A A A A A

Mgbakwunye: [Ọjọọ]


1 KỌRINT 13:6
Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya.

1 JỌN 5:19
Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, matakwa na ndị nọ nꞌụwa nọ nꞌokpuru ọchịchị ekwensu.

1 PITA 3:9
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.

1 TESALỌNAIKA 5:22
Wezụganụ onwe unu nꞌihe ọjọọ nile.

2 TIMỌTI 2:22
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ.

JỌN 3:20
Ndị mmehie nile na-agba ọsọ site nꞌìhè ahụ. Ha achọghị ịbịakwute ìhè ahụ nꞌihi na mmehie ha ga-apụta ìhè.

ROM 6:12
Ekwela ka mmehie na-achị anụ ahụ gị ọzọ, enyekwala onwe gị nꞌaka mmehie imezu agụụ ihe ọjọọ na-agụ gị.

ROM 12:21
Ekwela ka ihe ọjọọ na-achị gị, kama site nꞌezi ọrụ ị na-arụ merie ihe ọjọọ nile.

MAK 7:21-22
[21] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌime obi mmadụ ka echiche ọjọọ nile si apụta, ya na ịkwa iko nile dị iche iche, na izu ohi, na igbu mmadụ na ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye,[22] na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla.

MATIU 12:34-35
[34] Ụmụ ajụala, olee otu ndị dị njọ dị ka unu ga-esi kwuo okwu ọma? Nꞌihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nꞌobi pụta.[35] Ezi mmadụ na-ekwupụta ezi ihe dị ya nꞌime obi. Ajọ mmadụ na-esitekwa nꞌajọ okwu ya kpughee ajọ ihe dị ya nꞌobi.

JEMES 1:13-14
[13] Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.[14] Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.

JEMES 3:6-8
[6] Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị.[7] Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri,[8] ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya.

ROM 2:29-32
[29] É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ.[30] Ọ̀ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nꞌihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke ndị e biri ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu nwere?[31] Ọ bara uru nꞌụzọ nile na mmadụ bụ onye Juu. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nꞌaka.[32] Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu ekwesịghị ntụkwasị obi, ma ekwesịghị ntụkwasị obi ha ọ̀ pụrụ ime ka Chineke ghara imezu nkwa o kwere ndị ahụ hụrụ ya nꞌanya?

ROM 2:8-12
[8] Ma ndị nile na-akpa iche, ndị jụkwara iso eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka Chineke ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma ya.[9] Ee, nsogbu na iru uju gaabịakwasị ha nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, bụ ndị nọgidere na mmehie.[10] Ma otuto na nsọpụrụ na udo nke si nꞌebe Chineke nọ, ga-abụ nke onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, ee, onye Juu ọ bụla na ndị mba ọzọ.[11] Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu.[12] Nꞌdị nile mehiere nꞌọnọdụ enweghị iwu ga-ala nꞌiyi na-agbanyeghị ihe iwu kwuru. Ma ndị nile mehiere megide iwu ahụ ha maara ihe banyere ya ka a ma-ama ikpe dị ka iwu si kwuo.

EFESỌS 6:12-16
[12] Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.[13] Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha nile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.[14] Ime nke a, meenụ ka eziokwu dịịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike. Ezi omume bụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.[15] Meenụ ka njikere unu mgbe nile ikwusa ozi ọma nke udo bụrụ ihe dị ka akpụkpọ e yikwasịrị nꞌụkwụ unu.[16] Mgbe nile unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ akụ nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nꞌebe unu nọ.

ROM 7:19-25
[19] Mgbe ọ bụla m chọrọ ime ezi ihe, anaghị m eme ya. Ma mgbe ọ bụla m jisiri ike chọọ ịhapụ ime ihe ọjọọ, ọ bụ ihe ọjọọ m na-achọghị ime ka m na-eme.[20] Eziokwu pụtara ìhè bụ nke a, ọ bụrụ na m na-anọgide na-eme ihe ọjọọ m kpọrọ asị, ọ dịkwaghị otu ọzọ a ga-esi kọwaa omume a, karịakwa na mmehie ahụ dị nꞌime m, eriela m ahụ, mee ka m na-eme nanị ihe ọ chọrọ.[21] Nꞌihi na ahụla m ya na ndụ m, na tupuu m cheta echiche ime ihe dị mma, echiche ọjọọ eburularị ụzọ were oche nꞌime m.[22] Ihe na-agụ obi m agụụ mgbe nile bụ nanị ime ihe Chineke na-achọ.[23] Ma ana m ahụ na ọ dị akụkụ ahụ m nke na-alụso echiche obi m ọgụ, na-emerikwa ya, si otu a mee m ka m bụrụ ohu mmehie. Nꞌime obi m ọ na-agụ m agụụ ịbụ ezi ohu Chineke, ma ihe m chọpụtara bụ na abụ m mmadụ mmehie na-achị. Leenụ ka o si dị: ndụ ọhụrụ dị nꞌime m na-achọ ime ihe ziri ezi, ma ndụ ochie ahụ bi nꞌime m hụrụ mmehie nꞌanya.[24] Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Onye pụrụ ịzọpụta m site nꞌanụ ahụ ochie m nke na-eduba m nꞌọnwụ?[25] Ma ekele dịrị Chineke site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ana m eji mmụọ m nile na-ejere iwu Chineke ozi, ma nꞌanụ ahụ m, abụ m ohu mmehie.

MATIU 13:36-43
[36] Emesịa, Jisọs hapụrụ igwe mmadụ ahụ nꞌezi baa nꞌụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nꞌubi a kụrụ ọka.”[37] Jisọs zara ha sị, “Ọ dị mma. Lee ihe nkọwa ya bụ: nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ mụ onwe m.[38] Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nꞌubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nꞌubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ekwensu.[39] Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.[40] “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ.[41] Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị nile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị nile na-arụ ọrụ ọjọọ.[42] Ha ga-atụba ndị a nꞌime ọkụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.[43] Ma ndị nile bụ ụmụ Chineke ga-enwụ dị ka anyanwụ nꞌime alaeze Nna ha. Ndị nwere ntị ịnụ ihe ha nụrụ.

1 TIMỌTI 6:2-10
[2] Ọ bụrụ na ndị nwe ha bụ ndị Kraịst, nke a ekwesịghị ime ka ha hapụ ịrụzi ọrụ ha, kama ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike nꞌihi na ọ bụ nwanna nꞌime okwukwe ka ha na-enyere aka. Na-ezi ndị mmadụ eziokwu ndị a. Naagbakwa ha ume ka ha mee ihe ndị a.[3] Ụfọdụ mmadụ nwere ike ịjụ ịnabata okwu ndị a, ma ha bụ ezi ozizi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụrụkwa ntọ ala nke ezi ndụ.[4] Onye ọ bụla naekwu ihe ọzọ dị iche bụ onye na-eweli onwe ya elu na onye nzuzu. Ọ bụkwa onye hụrụ ịrụ ụka na ịjụ oke ajụjụ nꞌanya, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkọcha na ajọ echiche.[5] Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị.[6] Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe.[7] Nꞌihi na anyị ejighị ihe ọ bụla mgbe anyị na-abịa nꞌime ụwa a, otu aka ahụ, anyị agaghị ejikwa ọ bụladị otu kobo si nꞌime ya pụọ mgbe anyị nwụrụ.[8] Nꞌihi nke a o kwesịrị ka afọ ju anyị nꞌihe anyị nwere, ma ọ bụrụ na anyị enwee nanị ihe anyị ga-eri na uwe anyị ga-eyi.[9] Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ.[10] Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju.

Igbo Bible 1988
No Data