JUD 1:9 |
Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”. |
|
1 TESALỌNAIKA 4:16 |
Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite. |
|
NKPUGHE 12:7-9 |
[7] Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.[8] Mgbe a lụchara ọgụ a, e meriri agwọ ochie ahụ nꞌagha, chụpụ ya site nꞌeluigwe.[9] Agwọ ukwu a bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu, nke na-eduhie ndị nile bi nꞌụwa. A chụturu ya nꞌụwa, ya na ndị agha ya nile. |
|
LUK 1:26 |
Mgbe ime Elizabet ruru ọnwa isii, Chineke zikwara mmụọ ozi ya Geburel, ka ọ gaa nꞌobodo Nazaret nke dị nꞌime Galili. |
|
HIBRU 1:14 |
E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke. |
|
MATIU 18:10 |
“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile. |
|
NKPUGHE 1:4 |
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu. |
|
MATIU 22:30 |
Nꞌihi na mgbe e mere ka ndị mmadụ site nꞌọnwụ bilie, ịlụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌihi na mmadụ nile ndị a ga-adị ka ndị mmụọ ozi nꞌeluigwe. |
|
LUK 20:36 |
nꞌihi na ha agaghị anwụkwa ọzọ, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke nꞌihi na Chineke emeela ka ha si nꞌọnwụ dị ndụ ọzọ. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |