A A A A A

Mgbakwunye: [Iri anụ mmadụ]


2 KỌRINT 5:8
Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.

LUK 16:19-26
[19] “Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe mara mma, na-erikwa nri dị mma ụbọchị nile.[20] Nꞌọnụ ụzọ e si abanye nꞌụlọ onye ọgaranya a, otu nwoke ahụ ya jupụtara nꞌọnya na-edina nꞌebe ahụ oge nile! Aha nwoke a bụ Lazarọs.[21] Ọ gụsịrị Lazarọs agụụ ike iri ọ bụladị ibiribe nri si na tebulu onye ọgaranya ahụ daa nꞌala, ma o nweghị onye nyere ya. Nꞌezie, ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nꞌahụ[22] Otu ụbọchị Lazarọs nwụrụ. Ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nꞌebe Eberaham nọ. Nꞌikpeazụ, onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.[23] Nꞌọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nꞌoke mgbu, ọ hụrụ Eberaham ka ọ nọ nꞌebe dị anya. Ọ hụkwara Lazarọs ka ọ nọ nꞌakụkụ Eberaham.[24] “Onye ọgaranya ahụ kpọkuru Eberaham sị ya, ‘Nna m Eberaham, meere m ebere nꞌihi na anọ m nꞌoke mgbu nꞌebe a, biko zienụ Lazarọs ka o denye mkpịsị aka ntakịrị ya na mmiri bịa metụ ya nꞌire m ka akpịrị na-akpọ m nkụ dajụọ.’[25] “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Nwa m nwoke, chetakwa oge ị nọ nꞌụwa? Nꞌoge ahụ i nwetara ihe ọma nile. Chetakwa na Lazarọs natara nanị ihe ọjọọ nꞌoge ahụ. Ugbu a Chineke na-akasi Lazarọs obi ma ị nọkwa nꞌoke ihe mgbu.[26] A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nꞌihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike isite nꞌebe a bịa nꞌebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nꞌebe unu nọ bịa nꞌebe a.’

NKPUGHE 20:11-15
[11] Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, nke otu onye nọkwasịrị nꞌelu ya. Mgbe ụwa na mbara eluigwe nile hụrụ onye a nọ nꞌelu ocheeze ahụ ha gbara barịị fuo. Ma ha achọtaghị ebe ha ga-ezo onwe ha.[12] Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị.[13] Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.[14] Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.[15] Onye ọ bụla a na-achọtaghị aha ya nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ.

1 KỌRINT 14:34-35
[34] Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke.[35] Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị.

LUK 1:37
O si otu a mee nꞌihi na ọ dịghi ihe nyịrị Chineke ime.”

JỌN 1:1
Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke.

1 TIMỌTI 2:11-15
[11] Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.[12] Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ.[13] Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv.[14] Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke.[15] Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke.

1 TIMỌTI 5:3-16
[3] O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya.[4] Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.[5] Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke.[6] Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nꞌaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụ rịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.[7] Ihe ndị a bụ ihe i kwesịrị inye ndị chọọchị gị dị ka iwu, ka ụmụ Chineke mụta, ma na-emekwa ihe dị mma.[8] Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.[9] Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile.[10] Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma.[11] Ma o kwesịghị ka a kpọbata ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nꞌòtù ụmụ nwanyị na-eje ozi na chọọchị. Nꞌihi na nwa oge nta gafee ha nwere ike lụọ di ọzọ, chefuo nkwa ha kwere na ha gaanọgidesi ike rụọra Kraịst ọrụ.[12] Ụdị omume a pụrụ iwetara ha ikpe ọmụma, nꞌihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.[13] Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ.[14] Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.[15] Nꞌihi na ekwensu eduhiela ụfọdụ mee ka ha mehie, ma site na chọọchị gbapụ.[16] Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla.

1 KỌRINT 11:2-16
[2] Ọṅụ juru m obi nꞌihi na unu na-echeta m na nꞌihi na unu na-eme ihe m ziri unu.[3] Ma ọ dị otu ihe dị mkpa m chọrọ ichetara unu. Achọrọ m ka unu mata na dị ka Kraịst si bụrụ isi nwoke nile, otu a ka nwoke ọ bụla si bụrụ isi nwụnye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst.[4] Nwoke ọ bụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi ihe na-eme Kraịst onye bụ isi ya ihe ihere.[5] Ma nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi okwu Chineke, ma o kpuchighị isi ya, na-eme di ya ihe ihere, nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌebe nwanyị a na nwanyị kpụchara isi ya nọ.[6] Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya.[7] Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke.[8] E si na nwoke kee nwanyị mbụ, ma e sighị na nwanyị kee nwoke.[9] E keghị nwoke mbụ maka nwanyị, ma e kere nwanyị mbụ maka nwoke.[10] Nꞌihi nke a, nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nꞌokpuru di ya, ime ka ndị mmụọ ozi hụ ụdị omume a, site nꞌihi ya ṅụrịa ọṅụ.[11] Ma dị ka nzube Chineke si dị, mkpa nwanyị na-akpa nwoke, mkpa nwoke na-akpa nwanyị.[12] Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwanyị mbụ si na nwoke pụta, ma ọ bụ ụmụ nwanyị na-amụ ụmụ nwoke nile, nwoke na nwanyị nile sitekwara nꞌebe Chineke onye kere ha nọ na-abịa.[13] Achọrọ m ka unu tulee ihe a nꞌonwe unu, ọ̀ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihu ọha mmadụ?[14] Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka Chineke siri mee ya.[15] Nwanyị nwere agịrị isi dị ogologo na-aṅụrị ọṅụ na-anyakwa isi. Akọnuche anyị na-agwakwa anyị na o kwesịrị ka nwanyị na-ekechi isi ya.[16] Ọ bụrụ na ọ dị onye jụrụ ịnabata ozizi a, ọ bụrụkwa na onye ahụ achọọ ịrụ ụka, nanị ihe m maara bụ na anyị, na chọọchị nile, adịghị ezi ihe ọ bụla karịa na nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ nke na-ekwusa ozi ọma nꞌebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ikechi isi ya.

Igbo Bible 1988
No Data