KỌLỌSI 3:23 |
Ihe ọ bụla unu na-eme, werenụ obi unu nile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Chineke ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. |
|
EFESỌS 4:28 |
Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụpụta ego, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. |
|
JỌN 6:27 |
Unu atụkwasịla obi unu nꞌihe na-ala nꞌiyi dị ka nri, kama chọọnụ ndụ ebighị nke Nwa nke mmadụ na-enye. Nꞌihi na Chineke Nna zitere ya ime nke a.” |
|
GALETIA 6:4-5 |
[4] Ka onye ọ bụla nꞌetiti unu ghọta ma kpebie nꞌobi ya na ihe ọ na-eme ziri ezi. Mgbe ahụ ọ ga-enwe afọ ojuju nꞌime onwe ya na ọrụ ya bụ ezi ọrụ. Ọ gaghị adịkwa mkpa na ọ ga-eji onwe ya tụnyere onye ọzọ.[5] Anyị nile nꞌotu nꞌotu kwesịrị ibu ibu ịta ụta dịrị anyị. |
|
FILIPAI 4:13 |
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike. |
|
KỌLỌSI 3:24 |
Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Chineke kwadobere inye unu, ndị ya. Nꞌihi na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi. |
|
LUK 1:37 |
O si otu a mee nꞌihi na ọ dịghi ihe nyịrị Chineke ime.” |
|
1 TIMỌTI 5:8 |
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị. |
|
2 TIMỌTI 2:6 |
Na-arụsikwa ọrụ gị ike dị ka onye ọrụ ubi nke na-enweta ego hiri nne, ma ọ bụrụ na ọ kụọ mkpụrụ hiri nne. |
|
TAITỌS 2:7-8 |
[7] Nꞌebe a ka gị onwe gị ga-abụrụ ha ihe ịma atụ na ihe ilere anya nꞌịrụ ọrụ ọma. Mee ka ihe nile ị na-eme gosi na ị hụrụ eziokwu ahụ nꞌanya, na ị bụkwa onye na-adịghị eji ya egwuri egwu.[8] Hụ na mkparịta ụka gị nile bụ site nꞌuche zuru oke, nke guzokwa ọtọ. Nke a ga-eme ka onye ọ bụla bịakwutere gị ka gị na ya rụrịtaa ụka laa nꞌihere, nꞌihi enweghị ihe ọ bụla o jidere aka ọ ga-eji kwujọọ gị. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |