Chineke emeela ka ha si nꞌọnwụ dị ndụ ọzọ.

NKPUGHE 4:8
Nke ọ bụla nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere nku isii. Nku dị nꞌetiti nku ndị a nwere anyị hiri nne. Ehihie nile na abalị nile ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile dị. Bụ onye ahụ dịrị nꞌoge gara aga, onye dị ugbu a, na onye ga-adị ruo mgbe nile ebighị ebi.”

MATIU 22:30
Nꞌihi na mgbe e mere ka ndị mmadụ site nꞌọnwụ bilie, ịlụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌihi na mmadụ nile ndị a ga-adị ka ndị mmụọ ozi nꞌeluigwe.

LUK 15:10
Nꞌụzọ dị otu a kwa, ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi nꞌeluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.”

NKPUGHE 14:6
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nꞌime eluigwe. O bu ozi ọma nke ebighị ebi ahụ nꞌaka, nke ọ na-aga ikwusara mba nile, na ebo nile na asụsụ nile na mmadụ nile nọ nꞌụwa.

JUD 1:6
Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.

1 PITA 3:21-22
[21] Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị.[22] Ugbu a Kraịst nọ nꞌeluigwe. Ọ nọkwa nꞌakụkụ aka nrị Chineke. Ọ bụ ya na-achị ndị mmụọ ozi nile, ndị ọchịchị nile, na ike nile nke eluigwe.

1 PITA 1:12
Ma Chineke mere ka ndị amụma mata na ọrụ ha rụrụ abụghị maka ọdịmma nke aka ha, kama ọ bụ nꞌihi ọdịmma nke ndị ga-ebi nꞌoge dị nꞌihu, bụ unu onwe unu. Ugbu a kwa a na-ekwusara mmadụ nile ozi ọma a. A na-ekwusakwa ya site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ kwuru ha. Ee, a na-ekwusa ozi ọma a nke na-agụ ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe agụụ ịnụ ihe banyere ya.

HIBRU 12:22
Ma unu abịakwutela Kraịst! Ọ dị ka unu guzo na-ele ugwu Zayọn anya. Unu abịala nꞌobodo Chineke dị ndụ. Unu abịala nꞌobodo ahụ a na-akpọ Jerusalem ọhụrụ. Nꞌebe a igwe ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta agụta zukọrọ.

NKPUGHE 5:11-12
[11] Nꞌime ọhụ m, anụrụ m olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị gbara ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ nile gburugburu, ka ha na-abụ abụ na-asị,[12] “Nwa atụrụ ahụ e gburu kwesịrị ịnara ike nile, na akụ nile, na amamihe, na ume, na nsọpụrụ nile, na otuto nile na ngọzi nile!”

MATIU 4:6-11
[6] “Site nꞌebe a tụda onwe gị igosi na ị bụ Ọkpara Chineke. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọta gị. Ha ga-echebe gị, ka ị ghara ịmerụ ahụ.’ ”[7] Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ”[8] Ọzọ, ekwensu kpọọrọ ya gaa nꞌelu ugwu dị elu, gosi ya ụwa nile na ịma mma ya.[9] Ọ sịrị Jisọs, “Aga m enye gị ha nile ma ọ bụrụ na ị daa nꞌala kpọọ isi ala nye m.”[10] Ma Jisọs zara sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ nanị Onyenwe gị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye, nanị ya kwa ka ị ga-efe.’ ”[11] Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere Jisọs inyere ya aka.

MATIU 16:27
Nꞌihi na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi m. Mgbe ahụ ka m ga-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.

MATIU 18:10
“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.

MATIU 24:31-35
[31] Aga m ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke eluigwe na ụwa.[32] “Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya jupụtara nꞌahịhịa ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.[33] Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile ka ha na-eme marakwanụ na anọ m nso, na ọbịbịa m dị nnọọ nso.[34] Ihe ndị a nile aghaghị imezu tupuu ọgbọ a agabiga.[35] “Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m nile ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

LUK 4:10
Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha chebe gị.

JỌN 20:11-12
[11] Ma Meri lọghachiri, nọgide nꞌili ahụ. O guzoro nꞌakụkụ ya na-akwa akwa. Mgbe ọ nọ na-akwa akwa, o hulatara ala nyoo anya nꞌime ili ahụ.[12] Ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha. Otu nọdụrụ ala nꞌebe ụkwụ Jisọs dị mgbe ọ tọgbọ nꞌili ahụ. Nke ọzọ nọdụkwara ebe isi ya dị.

KỌLỌSI 2:18
Ekwela ka onye ọ bụla gụọ gị dị ka onye furu efu nꞌihi na i kweghị iso ya fee ndị mmụọ ozi, dị ka ha si kwuo. Ha pụrụ ikwu na ha hụrụ ọhụ, gwa unu na unu kwesịrị ịhụ ụdị ihe ha hụrụ. Ndị dị otu a na-afụli onwe ha elu nꞌefu, nꞌihi ụdị echiche mmadụ a ha na-eche.

HIBRU 1:14
E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke.

HIBRU 2:6-13
[6] Otu onye nꞌime ndị dere ihe nꞌakwụkwọ nsọ, chere echiche banyere ihe ndị a sị, “Chineke, gịnị mere i ji gụọ mmadụ na-abụghị ihe ọ bụla dị ka ihe? Gịnị mere i ji enwe obi ọcha nꞌebe mmadụ nọ? Gịnị mere gị na nwa nke mmadụ ji enwe mmekọ?[7] Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwa ntịntị oge i mere mmadụ ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi. Ma ugbu a i werela ịma mma kpube ya nꞌisi dị ka okpueze. I werekwala ihe nile mee ha ka ha bụrụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya.”[8] Chineke edoola ihe nile nꞌokpuru ụkwụ Jisọs. Ọ dịghị ihe ọ bụla na-adịghị nꞌokpuru ụkwụ ya. Ma anyị adịghị ahụ ka ihe ndị a mezuru ugbu a. Ma anyị ga-ahụ ha mgbe Jisọs ga-abịa ịbụ eze.[9] Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze.[10] E mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi nꞌanya Chineke, onye kere ihe nile, na Jisọs ga-ahụ ahụhụ. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnwụ ya mee ka ọtụtụ mmadụ bịaruo nso nzọpụta. Ma ahụhụ Jisọs hụrụ mere ya ka ọ bụrụ onyeisi zuru oke nke nwere ike iduba ndị ya na mmeri nke nzọpụta.[11] Jisọs na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị ọcha site na mmehie ha. Nꞌezie, onye na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị nsọ, na ndị a e mere ka ha dị nsọ nwere Chineke dị ka Nna ha. Nke a mere ihere adịghị eme Jisọs ịkpọ ha ụmụnna ya.[12] Jisọs sitere nꞌọnụ onye dere akwụkwọ Abụ Ọma sị, “Aga m agwa ụmụnna m ihe banyere Chineke bụ Nna m. Anyị nile ga-eji otu olu too ya. Aga m ekwuwa aha Chineke nꞌọgbọ ọha.”[13] Nꞌebe ọzọ nꞌakwụkwọ nsọ, o sitere nꞌọnụ onye ọzọ kwuokwa sị “Aga m eji obi m nile kwere na Chineke. Olileanya nke m, na nke ụmụ Chineke nyere m ga-adịgide nꞌime gị Chineke.” Nꞌebe ọzọ kwa nꞌakwụkwọ nsọ o kwukwara sị “Lee mụ na ụmụ nke Chineke nyere m.”

HIBRU 13:2
Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nꞌihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka ha lekọtara.

2 PITA 2:4
Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ.

Igbo Bible 1988
No Data