A A A A A

Mgbakwunye: [Ikpe ọnwụ]


ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

ỌLU OZI 25:11
Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesịrị ọnwụ, akwadoro m ịnwụ. Ma ọ bụrụ na aka m dị ọcha, gị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ enweghị ike ịrara m nye nꞌaka ndị Juu ka ha gbuo m. Ana m akpọku Siza ka o lenye anya nꞌikpe m.”

NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”

ROM 13:1-7
[1] Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya.[2] Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma.[3] Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ.[4] Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.[5] Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee.[6] Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka unu ga-eji tụọ ụtụ taksi unu nꞌoge, ka ndị ọrụ gọọmentị nwee ike nọgide na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ha ịrụ.[7] Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru.

JỌN 8:3-11
[3] Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, ndị isi ndị Juu na ndị Farisii bịakwutere ya. Lee! ha dọkpụ otu nwanyị onye ha jidere mgbe ọ nọ na-akwa iko. Ha mere ka nwanyị ahụ guzo nꞌetiti igwe mmadụ ahụ nile.[4] Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye ozizi, lee, anyị jidere nwanyị a nꞌime ịkwa iko, ọ bụladị mgbe ya na nwoke dina![5] Iwu Mosisi nyere anyị kwuru na onye mere ihe dị otu a kwesịrị ka anyị jiri nkume tụgbuọ ya. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”[6] Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala.[7] Mgbe ha nọgidere na-esogbu ya ka okwu si ya nꞌọnụ pụta, Jisọs lelitere anya ya elu gwa ha sị, “Unu nwere ike tụọ nwanyị a nkume ugbu a. Ma achọrọ m ka onye ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume bụrụ onye nke na-emebeghị mmehie nꞌoge ọ bụla.”[8] Jisọs hurukwara ala ọzọ malitekwa ide ihe ọ na-ede nꞌala.[9] Mgbe ndị ahụ kpụtara nwanyị ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha nile nꞌotu nꞌotu, malite nꞌonye okenye ha, sitere nꞌebe ahụ pụọ. Nꞌikpeazụ, ọ fọdụrụ nanị Jisọs na nwanyị ahụ.[10] Mgbe Jisọs guzoro ọtọ lee anya gburugburu, o nweghị onye ọ bụla ọ hụrụ karịa nanị nwanyị ahụ. Jisọs jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị, “Olee ndị ahụ kpọtara gị nꞌebe a? Ò nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara gị ikpe?”[11] Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “O nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara m ikpe, Onyenwe m.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe. Laa nꞌụlọ gị, kama emehiekwala ọzọ.”

MATIU 5:17
“Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.

MATIU 5:38-39
[38] “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’[39] Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.

ROM 12:19
Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”

ROM 13:9
Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.

MATIU 7:5
Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya.

ROM 5:8
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị.

LUK 23:33
Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ, “Ebe Okpokoro isi,” ebe ahụ ka ha nọ kpọgide ya nꞌobe. Ha kpọgidekwara mmadụ abụọ ahụ na-emebi iwu nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌakụkụ aka nri Jisọs, nke ọzọ nꞌakụkụ aka ekpe ya.

MATIU 7:1
“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.

Igbo Bible 1988
No Data