A A A A A

Mgbakwunye: [Obi Emebiala]


1 KỌRINT 13:7
Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.

1 PITA 5:7
Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.

2 KỌRINT 5:7
Nꞌihi na ọ bụ okwukwe ka anyị ji mata na ihe ndị a bụ eziokwu site nꞌịtụkwasị Onyenwe anyị obi. Ọ bụghị nꞌihi na anyị ahụla ha.

2 KỌRINT 12:9
Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.

HIBRU 13:5
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”

JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

JỌN 12:40
“Chineke emeela ka ha kpuo ìsì. O meela ka obi ha kpọchie. He enweghị ike ịhụ. Ha apụghị ịghọtakwa. Ha agaghị abịakwute Chineke ka ọ gwọọ ha.”

JỌN 14:1
“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.

JỌN 14:27
“Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

JỌN 16:33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”

LUK 24:38
Ma Jisọs zara ha sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Gịnị mere unu ji na-enwe obi abụọ?

MAK 11:23
‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya.

MATIU 5:8
Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya.

MATIU 11:28
Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike.

NKPUGHE 21:4
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”

ROM 8:28
Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.

ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.

1 KỌRINT 6:19-20
[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

FILIPAI 4:6-7
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.[7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.

MATIU 11:28-30
[28] Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike.[29] Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike.[30] Nꞌihi na ụzọ m dị mfe, ibu m ga-ebokwasịkwa unu adịghị arọ.”

Igbo Bible 1988
No Data