A A A A A

Mgbakwunye: [Mmetụta]


EFESỌS 5:18
Unu aṅụbigala mmanya oke nke ga-emerụ unu. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ.

KỌLỌSI 3:1-2
[1] Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.[2] Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.

GALETIA 5:19-23
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.[22] Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na[23] ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.

JEMES 1:20
Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe.

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

ROM 15:13
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.

JỌN 17:17
Biko mee ha ka ha dị ọcha dịkwa nsọ site nꞌịnagide ozizi gị nile nꞌihi na ha bụ eziokwu.

JỌN 4:24
***

GALETIA 5:16-24
[16] Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee.[17] Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.[18] Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nꞌokpuru iwu.[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.[22] Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na[23] ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.[24] Ma ndị nile bụ ndị Kraịst akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nꞌelu obe.

HIBRU 3:13
Kama na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị, ogologo ụbọchị ahụ nile ihe banyere ụbọchị ahụ bụ Taa metụtara unu. Ka a hapụ inwekwa onye ọ bụla a ga-esite nꞌaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.

FILIPAI 4:6-7
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.

ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

EFESỌS 4:26-27
[26] Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị.[27] Enyela ekwensu ohere. Nꞌihi na mgbe iwe na-ewe gị, ị pụrụ inye ekwensu ohere ime gị ka i mehie.

1 PITA 5:10
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.

FILIPAI 1:6
Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.

HIBRU 12:1
Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu.

Igbo Bible 1988
No Data