A A A A A

Mgbakwunye: [Halloween]


1 JỌN 1:5
Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nꞌaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọ bụla adịkwaghị nꞌime ya.

1 PITA 5:8
Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi.

2 KỌRINT 11:14
Ma omume ha adịghị eju m anya, nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya nwere ike ịgbanwe onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.

3 JỌN 1:11
Ezi enyi m m hụrụ nꞌanya, ekwela ka ụdị omume ọjọọ dị otu a bata nꞌime gị. Bụrụ onye na-agbaso ihe ziri ezi na eziokwu mgbe nile. Cheta na ndị nile na-eme ezi ihe na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ma ndị ahụ na-anọgide na-adị ndụ nꞌime mmehie na-ezipụta na ha bụ ndị dị anya site nꞌebe Chineke nọ.

ROM 14:9
Ọ bụ nꞌihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe anyị nꞌọnọdụ ọ bụla anyị nọ, ma ọ bụ na ndụ, ma ọ bụ nꞌọnwụ.

ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

GALETIA 5:19-21
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.

ROM 8:38-39
[38] Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.[39] Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.

TAITỌS 1:15
Onye ọ bụla obi ya dị ọcha na-ahụ nanị ihe dị mma na ihe dị ọcha nꞌihe nile. Ma onye ahụ obi ya na-adịghị ọcha, nke na-adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ka ọ na-ahụ nꞌihe nile. Nꞌihi na obi ruru unyi, nke na-ekweghị ekwe, na-eme ka ihe nile ọ na-ahụ bụrụ nanị ihe rụrụ arụ.

1 TESALỌNAIKA 5:22
Wezụganụ onwe unu nꞌihe ọjọọ nile.

EFESỌS 6:12
Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.

MATIU 12:43-45
[43] “Mba ọjọọ nke a! Unu yiri nwoke mmụọ ọjọọ na-achị! Nꞌihi na mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime nwoke ahụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-aga nꞌọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe ọ ga-ezuru ike mgbe ọ na-achọtaghị ebe izuike,[44] ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alọghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ na-alọghachikwa jekwuru nwoke ahụ. Mgbe o ruru nꞌebe nwoke ahụ nọ, ọ ga-ahụ na e meela ka obi nwoke ahụ dị ọcha, ma ọ tọgbọrọ nꞌefu, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ e tinyere nꞌime ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụọ na mbụ.[45] Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ na o si otu a dịrị, ọ na-apụ gaa chọtakwa mmụọ ọjọọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha nile na-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị unu ndị bi nꞌọgbọ a jọrọ njọ.”

EFESỌS 5:15-16
[15] Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.[16] Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.

Igbo Bible 1988
No Data